IHE NDỊ E MERE N’AFỌ GARA AGA
Ikpe Gbasara Ndịàmà Jehova
Idebanye Aha Anyị n’Akwụkwọ
Ọ bụghị iwu na ndị ọchịchị ga-edebanye aha Ndịàmà Jehova n’akwụkwọ tupu ha amalite ikwusa ozi ọma. Ma idebanye aha anyị n’akwụkwọ ga-eme ka anyị nwee ụlọ ebe anyị ga na-anọ amụ ihe ma ọ bụkwanụ mee ka anyị chọta ebe anyị ga na-anọ amụ ihe ma na-akwụ ụgwọ ya. Ọ ga-emekwa ka anyị nwee ike ịna-ebubata akwụkwọ anyị.
-
N’afọ 2004, ụlọikpe ndị e nwere na Rọshịa wepụrụ aha ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova ji arụ ọrụ na Mọsko n’akwụkwọ. Nke a mere ka ndị mmadụ nyewe ụmụnna anyị nsogbu. Ndị uwe ojii nwụchiri ụfọdụ n’ime ha. Ndị mmadụ tikwara ụfọdụ n’ime ha ihe mgbe ha na-ezi ozi ọma. Ndị nwe ụlọ ebe ha na-anọ amụ ihe chụpụrụ ha, mezie ka ha ghara inwe ebe ha na-anọ amụ ihe. Ikpe Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ na
Yurop kpere n’afọ 2010 kwuru na aha ụlọ ọrụ anyị dị́ na Mọsko mba Rọshịa wepụrụ n’akwụkwọ ezighị ezi, n’ihi ya, ha nyere mba Rọshịa iwu ka ha debanyeghachi aha ụlọ ọrụ anyị n’akwụkwọ. Obi dị anyị ụtọ ịgwa unu na Ministri Na-ahụ Maka Ikpe Ziri Ezi na Rọshịa edebanyela aha ụlọ ọrụ ọhụrụ Ndịàmà Jehova ji arụ ọrụ na Mọsko n’akwụkwọ n’abalị iri abụọ na asaa n’ọnwa Mee, afọ 2015.
Ụtụ Isi
N’ọtụtụ mba, gọọmenti anaghị ana ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova ji arụ ọrụ ụtụ isi otú ahụ ha na-anaghị ana ọtụtụ okpukpe na ụlọ ọrụ ebere. Ma gọọmenti mba ụfọdụ na-ekwu ka anyị tụọ ụtụ isi.
-
Na Swidin, ndị ọchịchị kwuru na Ndịàmà Jehova na-achụ nta ego n’alaka ụlọ ọrụ ha nakwa na ndị na-eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ bụ ndị ha were n’ọrụ, na ha esoghị ná ndị ozi oge niile pụrụ iche. Ndị ọchịchị kwuru ego ole alaka ụlọ ọrụ anyị na ndị na-eje ozi na ya ga na-akwụ n’ụtụ isi. Iji mee ka okwu a bie, Ndịàmà Jehova nọ́ na Swidin gbara gọọmenti akwụkwọ n’ụlọikpe dị iche iche e nwere n’obodo ha, gbaakwa ha akwụkwọ ụzọ isii n’Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop.
Ịjụ Ịba Amị n’Ihi Akọnuche
Ndịàmà Jehova na-erube isi n’iwu Baịbụl bụ́ ka ha ‘kpụgharịa mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè’ nakwa ka ha ghara ‘ịmụ otú e si alụ agha.’ Ha ejighị iwu a egwu egwu. (Aịza. 2:4) Ha anaghị aba amị n’agbanyeghị na gọọmenti ụfọdụ enweghị ọrụ nkịtị ha na-enye ndị jụrụ ịba amị.
