ISIOKWU TETA! A
Otú Ị Ga-esi Jiri Oge Gị Na-eme Ihe Bara Uru
“Ọ dị m ka ya bụrụ na oge ka dị.” Ugboro ole ka i kwutụrụla ihe a? Anyị nwere ike ikwu na onye ọ bụla nọ n’ụwa nwere oge ole ibe ya nwere n’ihi na ọ bụ awa iri abụọ na anọ ka ma onye ukwu ma onye nta, ma ọgaranya ma ogbenye nwere n’ụbọchị. Ma ọgaranya ma ogbenye enweghị ike inwetaghachi oge gafere agafe. Oge gafehaala, ọ gaala. N’ihi ya, ihe kacha mma anyị kwesịrị iji oge anyị na-eme bụ ihe ga-abara anyị uru. Olee otú anyị ga-esi na-eme ya? Ka anyị leba anya n’ụzọ ihe anọ nyeerela ọtụtụ ndị aka iji oge ha na-eme ihe ga-akacha abara ha uru.
Nke Mbụ: Hazie Ihe Ndị Ị Ga-eme Nke Ọma
Bute ihe ndị ka mkpa ụzọ. Baịbụl gwara anyị ka anyị “na-achọpụta ihe ndị ka mkpa.” (Ndị Filipaị 1: 10) Depụta ihe ndị ị ga-eme. Depụta ndị nke dị mkpa ma ọ bụ ndị nke i kwesịrị ime ngwa ngwa ma ọ bụkwanụ gị edepụtachaa ha abụọ. Ka ị na-edepụta ha, burukwa n’obi na ọ bụghị iwu na ihe ndị dị mkpa, dị ka ịga zụta ihe ị ga-eji sie nri, ga-eso n’ihe ndị i kwesịrị ime ngwa ngwa. Chetakwa na ihe yiri ihe i kwesịrị ime ngwa ngwa, dị ka ile ihe omume TV tupu oge ya agafee, nwere ike ghara ịbụ ihe dị mkpa.
Buru ụzọ hazie ihe ị ga-eme tupu oge ya eruo. Ekliziastis 10: 10 kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ngwá ọrụ anyụọ nkọ, ma onye ji ya arụ ọrụ amụghị ya, ọ ga-arụgbu onwe ya n’ọrụ.” Amaokwu ahụ kwukwara, sị: “Ma, amamihe na-enyere mmadụ aka ka ihe gaziere ya.” Gịnị ka ihe a na-akụziri anyị? Otú anyị nwere ike isi na-amụ ngwá ọrụ anyị bụ ibu ụzọ hazie ihe anyị ga-eme tupu oge ya eruo ka anyị wee jiri oge anyị na-eme ihe bara uru. Ọ bụrụ na ị haziwe ihe ndị ị ga-eme, tinye ihe ndị na-adịghị mkpa n’ihe ị ga-eme n’ikpeazụ ma ọ bụkwanụ gị ewepụchaa ha maka na ha ga-eri gị oge, laakwa ike gị n’iyi. Ọ bụrụ na i mechaa ihe i ji n’aka, oge aka dịrị, i nwere ike mewe ihe ndị ị gaara eme mgbe ọzọ. I si otú a na-ahazi ihe ndị i kwesịrị ime tupu oge ị ga-eme ha eruo, ị ga na-eme ọtụtụ ihe bara uru otú ahụ onye na-arụ ọrụ nke mụrụ ngwá ọrụ ya amụ si arụpụta ọtụtụ ihe.
Etinyela aka n’ọtụtụ ihe. Emela ihe ndị na-adịghị mkpa ma ọ bụ ihe ndị na-egbu oge gị. Itinye aka n’ọtụtụ ihe na ikweta ọtụtụ ebe ị ga-aga nwere ike mee ka obi ghara ịna-eru gị ala, gị agharakwa ịna-enwe obi ụtọ.
Nke Abụọ: Emela Ihe Ga Na-egbu Gị Oge
Egbula oge tupu i kpebie ihe ị ga-eme. Baịbụl sịrị: “Onye na-ele ifufe anya agaghị agha mkpụrụ, onye na-elekwa ígwé ojii anya agaghị ewe ihe ubi.” (Ekliziastis 11:4) Gịnị ka ihe a na-akụziri anyị? Mmadụ igbu oge nwere ike ime ka oge ganahụ ya, onye ahụ agharakwa ịrụpụta ihe ọ bụla. Ọ bụrụ na onye ọrụ ugbo ana-echere ruo mgbe ihe niile dịịrị ya mma, o nwere ike ọ gaghị agha mkpụrụ ma ọ bụkwanụ wee ihe ubi. Ọ bụkwa otú a ka ọ dị ma a bịa n’ihe gbasara mmadụ ikpebi ihe ọ ga-eme. Mmadụ nwere ike ikwe ka ihe ndị ọ na-ejighị n’aka na ha ga-eme mee ka ọ na-egbugharị oge ikpebi ihe ọ ga-eme, ma ọ bụ chee na ya kwesịrị ichere ruo mgbe ọ matachara ihe niile dị mkpa banyere otu ihe tupu o mee mkpebi. Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwee ihe dị mkpa mmadụ chọrọ ikpebi, o kwesịrị ibu ụzọ mee nchọnchọ ma ọ bụ jụọ ase banyere ya. Ilu 14:15 kwuru, sị: “Onye ma ihe na-echebara ihe ọ bụla ọ chọrọ ime echiche.” Ma, otu ihe doro anya bụ na ọ bụghị mgbe niile ka mmadụ ga-amatachali ihe niile gbasara ihe ọ chọrọ ikpebi.—Ekliziastis 11:6.
