Gịnị Ga-enyere M Aka Ịna-enwe Olileanya?
Ihe Baịbụl kwuru
Baịbụl kwuru na Chineke ‘chọrọ ka ihe dịrị anyị ná mma n’ọdịnihu nakwa ka anyị nwee olileanya.’ a (Jeremaya 29:11) N’eziokwu, otu n’ime ihe mere Chineke ji nye anyị Baịbụl bụ ka “nkasi obi anyị na-enweta n’Akwụkwọ Nsọ wee mee ka anyị nwee olileanya.” (Ndị Rom 15:4) Isiokwu a ga-eme ka anyị mata na ihe bara uru Baịbụl na-agwa anyị ga-enyere anyị aka ịna-emeri nsogbu anyị na-enwe kwa ụbọchị. Nkwa ndị dị na ya na-emekwa ka anyị nwee nchekwube na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu.
Ihe ndị e kwuru gbasara ha n’isiokwu a
Olee otú Baịbụl si eme ka anyị nwee olileanya?
Baịbụl gwara anyị ihe ndị anyị ga-eme ka ndụ anyị nwee ike ịka mma. O si otú a eme ka anyị nwee olileanya. Ka anyị kwuo ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ ọ gwara anyị.
Kwe ka Baịbụl na-eduzi gị. Abụ Ọma 119:105 kwuru, sị: “Okwu gị bụ ọkụ m ji ahụ ebe m na-azọnye ụkwụ.” Ọkụ na-enwusi ike nwere ike ime ụzọ ihe abụọ. O nwere ike ime ka anyị hụ ihe dị gburugburu anyị, meekwa ka anyị hụ ihe dị ebe dịtụ anya. Otú ahụkwa ka ọ dị Baịbụl, ihe ndị o kwuru nwere ike inyere anyị aka imeri nsogbu ndị anyị nwere ugbu a, nke ga-emezi ka anyị na-enwe olileanya kwa ụbọchị na ihe ga-aka mma. Ihe ndị Baịbụl kwuru ga-emeli ka anyị nweghachi ume ma mee ‘ka obi anyị ṅụrịa ọṅụ.’ (Abụ Ọma 19:7, 8) Baịbụl na-emekwa ka anyị mara ihe magburu onwe ya Chineke bu n’obi ime n’ọdịnihu gbasara ụmụ mmadụ na ụwa. Ihe a anyị nwere olileanya ya nwere ike ime ka anyị na-enwe ọṅụ mgbe niile, obi eruokwa anyị ala.
Kwe ka ndị ọzọ nyere gị aka. Ihe siere anyị ezigbo ike, o nwere ike ịdị anyị ka ndị ezinụlọ anyị na ndị enyi anyị hapụ anyị ka anyị nọọrọ onwe anyị. Baịbụl gwara anyị na anyị ekwesịghị ime otú ahụ, maka na o nwere ike ime ka anyị mee ihe na-abaghị uru. (Ilu 18:1) Ndị ezinụlọ anyị na ndị enyi anyị nwere ike inyere anyị aka ịna-eche echiche nke ọma. Ha nwekwara ike ịtụrụ anyị aro nwere ike inyere anyị aka ịma ihe anyị ga-eme gbasara nsogbu anyị. (Ilu 11:14) Ọ bụrụgodị na e nweghị ihe ọzọ ha meere anyị, ha ga-akasi anyị obi ma gbaa anyị ume, si otú ahụ mee ka anyị nwee ike ịna-atachi obi ruo mgbe ihe ga-aka mma.—Ilu 12:25.
