Gaa n'Isiokwu

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | ỊZỤ ỤMỤ

Otú Ị Ga-esi Kụziere Nwa Gị Ka Ọ Na-agba Mbọ

Otú Ị Ga-esi Kụziere Nwa Gị Ka Ọ Na-agba Mbọ

 Nwa gị nwere ike ịsị, “M gaghị emeli ihe a. O siri ike omume. Agaghị m amụtali otú e si eme ya.” Ihe a na-egosi na ọ chọghị ịgba mbọ mee ihe siiri ya ike omume. Ọ na-ewute gị ịhụ ka ime ihe ụfọdụ na-esiri nwa gị ike, ma ị chọkwara ka ọ mụta otú ọ ga-esi na-agba mbọ eme ihe siiri ya ike ime. Ì kwesịrị ịga nyere ya aka ozugbo? Ka ị̀ ga-ahapụ ya ka ọ gharazie ime ihe ahụ? Ka ihe ị ga-eme ọ̀ bụ ịkụziri ya otú ọ ga-esi na-agba mbọ?

Ihe i kwesịrị ịma

 Ịgba mbọ bara ezigbo uru. Ọ bụrụ na nwatakịrị amụta ime ihe dị iche iche maka na nne na nna ya kụziiri ya ịgbasi mbọ ike, o nwere ike ime ka ọ na-eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ, na-enwe obi ụtọ, ahụ́ agbasie ya ike, ya ana emetekwa ezigbo ndị enyi. Ma, ọ bụrụ na nne na nna egbochie nwa ha ịmata otú ihe na-adị ma ihe sie ike ma ọ bụ ma ha mejọọ ihe, obi nwere ike ịna-ajọ nwa ahụ njọ ma o too, ya ana-eche na e nweghị ihe ọ dị mma ya, ndụ agaghịkwa na-atọ ya ụtọ.

 Ụmụaka nwere ike ịmụta ịgba mbọ. Ụmụaka ndị ka dị obere nwedịrị ike ịmụta ịna-agbakwu mbọ eme ihe ndị siri ike, na-amatakwa ihe ha ga-eme ma ha nwee nsogbu. Ndị na-eme nchọnchọ achọpụtala na ụmụaka ndị dị otu afọ na ọnwa atọ nwere ike ịmụta ịgba mbọ na-eme ihe siiri ha ike ime ma ọ bụrụ na ha ahụ ka onye toro eto gbasiri mbọ ike mee ihe siiri ya ike ime, kama ime ihe ahụ n’agbaghị mbọ.

 “M chetara mgbe m na-akụziri ụmụ m otú e si eke eriri akpụkpọ ụkwụ ha. Ọ bụghị ihe a na-amụta otu ụbọchị. Mgbe ọ bụla ha chọrọ ike ya, ha na-anọrọ ọdụ ruo nkeji 10 ma ọ bụ 15 na-agba mbọ ka ha cheta otú e si eme ya. Ike gwụ ha, mụ agazie nyere ha aka. Ha na ya lụgidere ruo ọtụtụ ọnwa, ha na-ebekwa ákwá mgbe ụfọdụ ma o siere ha ike iketa ya, ma ha mechara mụta ya. A sị na m zụụrụ ha akpụkpọ ụkwụ na-enweghị eriri, ihe gaara adịkwuru m mfe. Ma mgbe ụfọdụ, anyị bụ́ ndị nne na nna kwesịrị ịgba mbọ iji kụziere ụmụ anyị otú e si agba mbọ.”​—Colleen.

 Ụmụaka nwere ike kwụsị ịgba mbọ. Ụfọdụ ndị nne na nna nwere ike ime ka ụmụ ha kwụsị ịgba mbọ. O nwere ike ha agaghị ama ụma eme ya. Olee otú ha nwere ike isi mee ya? Ụfọdụ ndị nne na nna na-achọ ka obi dị nwa ha mma, n’ihi ya, ha na-emere ya ihe ọ bụla ga-esiri ya ike ime ma ọ bụ ihe ọ bụla o chere na ọ gaghị emetali. Ma, e nwere nsogbu dị n’isi otú a azụ nwatakịrị. Otu onye na-ede akwụkwọ aha ya bụ Jessica Lahey kwuru, sị: “Mgbe ọ bụla anyị meere ụmụ anyị ihe siiri ha ike ime, ihe anyị na-agwa ha doro anya, ya bụ na ha agaghị emetali ihe ahụ, na e nweghị ihe ha dị mma ya, nakwa na anyị ekwesịghị ịtụkwasị ha obi.” a Gịnị ka ọ ga-akpata? O nwere ike ime ka ha ghara ịna-agba mbọ emeri nsogbu ndị ga-abịara ha maka na ha chere na onye toro eto ga-abịarịrị nyere ha aka.

