Gaa n'Isiokwu

Ebe Nwanna Sergey Rayman na Valeriya nwunye ya nọ n’ụlọikpe n’abalị itoolu n’ọnwa Ọktoba, afọ 2020

ỌKTOBA 9, 2020
RỌSHỊA

Ụlọikpe Rọshịa Mara Otu Di na Nwunye Na-akatabeghị Ahụ́ Ikpe, Kwuokwa na Ha Ga-aga Mkpọrọ Ma Ha Daa Iwu Ndị E Nyere Ha

Ụlọikpe Rọshịa Mara Otu Di na Nwunye Na-akatabeghị Ahụ́ Ikpe, Kwuokwa na Ha Ga-aga Mkpọrọ Ma Ha Daa Iwu Ndị E Nyere Ha

N’abalị itoolu n’ọnwa Ọktoba, afọ 2020, Ụlọikpe Obodo Sverdlovskiy nke dị na Kostroma mara Nwanna Sergey Rayman na Valeriya nwunye ya ikpe. Ha kwuru na a ga-eji afọ asatọ lee ma Nwanna Sergey ọ̀ ga-edebe iwu ndị e nyere ya, jirikwa afọ asaa lee ma nwunye ya ọ̀ ga-edebe iwu ndị e nyere ya. Ma ha daa iwu ndị ahụ, a ga-atụ ha mkpọrọ. Kemgbe Ụlọikpe Kacha Elu na Rọshịa kpebichara ikpe anyị n’afọ 2017, e nwebeghị ụmụnna anyị nọ na Rọshịa a matụrụla ikpe na a ga-eji afọ ole ha otú a lee ma hà ga-edebe iwu ndị e nyere ha. Ma, Nwanna Sergey na nwunye ya agaghị aga mkpọrọ ka ọ dị ugbu a.