Kọọrọ Chineke nsogbu gị n’ekpere. Baịbụl kwuru, sị: “Bunye Jehova ibu na-anyịgbu gị. Ọ ga-enyere gị aka. E nweghị mgbe ọ ga-ahapụ onye ezi omume ka ọ daa.” b (Abụ Ọma 55:22) Ọ dabara adaba na a kpọrọ Jehova “onye na-eme ka anyị nwee olileanya.” (Ndị Rom 15:13) I nwere ike ịkọrọ ya ‘ihe niile na-echegbu gị,’ maka na ị ma na ihe banyere gị na-emetụ ya n’obi. (1 Pita 5:7) Baịbụl kwudịrị, sị: “Ọ ga-eme ka [ị] kwụsie ike. Ọ ga-eme ka [i] sie ike, meekwa ka [ị] kwụrụ chịm.”—1 Pita 5:10.
Kwe ka nsogbu ndị bịaara gị mee ka olileanya gị sikwuo ike. Baịbụl kwuru, sị: “obi ga-eru onye na-ege [Chineke] ntị ala. Ụjọ ọdachi agaghịkwa atụ ya.” (Ilu 1:33) Ọtụtụ ihe otu nwaanyị bi n’Ọstrelia aha ya bụ Margaret nwere funahụrụ ya mgbe ajọ ifufe mebiri ụlọ ya. Ma, ihe a emeghị ka ike ụwa gwụ ya, kama, o si na ya mụta otu ihe bara uru, ya bụ, na ihe niile mmadụ nwere nwere ike ịla n’iyi n’otu ntabi anya. Mgbe ihe ahụ mechara, o kpebisikwuru ike iji ihe ndị ka mkpa kpọrọ ihe, ya bụ, ndị ezinụlọ na ndị enyi ya, adịm ná mma ya na Chineke, na ihe ndị na-eme ka e nwee olileanya Baịbụl kwuru.—Abụ Ọma 37:34; Jems 4:8.
Olileanya gịnị ka Baịbụl gwara ụmụ mmadụ ka ha nwee?
Baịbụl kwuru na ihe ga-adịrị ụmụ mmadụ mma n’ụwa a n’ọdịnihu. Oge ihe a ga-eme eruokwala eruo. N’eziokwu, nsogbu ndị na-ezoro ụmụ mmadụ ka mmiri taa na-egosi na oge anyị bi na ya ugbu a n’ụwa bụ “oge ikpeazụ.” (2 Timoti 3:1-5) N’oge na-adịghị anya, Chineke ga-eme ka ihe niile na-eme n’ụwa dịrị ya n’aka, meekwa ka mmegbu na ịta ahụhụ kwụsị. Ọ ga-eji Alaeze Chineke, bụ́ ọchịchị ga na-achị ụwa niile, mee ya. (Daniel 2:44; Mkpughe 11:15) Ọ bụ ọchịchị a ga-esi n’eluigwe na-achị ka Jizọs bu n’obi mgbe ọ kụziiri anyị ka anyị n’ekpere ekpere, sị: “Ka Alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa.”—Matiu 6:9, 10.
Baịbụl kwuru hoo haa ihe Chineke bu n’obi banyere ụmụ mmadụ. Legodị ụfọdụ nsogbu ndị Alaeze Chineke ga-akwụsị:
Ụkọ nri agaghịzi adị. “Ala ga-emepụta nri nke ọma.”—Abụ Ọma 67:6.
Ọrịa agaghịzi adị. “O nweghị onye bi n’ala a ga-asị: ‘Ahụ́ adịghị m.’”—Aịzaya 33:24.
Ọnwụ agaghịzi adị. Chineke “ga-ehichapụkwa anya mmiri niile dị [ụmụ mmadụ] n’anya. Ọnwụ agaghịzi adị. Iru uju ma ọ bụ ibe ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịzi adị. Ihe mbụ niile agafeela.”—Mkpughe 21:3, 4.
a Olileanya bụ obi isi anyị ike na anyị ga-enwetali ihe na-agụ anyị agụụ. O nwekwara ike ịbụ ihe anyị na-atụ anya na ọ ga-eme ma ọ bụ ihe anyị na-atụ anya inweta.
b Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.—Abụ Ọma 83:18.