-
Ka ọ dị ugbu a na Saụt Koria, gọọmenti enyeghị ụmụ amaala ya ikike ịjụ ịba amị n’ihi akọnuche ha. Nke a mere na kemgbe ihe karịrị afọ iri isii, a tụọla ihe karịrị Ndịàmà Jehova dị́ puku iri na asatọ mkpọrọ n’ihi na ha ekweghị aba amị. Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na Onyeàmà Jehova ọ bụla nọ́ na Saụt Koria enweela enyi ya ma ọ bụ onye ezinụlọ ya a tụrụla mkpọrọ. N’afọ 2004 nakwa n’afọ 2011, Ụlọikpe Na-eleba
Anya n’Ihe Gbasara Iwu Obodo na Saụt Koria kwuru na iwu kwadoro mkpọrọ ahụ a na-atụ ndị jụrụ ịba amị. N’ọnwa Julaị afọ 2015, ha gwara ọhaneze ka ha kwuo obi ha gbasara ya ka ha nwee ike lebagharịa ya anya. Ndịàmà Jehova n’ụwa niile na-ekpe ekpere ka gọọmenti Saụt Koria mee iwu ga-eme ka a kwụsị mkpọrọ a a na-atụ ụmụnna anyị kemgbe n’ihi ihe ha kweere. -
Afọ a mere ya afọ nke iri abụọ na abụọ a tụrụ ụmụnna anyị atọ mkpọrọ n’Eritria n’ihi na ha jụrụ ịba amị n’ihi akọnuche ha. Aha ha bụ Paulos Eyassu, Negede Teklemariam, na Isaac Mogos. O nwetụbeghị mgbe a kpọpụrụ ha n’ụlọikpe ka ha zara ọnụ ha. Ụmụnna atọ a na ihe karịrị ụmụnna iri ise ndị ọzọ ka kwụ ebe ha kwụ n’agbanyeghị ọnụ a na-emekpọ ha nakwa ọnọdụ ọjọọ ha nọ na ya n’ụlọ mkpọrọ. Obi siri anyị ike na Jehova ‘na-anụ ude’ ụmụnna anyị ndị a a tụrụ mkpọrọ n’ihi okwukwe ha na-asụ, ọ ga-enyekwara ha aka.—Ọma 79:11.
-
Na Yukren, a kpọrọ Nwanna Vitaliy Shalaiko n’ọnwa Ọgọst afọ 2014 ka ọ bịa baa amị. Ebe ọ bụ na akọnuche ya ekweghị ya, ọ jụrụ. Ma, o kwuru ka e nye ya ọrụ ọzọ. Ọkàiwu na-agba ndị mmadụ akwụkwọ n’ụlọikpe gbara Nwanna Shalaiko akwụkwọ na ọ jụrụ ịba amị. Ma ụlọikpe nkịtị ma ụlọikpe mkpegharị
ikpe kwuru na ikpe amaghị Nwanna Shalaiko. Ụlọikpe mkpegharị ikpe kwuru na a gaghị eji maka na a chọrọ ichebe obodo napụ mmadụ ikike iwu nyere ya ma ọ bụ kworo maka ya napụ mmadụ ikike o nwere ịjụ ịba amị n’ihi akọnuche ya. Ọkàiwu ahụ gbakwara akwụkwọ ọzọ ka e kpegharịa ikpe a. N’abalị iri abụọ na atọ n’ọnwa Jun afọ 2015, ụlọikpe na-ahụ maka ikpe ndị gbasara mpụ na ndị na-agbasaghị mpụ na Yukren kwadoro ihe ụlọikpe ndị mbụ kpere ikpe ahụ kpebiri. Nke a gosiri na mmadụ nwere ikike ịjụ ịba amị n’ihi akọnuche ya ma rụọ ọrụ nkịtị ma mgbe e nwere ọgba aghara n’obodo ma mgbe a na-enweghị.
Nwanna Shalaiko kwuru uru ihe ahụ ụlọikpe ahụ kpebiri bara. Ọ sịrị: “Ihe e kwuru na Jeremaya 1:19 gbara m ume. M jikeere maka ihe ọ bụla nwere ike ịdapụta. Ihe kacha m mkpa bụ irubere Jehova isi. Obi siri m ike na ọ gaghị ahapụ m nakwa na ọ ga-enye m ikike m ga-eji na-erubere ya isi. Ma, atụghị m anya na ụlọikpe atọ ndị a ga-ekpelachara m ikpe. Ụmụnna m kwụ m n’azụ n’oge niile m na-azara ọnụ m n’ụlọikpe ndị ahụ. Ha ahapụghị m.”
