Gịnị Mere Udo Adịbeghị n’Ụwa?
Ihe Baịbụl kwuru
Mbọ niile ụmụ mmadụ gbarala iji mee ka udo dịrị n’ụwa enwebeghị isi. Ndị nke ha ka ga-agba n’ọdịnihu agaghịkwa enwe isi. Lee ihe kpatara ya:
Jeremaya 10:23 kwuru, sị: “Ọ bụghị mmadụ ka ọ dịịrị ịtụziri onwe ya ụzọ nke ọ ga-eso.” (Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik) Chineke ekeghị ụmụ mmadụ ka ha na-achị onwe ha. N’ihi ya, ha emekataghị mee ka udo dịrị n’ụwa.
Abụ Ọma 146:3, 4 sịrị: “Atụkwasala obi gị na ndị ọchịchị, ma ọ bụkwa na mmadụ nkịtị, onye na-enweghị ike ịzọpụta gị. Mgbe o kubiri ume ka ọ na-alaghachi n’aja, atụmaatụ ya niile ga-ala n’iyi n’ụbọchị ahụ.” (Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik) Ndị ọchịchị agaghị emeli ka agha kwụsị, otú ọ sọkwara ha gbaa ná mbọ.
2 Timoti 3:1–4 kwuru, sị: “N’oge ikpeazụ, a ga-enwe oge dị oké egwu, nke tara akpụ. N’ihi na ndị mmadụ ga-abụ . . . ndị na-eme ihe ike, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya, ndị na-arara mmadụ nye, ndị isi ike, ndị nganga fụliri elu.” Anyị bi n’oge Baịbụl kpọrọ ‘oge ikpeazụ.’ Àgwà ọjọọ ndị mmadụ na-akpa n’oge a agaghị ekwe ka e nwee udo n’ụwa.
Mkpughe 12:12 sịrị: “Ahụhụ ga-adịrị ụwa na oké osimiri, n’ihi na Ekwensu agbadatawo n’ebe unu nọ, ọ na-ewe oké iwe, ebe ọ maara na o nwere oge dị mkpirikpi.” Ekwensu bụ onye iro Chineke. Ihe a Baịbụl kwuru gosiri na a chụdatara ya n’ụwa. Ọ bụ yanwa mere ụmụ mmadụ ji akpa arụ dị iche iche juru n’ụwa anyị a. Ebe ọ bụ yanwa na-achị ụwa ọjọọ a, udo emekataghị dịrị na ya.—Jọn 12:31.
Daniel 2:44 kwuru, sị: “[Alaeze Chineke] ga-egwepịa alaeze ndị a niile, mee ka ha ghara ịdịkwa, ma ya onwe ya ga-adịru mgbe ebighị ebi.” Mmadụ niile chọrọ ka udo dịrị n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi. Ma o nweghị ọchịchị mmadụ ọ bụla ga-emeli ya. Naanị Alaeze Chineke ga-emeli ya.—Abụ Ọma 145:16.