Kama imere nwa gị ihe siiri ya ike ime, kụziere ya otú ọ ga-esi gbaa mbọ mechaa ihe ahụ

Ihe i nwere ike ime

 Gbaa ha ume ka ha na-arụsi ọrụ ike. Ndị nne na nna nwere ike inye ụmụ ha ọrụ ha ga-arụ nke dabara n’afọ ole ha dị, si otú ahụ kụziere ha ịna-agba mbọ. Dị ka ihe atụ, ụmụaka dị ihe dị ka afọ atọ ruo ise nwere ike nye aka saa ákwà ma ọ bụ nye aka dowe ihe ha ji egwu egwu ebe o kwesịrị ịdị. Obere ụmụaka nwere ike inye aka dozie ihe dị iche iche, bupụta nri ma bupụsịa ihe e ji rie nri, kpofuo ahịhịa, ma hichapụ obere unyi n’ụlọ. Ndị na-eto eto nwere ike ịrụ ọrụ ndị siri ike karịa, dị ka ịsachasị ebe niile, ịhụ na ihe niile dị mma n’anya, na imezi ihe ndị mebiri emebi. Ụmụaka nwere ike ha agaghị achọ ịna-arụ ọrụ ọ bụla. Ma, ha ga-erite nnukwu uru ma ọ bụrụ na ha amata na nne na nna ha na-atụ anya ka ha si na nwata na-enye aka n’ọrụ ndị dị n’ụlọ. Olee uru ọ ga-abara ha? Ha ga-amụta ịna-arụsi ọrụ ike, ọ ga-enyekwara ha aka ma ha too n’ihi na ha agaghị na-agbara ọrụ tara akpụ ha kwesịrị ịrụ ọsọ.

 Ihe Baịbụl kwuru: “Mmadụ na-erite uru ma ọ bụrụ na ọ na-arụsi ọrụ ike.”​—Ilu 14:23.

 “Ọ baghị uru inye ụmụaka ọrụ ha ga-arụ naanị ka ọ bụrụkwa na ha na-arụ ọrụ. E nweghị onye ụdị ihe ahụ na-adị mma, ma ụmụaka. Nye ha ọrụ bara uru ha ga-arụ iji nyere gị aka. Ọ bụrụ na nwa gị ka dị obere, gwa ya ka o hichasịwa oche, tebụl, na ihe ndị ọzọ dị n’ụlọ. Ọ bụrụ na ị na-asa moto, gwa ya ka ọ sawa ebe ala ala ya, bụ́ ebe nwere ike isiri gịnwa ike ịsa. Ọ rụchaa ọrụ i nyere ya, gwa ya ozugbo na ọ gbara mbọ.”​—Chris.

 Na-eduzi nwa gị mgbe ọ na-arụ ọrụ tara akpụ. Mgbe ụfọdụ, ụmụaka na-akwụsị ịrụ ọrụ e nyere ha n’ihi na ha amaghị otú ha ga-esi arụcha ya. N’ihi ya, ị kụziwere nwa gị ọrụ ọ na-arụtụbeghị mbụ, i nwere ike ime ihe ndị a. Nke mbụ, rụọ ọrụ ahụ ka nwa gị na-ele gị anya. Nke abụọ, gị na ya rụkọọ ya ọnụ. Nke atọ, na-ele nwa gị anya ka ọ na-arụ ọrụ ahụ, gwakwa ya ebe ndị ọ ga-emekwu nke ọma n’oge ọzọ. N’ikpeazụ, hapụ ya ka ọ rụchaa ọrụ ahụ naanị ya.

 Ihe Baịbụl kwuru: “M na-egosi unu ihe unu ga na-eme, ka unu wee na-eme otú m meere unu.”​—Jọn 13:15.

 “Esila m n’ihe ndị mere m mata na anyị bụ́ ndị nne na nna kwesịrị ịna-agba mbọ ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ụmụ anyị mụta ịgba mbọ. Anyị ga-ebu ụzọ na-akpa àgwà anyị chọrọ ka ụmụ anyị mụta ịkpa.”​—Doug.

