Meri Ọ̀ Bụ Nne nke Chukwu?
Ihe Baịbụl zara
Mba. Baịbụl anaghị akụzi na Meri bụ nne nke Chukwu, o nweghịkwa ihe o kwuru gosiri na Ndị Kraịst kwesịrị ịna-efe Meri ma ọ bụ na-akwanyere ya ùgwù pụrụ iche. a Chebagodịrị ihe ndị a echiche:
E nweghị mgbe Meri kwuru na ya bụ nne nke Chukwu. Ihe Baịbụl kwuru bụ na Meri bụ nne “Ọkpara Chineke,” ọ bụghị nne Chineke.—Mak 1:1; Luk 1:32.
E nweghị mgbe Jizọs Kraịst kwuru na Meri bụ nne nke Chukwu ma ọ bụkwanụ na e kwesịrị ịna-akwanyere Meri ùgwù pụrụ iche. Kama nke ahụ, mgbe otu nwaanyị kwuru ihe gosiri na obi kwesịrị ịna-atọ Meri ụtọ n’ihi na ọ bụ nne ọkpara Chineke, Jizọs gbaziri ya olu, gwa ya, sị: “Ee e, kama nke ahụ, obi ụtọ na-adịrị ndị na-anụ okwu Chineke ma na-edebe ya!”—Luk 11:27, 28.
E nweghị ebe okwu ahụ bụ́ “Nne nke Chukwu” na “Theotokos” (Onye mụrụ Chukwu) dị na Baịbụl.
Onye a kpọrọ “Eze Nwaanyị nke Eluigwe” na Baịbụl abụghị Meri, kama ọ bụ chi nwaanyị ndị Izrel ndị hapụrụ Jehova fere n’oge ochie. (Jeremaya 44:15-19) O nwere ike ịbụ Ishta (Astati), bụ́ chi nwaanyị ndị Babịlọn, bụ ya bụ “Eze Nwaanyị nke Eluigwe.”
Ndị Kraịst mbụ efeghị Meri ofufe, ha akwanyereghịkwa ya ùgwù pụrụ iche. Otu ọkọ akụkọ ihe mere eme kwuru na ọ ga-abụ na Ndị Kraịst oge mbụ “ekweghị eso n’òtù nzuzo, o nwekwara ike ịbụ na ha weere ya na ịkwanyere Meri ùgwù pụrụ iche nwere ike ime ka o yie ka hà na-efe chi nwaanyị ofufe.”—In Quest of the Jewish Mary.
Baịbụl kwuru na Chineke dị adị kemgbe. (Abụ Ọma 90:1, 2; Aịzaya 40:28) Ebe ọ bụ na o nweghị mmalite, o nweghị otú ọ ga-esi nwee nne. Ihe ọzọkwa bụ na o nweghị otú Meri ga-esi buru Chineke n’afọ ya, ebe ọ bụ na Baịbụl kwuru na eluigwe enweghịdị ike ịba ya—1 Ndị Eze 8:27.
Meri bụ nne Jizọs ọ bụghị “Nne nke Chukwu”
Meri bụ onye Juu, o sikwa n’ezinụlọ Eze Devid. (Luk 3:23-31) O nwetara ihu ọma Chineke n’ihi otú o si nwee okwukwe nakwa n’ihi na ọ na-ejere Chineke ozi. (Luk 1:28) Chineke họọrọ Meri ka ọ bụrụ nne Jizọs. (Luk 1:31, 35) Meri na di ya Josef mụtara ụmụ ọzọ.—Mak 6:3.
Ihe Baịbụl kwuru gosiri na Meri mechara bụrụ onye na-eso ụzọ Jizọs, ma e nweghị ọtụtụ ihe ọzọ e kwuru gbasara ya.
a Ọtụtụ chọọchị na-akụzi na Meri bụ nne nke Chukwu. Ụfọdụ na-akpọ ya “Eze Nwaanyị nke Eluigwe,” ma ọ bụkwanụ Theotokos, nke pụtara “onye mụrụ Chukwu,” n’asụsụ Grik.