Ikele Ọkọlọtọ na Ikwe Ukwe E Ji Eto Mba
Ihe ọzọ e ji na-enye Ndịàmà Jehova nsogbu bụ ikele ọkọlọtọ na ikwe ukwe ndị e ji eto mba. E nwere ike ịmanye ụmụ anyị karịchaa ka ha nupụrụ Jehova isi. Ndị isi ụlọ akwụkwọ nwekwara ike ịmanye ha ka ha kwee ukwe e ji eto mba ma ọ bụ kelee ọkọlọtọ.
-
N’obodo Karongi, dị́ na Rụwanda, ndị isi ụlọ akwụkwọ boro ọtụtụ ụmụ Ndịàmà Jehova ebubo na ha anaghị asọpụrụ mba ha n’ihi na ha anaghị ekwe ukwe e ji eto mba. A chụrụ ha n’ụlọ akwụkwọ ma tụọ ha mkpọrọ. N’abalị iri abụọ na asatọ n’ọnwa Nọvemba, afọ 2014, otu ụlọikpe dị na Karongi tọhapụrụ ụmụ Ndịàmà Jehova ndị ahụ ma kwuo na ọjụjụ ha jụrụ ikwe ukwe e ji eto mba egosighị na ha anaghị asọpụrụ mba ha. N’obodo Kameruun, Kongo Kinshasa, Ekwitorịal Gini,
na Malawi, a chụọkwala ụmụ Ndịàmà Jehova n’ụlọ akwụkwọ n’ihi na ha jụrụ ikwe ukwe e ji eto mba. Ụmụnna anyị ndị nọ ná mba ndị a na-agbasi mbọ ike ka ha mee ka ndị ọchịchị na ndị isi ụlọ akwụkwọ mata ihe mere na anyị anaghị ekele ọkọlọtọ ma ọ bụ kwee ukwe e ji eto mba. -
N’ọnwa Disemba afọ 2013, otu ụlọ akwụkwọ sekọndrị e nwere na Lepaera, dị́ na Họnduras, jụrụ inye ụmụ Ndịàmà Jehova abụọ asambodo n’ihi na ha jụrụ ikwe ukwe e ji eto mba na ikele ọkọlọtọ. Ka e nwee ike ịkwụsị nsogbu a, Ndịàmà Jehova abụọ bụ́ ndị ọkàiwu gakwuuru onye na-anọchi anya ministri na-ahụ maka mmụta na Họnduras. Ha kọọrọ ya ihe ụfọdụ ụlọikpe ndị dị ná mba ọzọ kpebiri n’ikpe ndị ha kpelaara ụmụ Ndịàmà Jehova nọ n’ụlọ akwụkwọ, bụ́ ndị jụrụ ikwe ukwe e ji eto mba ma ọ bụ ikele ọkọlọtọ. Onyeisi ahụ dị obiọma. O kwetara ka ụmụ akwụkwọ abụọ ahụ na ndị mụrụ ha degara onyeisi na-ahụ maka mmụta na Họnduras akwụkwọ. Mgbe onyeisi ahụ lebachara anya n’akwụkwọ ahụ, o kwuru n’abalị iri abụọ na itoolu n’ọnwa Julaị, afọ 2014, sị: “E kwesịghị igbochi onye ọ bụla ịga akwụkwọ.” Ọ gwara ndị isi ụlọ akwụkwọ ahụ ka ha nye ụmụ Ndịàmà Jehova abụọ ahụ asambodo ha.
