Gaa n'Isiokwu

Aha Ole Ka Chineke Nwere?

Aha Ole Ka Chineke Nwere?

Ihe Baịbụl kwuru

 Chineke nwere naanị otu aha. Otú e si ede ya n’asụsụ Hibru bụ יהוה ma a na-akpọ ya “Jehova” n’asụsụ Igbo. a Chineke si n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Aịzaya kwuo, sị: “Abụ m Jehova. Ọ bụ ya bụ aha m.” (Aịzaya 42:8) Aha ahụ bụ́ Jehova gbara ihe dị ka ugboro puku asaa na Baịbụl ndị e ji aka dee n’oge ochie. Ọ karịrị ugboro ole aha ndị ọzọ a na-etu ya gbara na Baịbụl, karịakwa ugboro ole aha onye ọ bụla ọzọ gbara na Baịbụl. b

Chineke ò nwere aha ndị ọzọ?

 Ọ bụ eziokwu na Baịbụl kwuru na Chineke nwere naanị otu aha, ma e nwere ọtụtụ aha a na-etu ya. Ka anyị leba anya n’ụfọdụ aha ndị e turu Chineke na ihe nke ọ bụla n’ime ha na-akụziri anyị gbasara ya.

Utu aha

Ebe ọ dị na Baịbụl

Ihe ọ pụtara

Allah

(E nweghị ebe o dị na Baịbụl)

E si n’asụsụ Arabik nweta ya. “Allah” abụghị ezigbo aha Chineke, kama ọ bụ utu aha ya nke pụtara “Chineke.” Ndị sụgharịrị Baịbụl n’asụsụ Arabik nakwa n’asụsụ ndị ọzọ ji “Allah” dochie anya “Chineke” n’ebe ndị ọ gbara na Baịbụl ha.

Onye Pụrụ Ime Ihe Niile

Jenesis 17:1

O nwere ike na-enweghị atụ. Okwu Hibru bụ́ ʼEl Shad·daiʹ, ma ọ bụ “Chineke bụ́ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile,” gbara ugboro asaa na Baịbụl.

Alfa na Omega

Mkpughe 1:8; 21:6; 22:13

“Onye mbụ na onye ikpeazụ,” ma ọ bụ “mmalite na ọgwụgwụ,” pụtara na e nweghị Chineke bụ́ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ọzọ bu Jehova ụzọ, e nweghịkwa Chi ọzọ ga-esochi ya. (Aịzaya 43:10) Alfa na Omega bụ mkpụrụ akwụkwọ mbụ na mkpụrụ akwụkwọ ikpeazụ n’asụsụ Grik.

Onye Ochie Ahụ

Daniel 7:​9, 13, 22

O nweghị mmalite; ọ dị adị site n’ebighị ebi ruo n’ebighị ebi, tupu onye ọ bụla ma ọ bụ ihe ọ bụla amalite ịdị.​—Abụ Ọma 90:2.

Onye Kere Ihe Niile

Aịzaya 40:28

Ọ bụ ya mere ka ihe niile malite ịdị.

Nna

Matiu 6:9

Ọ bụ Onye na-enye ndụ.

Chineke

Jenesis 1:1

Onye dị ike a na-efe ofufe. Okwu Hibru bụ́ ʼElo·himʹ na-egosi na Jehova dị ebube, dị ùgwù, o nweghịkwa o yiri.

Chi kasị chi niile

Diuterọnọmi 10:17

Ọ bụ Chi kasị elu ma e were ya tụnyere ‘chi ndị na-abaghị uru’ ụfọdụ ndị na-efe.​—Aịzaya 2:8.

Onye Ozizi Ukwu

Aịzaya 30:20, 21

Ọ na-akụzi ihe ndị bara ezigbo uru. Na-enyekwa ntụziaka.​—Aịzaya 48:17, 18.

Onye Ukwu kere ihe

Abụ Ọma 149:2

Ọ bụ ya mere ka ihe niile dịrị.​—Mkpughe 4:​11.

Chineke bụ́ onye obi ụtọ

1 Timoti 1:​11

Ọ bụ ọṅụ na obi ụtọ ka e ji mara ya.​—Abụ Ọma 104:31.

Onye na-anụ ekpere

Abụ Ọma 65:2

Ọ bụ ya na-anụ ekpere ọ bụla e ji okwukwe kpeere ya.

Abụ M Ihe M Bụ

Ọpụpụ 3:​14, Bible Nsọ nke Union Version

Ọ na-abụ ihe ọ bụla ọ chọrọ ịbụ iji mezuo nzube ya. Otú ọzọ e si sụgharịa okwu ahụ bụ “M Ga-abụ ihe ọ bụla dị m mma” ma ọ bụkwanụ “M Ga-abụ Ihe M Chọrọ Ịbụ.” (The Emphasised Bible, nke J. B. Rotherham sụgharịrị; Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ) Ihe a ga-enyere anyị aka ịghọta ihe aha Jehova e kwuru okwu ya n’amaokwu na-esonụ pụtara.​—Ọpụpụ 3:​15.

Ekworo

Diuterọnọmi 5:9, Bible Nsọ nke Union Version

Ọ naghị achọ ka a na-efe ya na chi ọzọ. Otú ọzọ e si sụgharịa ya bụ ‘Chineke nke anaghị ekwe ka ya na chi ọbụla ọzọ tụọ aka’ na “Chineke nke chọrọ ofufe a na-ekewaghị ekewa.”​—Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik; Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.