 Nyere nwa gị aka ka ọ ghọta na anyị niile na-agba mbọ, na-emehiekwa ihe. Kọọrọ nwa gị gbasara oge o siiri gị ike imete ihe a chọrọ ka i mee na uru i mechara rite maka na ị kwụsịghị ịgba mbọ ka i mete ihe ahụ. Kọwaara ya na ọ na-esikarị ike mmadụ ime ihe ọ na-emetụbeghị mbụ nakwa na imejọ ihe mgbe ụfọdụ ga-enyere ya aka ịmụta ime ihe ahụ. Mee ka obi sie ya ike na ihe ndị ọ na-emetaghị agaghị eme ka ị kwụsị ịhụ ya n’anya. Ọ bụrụ na ị hapụ nwatakịrị ka ọ na-eme ihe ndị siri ike omume, ọ ga na-amụtakwu ịgba mbọ, ọ dị ka ebe nwatakịrị na-amụ ịga ije, ka ọ na-agakwu ije ka ụkwụ na-esikwu ya ike. N’ihi ya, e nwee ihe siiri nwa gị ike ime, kama ịga ozugbo meere ya ihe ahụ, hapụ ya ruo oge ụfọdụ ka ọ gbaa mbọ lee ma ọ̀ ga-emeta ihe ahụ. Akwụkwọ bụ́ How Children Succeed kwuru na “otú kacha mma nwatakịrị ga-esi mụta ime ihe siri ike bụ ịgba mbọ na-eme ihe ndị o chere na ọ gaghị emeli.”

 Ihe Baịbụl kwuru: “Ọ dị mma ka nwoke buru yok ya n’oge ọ bụ okorobịa.”​—Abụ Ákwá 3:27.

 “Ọ bụrụ na ị hapụ ụmụ gị oge ụfọdụ ka ha gbaa mbọ mee ihe ndị siri ike omume, ọ ga-abara ha uru maka na ha ma na papa ha na mama ha ga-enyere ha aka ma ọ karịa ha. Ka oge na-aga, ime ihe ahụ ga-adịziri ha mfe, ha abụrụ aka ochie na ya, obi ana-esikwa ha ike ime ihe ọ bụla ha kwesịrị ime. Ihe ndị a bụ uru ịgba mbọ bara.”​—Jordan.

 Na-aja nwa gị mma maka mbọ ọ na-agba, ọ bụghị maka otú o si mara ihe. Dị ka ihe atụ, kama ịsị nwa gị, “I mere nke ọma n’ule ahụ. Ụbụrụ na-aghọ gị nkọ,” i nwere ike ịsị ya, “I mere nke ọma n’ule ahụ. Obi dị m ụtọ maka otú i si gụsie akwụkwọ ike.” Gịnị mere i kwesịrị iji na-aja nwa gị mma maka mbọ ọ gbara kama ịja ya mma maka na ọ ma ihe? Dr. Carol Dweck kwuru na ọ bụ maka na ịja ụmụaka mma maka na ha ma ihe “na-eme ka ha daa mbà mgbe ọ bụla ihe siiri ha ike ime ma ọ bụ mgbe ọ bụla ihe na-agaghị otú ha chere.” O kwukwara, sị: “Ndị nne na nna chọọ imere nwa ha ihe ọma, ihe kacha mma ha nwere ike imere ya bụ ịkụziri ya ka ọ ghọta na ihe ụfọdụ nwere ike isiri ya ike ime, ka ọ mụta ihe n’ihe ndị o mehiere, ka ịrụsi ọrụ ike na-atọ ya ụtọ, ka ọ gbaa mbọ na-achọpụta ụzọ ọhụrụ ndị e si eme ihe dị iche iche, nakwa ka ọ gbalịa na-amụtakwu ihe. Ha kụziere nwa ha ihe ndị a, obi agaghị na-ajọ nwa ha njọ ma ọ bụrụ na e toghị ya.” b

 Ihe Baịbụl kwuru: “A na-eji otuto a na-eto mmadụ amata ụdị onye ọ bụ.”​—Ilu 27:21.

a Ihe a si n’akwụkwọ bụ́ The Gift of Failure.

b Ihe a si n’akwụkwọ bụ́ Mindset.