Otú Ndị Ọchịchị Si Akpa Ókè
Ná mba ọ bụla, anyị na-erube isi n’iwu Jizọs nyere anyị ka anyị na-ezi ndị agbata obi anyị ozi ọma Alaeze Chineke, na-abịachi ọmụmụ ihe anya ma na-amụchi Okwu Chineke anya. Anyị na-erubekwa isi n’iwu Baịbụl nyere anyị, nke bụ́ ka anyị na-akụnye Okwu Chineke n’ime ụmụ anyị ma ‘zere ọbara.’ Anyị jikwa iwu ndị a kpọrọ ihe. (Ọrụ. 15:20; Diut. 6:5-7) Mgbe ụfọdụ, irube isi n’iwu ndị a na-eme ka ndị ọchịchị nyewe anyị nsogbu n’ihi na ha aghọtaghị ihe mere anyị ji eme otú ahụ.
-
N’obodo Flọrịda, dị́ n’Amerịka, otu ọkàikpe nyere otu nne na-abụghị Onyeàmà Jehova ikike ka naanị ya na-akụziri ụmụ ya atọ ihe okpukpe ya na-akụzi. A gwara nna ha bụ́ Onyeàmà Jehova ka ọ ghara ịkụziri ụmụ ya ihe ọ bụla megidere ihe ndị Katọlik kweere. Nwanna a wepụrụ okwu a n’ụlọikpe mkpegharị ikpe. N’abalị iri na asatọ n’ọnwa Ọgọst, afọ 2014, ụlọikpe mkpegharị ikpe ahụ kagburu ihe ụlọikpe mbụ ahụ kpebiri. Ụlọikpe mkpegharị ikpe ahụ si n’ikpe ndị e kpere n’oge gara aga kpebie ikpe a. Ha sịrị: “Ọtụtụ mgbe, a kagbuola iwu a machibidoro nne ma ọ bụ nna nke ya na ụmụ ya na-ebighị ịkụziri ụmụ ya ihe gbasara okpukpe ya mgbe a na-enweghị ihe a ga-eji gosi na nne ma ọ bụ nna ahụ ịkụziri nwa ha ihe ndị o kweere ga-eme ka nwa ahụ ghara ịba uru.”
Ihe a ụlọikpe ahụ kpebiri emeela ka a na-akụziri ụmụaka ndị ahụ ihe ndị ga-abara ha uru Jehova Chineke chọrọ ka a na-akụziri ụmụaka. Ha na-abịakwa ọmụmụ ihe, na-emekwa nke ọma n’ọgbakọ. Nna ha kwuru, sị: “Idi ọnọdụ a m hụrụ onwe m emeela ka m mụtakwuo ihe. O nweela ọnwụnwa ndị bịaara m n’oge ndị na-adịbeghị anya, ma Jehova nyeere m aka ịkwụrụ chịm. Ama m na ọnwụnwa so n’ihe ga na-abịara anyị mgbe anyị kpebiri ijere Jehova ozi.” -
Ọnwụnwa kpụ ọkụ n’ọnụ bịaara otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Efigenia Semente na Namibia. O ji ụmụ atọ. Mgbe ọ na-amụ nwa nke atọ ya n’ụlọ ọgwụ, ọ malitere inwe nsogbu, ụfọdụ ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ ọgwụ nakwa ndị ezinụlọ ya na-abụghị
Ndịàmà Jehova gara n’ụlọikpe nata ikike ka a mịnye ya ọbara. Ebe ọ bụ na ọ chọghị ka a mịnye ya ọbara, ọ gbara ha akwụkwọ iji gosi na o nweere onwe ya ikpebi otú ọ chọrọ ka e si gwọọ ya. N’abalị iri abụọ na anọ n’ọnwa Jun, afọ 2015, Ụlọikpe Kasị Elu na Namibia kpelaara Nwanna Nwaanyị Semente ikpe. Ha kwuru na mmadụ ọ bụla nweere onwe ya ikpebi ihe ọ chọrọ ka e mee n’ahụ́ ya na ihe ọ na-achọghị, ma onye ahụ ọ̀ bụ nne ma ọ bụ nna, ma ọ bụkwanụ na ọ bụghị. Nwanna Nwaanyị Semente kwuru, sị: “Anyị hụrụ ihe ndị gosikwuru na Jehova nọnyeere anyị. O nweghị ihe a ga-eji tụnyere mmadụ ịnọ n’ọgbakọ Jehova. Jehova hụrụ anyị nnọọ n’anya.” -