Eze mgbe ebighị ebi

Mkpughe 15:3

Ihe niile e kere eke nọ n’okpuru, ha ga-anọkwa n’okpuru ya ruo mgbe ebighị ebi.

Onyenwe anyị

Abụ Ọma 135:5

Onye nwe ma ọ bụ nna ukwu; otú e si dee ya na Hibru bụ ʼA·dhohnʹ na ʼAdho·nimʹ.

Onye nwe ụsụụ niile nke ndị agha

Ndị Rom 9:​29, Bible Nsọ nke Union Version

Ọchịagha nke ìgwè ndi mmụọ ozi. Otú ọzọ e nwere ike isi sụgharịa utu ahụ bụ́ “Onye nwe ụsụụ niile nke ndị agha” bụ “Jehova nke ụsụụ ndị agha.”​—Ndị Rom 9:29, Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.

Onye Kasị Elu

Abụ Ọma 47:2; Daniel 7:​18, 27

E nweghị onye ya na ya ha. Ọ bụ ya kacha ihe niile elu.

Onye Kasị Nsọ

Ilu 9:​10

Ọ dị nsọ, dịkwa ọcha karịa onye ọ bụla.

Onye kpụrụ anyị

Aịzaya 64:8

Ọ ka onye ọ bụla na mba ọ bụla ike, otú ahụ onye na-akpụ ihe na-aka ájá o ji akpụ ihe ike.​—Ndị Rom 9:​20, 21.

Onye Mgbapụta

Aịzaya 41:14; Bible Nsọ nke Union Version

Onye ji àjà Jizọs chụrụ napụta ma ọ bụ zụtaghachi anyị n’aka mmehie na ọnwụ.​—Jọn 3:​16.

Oké nkume

Abụ Ọma 18:2, 46

Ebe dị elu e wusịrị ike na onye nzọpụta.

Onye Nzọpụta

Aịzaya 45:21

Ọ na-anapụta anyị n’ọdachi.

Onye Ọzụzụ Atụrụ

Abụ Ọma 23:1

Ọ na-elekọta ndị na-efe ya.

Ọkaakaa Onyenwe anyị

Jenesis 15:2

Ọ kacha ihe niile ike; Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ ʼAdho·naiʹ.

Aha ebe ụfọdụ n’Akwụkwọ Nsọ Hibru

Aha Chineke dị n’aha ebe ụfọdụ a kpọrọ aha na Baịbụl, ma ọ pụtaghị na aha ebe ndị a bụ aha ọzọ Chineke nwere.

Aha ebe

Ebe ọ dị na Baịbụl

Ihe ọ pụtara

Jehova-jaịre

Jenesis 22:13, 14

“Jehova Ga-egbo Mkpa.”

Jehova-nisaị

Ọpụpụ 17:15

“Jehova Bụ Ebe Mgbaba M,” ma ọ bụ “ọkọlọtọ m.” (Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik) Jehova bụ onye ndị na-efe ya nwere ike ịgbakwuru, ya echebe ha ma nyere ha aka.​—Ọpụpụ 17:13-​16.

Jehova-shelọm

Judges 6:​23, 24

“Jehova Bụ Udo.”

Ihe mere anyị ji kwesị ịma aha Chineke ma na-akpọ ya aha ahụ

  • Ọ ga-abụrịrị na Chineke ejighị aha ya bụ́ Jehova egwu egwu mere o ji mee ka e dee ya ọtụtụ puku ugboro na Baịbụl.​—Malakaị 1:11.

  • Ọkpara Chineke bụ́ Jizọs, kwuru banyere aha Chineke ọtụtụ ugboro, si otú ahụ gosi na aha Chineke dị ezigbo mkpa. Dị ka ihe atụ, o kpeere Jehova ekpere, sị: “Ka e doo aha gị nsọ.”​—Matiu 6:9; Jọn 17:6.

  • Ọ bụ mmadụ ịmata aha Chineke ma na-akpọ ya aha ahụ bụ ụzọ mbụ onye ahụ ga-esi amalite ịbịaru Jehova nso. (Abụ Ọma 9:10; Malakaị 3:16) Onye ahụ bịaruo Chineke nso, ọ ga-eme ka nkwa a Chineke kwere mezuo n’ahụ́ ya. Ọ sịrị: “N’ihi na ọ hụrụ m n’anya nke ukwuu, m ga-emekwara ya ụzọ mgbapụ. M ga-echebe ya n’ihi na ọ matawo aha m.”Abụ Ọma 91:14.

  • Baịbụl kwuru, sị: “E nwere ndị a na-akpọ ‘chi,’ ma ọ̀ bụ n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa, dị nnọọ ka e nwere ọtụtụ “chi” na ọtụtụ ‘ndị nwe mmadụ.’” (1 Ndị Kọrịnt 8:5, 6) Ma, o kwuru hoo haa na e nwere naanị otu ezi Chineke aha ya bụ Jehova.​—Abụ Ọma 83:18.

a Ọ bụ “Yahweh” ka ụfọdụ ndị ọkà mmụta asụsụ Hibru na-akacha ede ma ha dewe aha Chineke.

b Ndebiri aha Chineke bụ “Jaa.” Ọ gbara ihe dị ka ugboro iri ise na Baịbụl, ma a gụnye ebe ndị ọ gbara na “Haleluya,” ma ọ bụ “Aleluya,” bụ́ nke pụtara “Toonụ Jaa.”​—Mkpughe 19:1; Bible Nsọ nke Union Version; Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik.