Baịbụl Ò Kwuru Ka Anyị Na-agba Krismas?
Ihe Baịbụl kwuru
Baịbụl ekwughị ụbọchị a mụrụ Jizọs, o kwughịkwanụ ka anyị na-eme ememme iji cheta ụbọchị a mụrụ ya. Akwụkwọ a na-akpọ Cyclopedia, nke McClintock na Strong dere kwuru banyere Krismas, sị: “Ememme Krismas esighị n’aka Chineke, o nweghịkwa ebe e kwuru n’A[gba] Ọ[hụrụ] ka anyị na-eme ya.”
Ọ bụrụ na ị saa anya ná mmiri gụọ otú Krismas si bido, ị ga-achọpụta na o si n’ememme ndị ọgọ mmụọ. Baịbụl kwuru na anyị ga-akpasu Chineke iwe ma anyị na-efe ya otú ọ na-achọghị.—Ọpụpụ 32:5-7.
Otú ihe ndị a na-eme n’oge Krismas si bido
Ime ememme maka ụbọchị a mụrụ Jizọs: Akwụkwọ a na-akpọ The World Book Encyclopedia kwuru, sị: “Ndị mbụ soro ụzọ Kraịst emeghị ememme icheta ụbọchị a mụrụ Jizọs maka na ha weere ya na ememme icheta ụbọchị a mụrụ mmadụ bụ ememme ndị ọgọ mmụọ.”
Abalị iri abụọ na ise n’ọnwa Disemba: E nweghị ihe gosiri na ọ bụ n’ụbọchị ahụ ka a mụrụ Jizọs. Ọ dị ka ihe mere ndị isi okpukpe ji họrọ ụbọchị ahụ bụ ka ọ daba n’ụbọchị ndị ọgọ mmụọ na-eji eme ememme ha, ya bụ, n’oge oyi ná ngwụcha afọ.
Inyerịta onyinye na ime oriri: Akwụkwọ a na-akpọ The Encyclopedia Americana kwuru, sị: “Ọtụtụ ihe a na-eme n’oge Krismas si n’ememme Satọnelia ndị Rom na-eme n’etiti ọnwa Disemba. Ọ bụ n’ememme a ka e si malite ime oké oriri na nkwari, inye onyinye, na ịmụ kandụl n’oge Krismas.” Akwụkwọ a na-akpọ Encyclopædia Britannica kwukwara na ndị mmadụ “anaghị arụ ọrụ ma ọ bụ zụọ ahịa” n’oge ememme Satọnelia.
Iji ọkụ achọ ụlọ mma n’oge Krismas: Akwụkwọ a na-akpọ The Encyclopedia of Religion kwuru na ndị Yurop na-eji ‘ụdị ọkụ dị iche iche na okooko osisi dị iche iche’ achọ ụlọ ha mma ma ha mewe ememme ha na-eme n’oge oyi. Ha kwekwaara na ihe ndị ahụ na-achụpụrụ ha ndị ajọ mmụọ.
Ahịhịa a na-akpọ mịsụlto na ahịhịa a na-akpọ họlị: Akwụkwọ a na-akpọ The Encyclopedia Americana kwuru na “Ndị Druid kweere na ahịhịa a na-akpọ mịsụlto nwere ikike majik. E nwekwara ndị na-efe ahịhịa a na-akpọ họlị n’ihi na ọ na-eme ka obi sie ha ike na anyanwụ ga-alọghachi ma e nwechaa oge oyi.”
Osisi Krismas: Akwụkwọ a na-akpọ Encyclopædia Britannica kwuru na ‘Ndị Yurop na-ekpere arụsị na-efekarị osisi ofufe, ha akwụsịghịkwa ife ya mgbe ha mechara gawa chọọchị.’ Otu ụzọ ha si eme ya bụ na ha “na-edowekarị osisi Yul n’ọnụ ụzọ ha ma ọ bụ n’ime ụlọ ha ma ha mewe ememme n’oge oyi.”