Ọ bụghị taa ka Ndịàmà Jehova nọ́ na Swizaland bidoro idowe akwụkwọ anyị n’ihe a na-akwagharị akwagharị n’ebe na-ekwo ekwo. Ma n’obodo Jeneva, ndị ọchịchị obodo tiri iwu ka mmadụ ghara idowe ihe a na-akwagharị akwagharị e tinyere ihe ọ bụla na-ekwu gbasara okpukpe n’ebe ọhaneze na-anọ. Ndịàmà Jehova gbara ndị ọchịchị ahụ akwụkwọ ma kwuo na iwu a ga-akpa ikike anyị nwere ikpe okpukpe anyị otú masịrị anyị na ikwu obi anyị aka ọjọọ. Ụlọikpe kpelaara Ndịàmà Jehova ikpe. Kemgbe ahụ kwa, Ndịàmà Jehova na ndị ọchịchị
Jeneva gbakọziri aka na-achọta ebe dị́ mma ha ga na-edowe ihe a na-akwagharị akwagharị nakwa oge ha ga na-edowe ya. -
Ndị ọchịchị Azebaịjan na-agbasikwu mbọ ike ka ha kwụsị Ndịàmà Jehova izi ndị mmadụ ozi ọma. Ndị isi na-arụ na Ministri Na-ahụ Maka Nchebe Obodo na-akpọkarị Ndịàmà Jehova otu otu n’ọfis ha ma gbaa ha ajụjụ. Ha na-agakwa n’ụlọ Ndịàmà Jehova achọ akwụkwọ anyị ndị ọchịchị obodo ha na-akwadoghị ka anyị bubata. N’ọnwa Febụwarị afọ 2015, ha kpọchiri ụmụnna nwaanyị abụọ aha ha bụ Irina Zakharchenko na Valida Jabrayilova maka na ha na-akụziri ndị mmadụ Baịbụl. Ihe a ndị isi a mere wutere ndị nọ́ ná mba dị iche iche. Ọ bụ eziokwu na ihe a wutere anyị, ma obi dị anyị ụtọ na ụmụnna anyị nọ́ n’Azebaịjan ka ji ịnụ ọkụ n’obi na-ezi ndị mmadụ ‘ozi ọma alaeze Chineke.’—Mat. 24:14.
-
Ndị ọchịchị Rọshịa akwụsịbeghị inye Ndịàmà Jehova nsogbu n’ihi ozi ọma ha na-ezi. Taa, e nwere akwụkwọ anyị iri asatọ ha machiri iwu. Nke a pụtara na onye ọ bụla a hụrụ nke ọ bụla n’aka ma ọ bụ nyere ya mmadụ adaala iwu. Otu n’ime akwụkwọ ndị ahụ bụ Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible. Ha machikwara jw.org iwu n’ọnwa Disemba afọ 2014. Ndị na-enye mmadụ ikike ịga n’Ịntanet anaghịzi ekwe ka mmadụ gaa na jw.org, onye ọ bụla gwara mmadụ ka ọ gaa na ya adaala iwu. Kemgbe ọnwa Mach, afọ 2015, ndị kọstọm ekwebeghị ka Ndịàmà Jehova bubata akwụkwọ ha ọ bụla, ma Baịbụl ma akwụkwọ anyị ndị ụlọikpe ndị dị́ na Rọshịa nyocharala n’oge gara aga ma kwuo na ọ dịghị ihe ọjọọ dị na ha.
A ka na-ekpe ụmụnna anyị iri na isii ikpe na Taganrog n’ihi na ndị ọchịchị gbara ha akwụkwọ na ha dara iwu maka na ha haziri ọmụmụ ihe, na-agakwa ya. Ụlọikpe nyere ndị ọchịchị Samara ikike iwepụ aha ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova n’akwụkwọ. N’agbanyeghị ihe ndị a niile, ụmụnna anyị nọ́ na Rọshịa kpebisiri ike ịna-akwụ “Chineke ihe Chineke.”—Mat. 22:21.