Gaa n'Isiokwu

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ A KỌWARA

Mak 1:15​—“Alaeze Chineke Abịala Nso”

Mak 1:15​—“Alaeze Chineke Abịala Nso”

 “Oge a kara aka eruola, Alaeze Chineke eruokwala nso. Chegharịanụ, kwerekwanụ n’ozi ọma.”​—Mak 1:​15, Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.

 “Oge ezuola, alaeze Chineke abịala nso. Chegharịa ma kwerenụ n’oziọma.”​—Mak 1:​15, Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik.

Ihe Mak 1:15 Pụtara

 Jizọs Kraịst kwuru na Alaeze Chineke a “abịala nso” ma ọ bụ ‘eruola nso’ maka na yanwa, bụ́ Eze ga-achị n’Alaeze ahụ, nọ ebe ahụ mgbe ahụ.

 Ihe Jizọs na-ekwu abụghị na Alaeze ahụ amalitela ịchị. N’eziokwu, Jizọs mere ka ndị na-eso ụzọ ya mata na Alaeze ahụ ka ga-abịa n’ọdịnihu. (Ọrụ Ndịozi 1:​6, 7) Ma, Jizọs bịara kpọmkwem n’oge a kara aka, ya bụ, n’afọ Baịbụl buru amụma na Eze Alaeze ahụ ga-abịa. b N’ihi ya, mgbe Jizọs sịrị: “Oge a kara aka eruola,” ihe ọ na-ekwu bụ na oge ọ ga-amalite izi ndị mmadụ ozi ọma gbasara Alaeze ahụ eruola.​—Luk 4:​16-21, 43.

 Ọ bụrụ na ndị mmadụ chọrọ ka ozi ọma Alaeze ahụ baara ha uru, ha kwesịrị ichegharị. Ihe ọ pụtara bụ na mmehie ndị ha mere n’oge gara aga kwesịrị iwute ha. Ha kwesịkwara ịna-ebi ndụ otú Chineke chọrọ. Ndị chegharịrị ná mmehie ha gosiri na ha nwere okwukwe n’ozi ọma gbasara Alaeze Chineke nke ga-achị n’ọdịnihu.

Mgbe E Kwuru Ihe Dị na Mak 1:15

 Jizọs kwuru ihe dị n’amaokwu a mgbe ọ malitere ozi ọma ya na Galili. E kwuru ihe yiri ya na Matiu 4:17. N’ebe ahụ, a sịrị na “malite n’oge ahụ,” Jizọs kwusawara ozi ọma Alaeze Chineke. Ọ bụ Alaeze Chineke bụ isiokwu ozi ọma Jizọs ziri. N’eziokwu, e kwuru gbasara Alaeze ahụ ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ otu narị ugboro n’akwụkwọ anọ ndị a na-akpọ Ozi Ọma. c Ọ bụkwa Jizọs kwuru ọtụtụ n’ime ha. Na Baịbụl, Jizọs kwuru gbasara Alaeze Chineke karịa ka o kwuru gbasara ihe ndị ọzọ.

Gụọ Mak isi 1 na ihe ndị e dere n’ala ala peeji nakwa ihe ndị e dere n’etiti peeji ya.

a Alaeze Chineke bụ ọchịchị Chineke hiwere n’eluigwe iji mezuo nzube ya maka ụwa. (Daniel 2:44; Matiu 6:10) Ị chọọ ịhụ ebe a kọwakwuru Alaeze a, gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Bụ Alaeze Chineke?

b Jizọs ga-abụ eze iji mezuo otu n’ime amụma ndị e buru gbasara Mezaya. Mezaya ahụ bụ onye pụrụ iche na-anọchite anya Chineke. Ị chọọ ịhụ amụma ndị e buru na Baịbụl gosiri na ọ bụ Jizọs bụ Mezaya ahụ, gụọ isiokwu bụ́ “Amụma Ndị E Buru Gbasara Mesaya Hà Na-egosi n’Eziokwu na Ọ Bụ Jizọs Bụ Mesaya?

c Akwụkwọ anọ ndị a na-akpọ Ozi Ọma bụ akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn dị n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, nke a na-akpọkarị Agba Ọhụrụ. Ọ bụ na ha anọ ka e dere gbasara otú Jizọs si bie ndụ na otú o si jee ozi n’ụwa.