Imetacha ihe ọ bụla nke ọma. Jems 3:17 kwuru, sị: “Amamihe nke si n’eluigwe [ya bụ, nke si n’aka Chineke] . . . na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị.” Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị kwesịrị imezi ihe ọ bụla anyị na-eme emezi. Ma mgbe ụfọdụ, anyị chọọ imetacha nnọọ ihe niile otú anyị chọrọ, o nwere ike ime ka anyị ghara imeta ya otú anyị na-atụ anya ya ma ọ bụdị ghara imeta ya emeta. Dị ka ihe atụ, onye na-amụ asụsụ ọzọ kwesịrị ịma na o nwere mgbe ọ na-agaghị asụtacha asụsụ ahụ ọ na-amụ, nakwa na ya ga-esi ná ndị nke ọ na-asụtaghị mụta ihe. Ma, ọ bụrụ na mmadụ ka na-amụ asụsụ amụ, ya eburu n’obi na ya ga-asụtacharịrị ihe niile nke ọma, obi agaghị adị ya mma mgbe ọ bụla ọ na-asụtaghị asụsụ ahụ. Ihe a ga-eme ka ịmụta asụsụ ahụ na-esiri ya ike. N’ihi ya, ọ kacha mma ka anyị zere ịna-atụ anya ihe karịrị akarị. Ilu 11:2 kwuru, sị: “Onye dị umeala n’obi ma ihe.” Ndị dị umeala n’obi anaghị ewere onwe ha ka ndị na-agaghị emejọ ihe. Ọtụtụ mgbe, ha na-achịdị onwe ha ọchị ma o nwee ihe ha na-emetachaghị.
“Ọ bụghị ego ka i ji akwụ ụgwọ ihe ị zụrụ. Ọ bụ oge ka i ji akwụ ụgwọ ya.”—Akwụkwọ bụ́ What to Do Between Birth and Death
Nke Atọ: Anọla n’Ọrụ Mgbe Niile
Arụgbula onwe gị n’ọrụ. Baịbụl kwuru, sị: “Mmadụ izurutụ ike dị mma karịa mmadụ ịrụgbu onwe ya n’ọrụ na ịchụ ifufe.” (Ekliziastis 4:6) Ọtụtụ mgbe, ndị ‘na-arụgbu onwe ha n’ọrụ’ anaghị ericha uru ọrụ ha na-arụ. Ha anaghị enwe oge ha ga-eji mee onwe ha obi ụtọ. Ma, ndị umengwụ na-eji oge ha niile ‘ezu ike,’ na-alakwa ya n’iyi. Baịbụl gwara anyị ka anyị na-arụ ọrụ, na-ewepụtakwa ohere anyị ga-eji na-eme onwe anyị obi ụtọ. Obi ụtọ ahụ “bụ onyinye Chineke.”—Ekliziastis 5:19.
Na-ehi ụra nke ọma. Otu onye so dee Baịbụl kwuru, sị: “M ga-edina ala hie ụra n’udo.” (Abụ Ọma 4:8) Ọtụtụ ndị torola eto kwesịrị ịna-ehi ụra ihe dị ka awa asatọ n’abalị ka ahụ́ nwee ike ịna-adị ha mma, ha ana-echekwa echiche nke ọma. Onye wepụtara oge hie ụra ji oge ya mee ihe bara uru n’ihi na ụra na-eme ka uche kpakọọ mmadụ ọnụ. N’ihi ya, ọ ga-enyere mmadụ aka ma a bịa n’ịmụ ihe. Ma, ehighị ụra nke ọma na-eme ka mmadụ ghara ịmụta ihe, na-eme ka mmadụ nwee ihe ọghọm, ghara ịna-emetacha ihe ọ na-eme, ahụ́ ana-agbakasịkwa ya.
Kpebie ihe ị ga-emeli. Baịbụl kwuru, sị: “Ọ ka mma na mmadụ ji ihe ndị ọ na-ahụ anya na-eme onwe ya obi ụtọ kama ịchọgharịwa ihe na-agụ ya agụụ ọ na-enweghị ike inweta.” (Ekliziastis 6:9) Gịnị ka ihe a pụtara? Onye ma ihe anaghị eji oge ya niile achọ otú ihe na-agụ ya agụụ ga-esi eru ya aka, karịchaa, ma ọ bụrụ ihe ọ na-agaghị enwetali. Ọ bụ ya mere na ire ụtọ ndị na-akpọsa ngwá ahịa anaghị emegharị ya anya, ọ naghịkwa ekwe ka a rata ya ịzụ ihe mgbe ọ na-ejighị ego. Kama, ihe o nwere, ya bụ, “ihe ndị ọ na-ahụ anya” na-eju ya afọ.
Nke Anọ: Jiri Ihe Ndị Dị Mma Kpọrọ Ihe
Leruo ihe ndị i ji kpọrọ ihe anya. Ileru ihe ndị i ji kpọrọ ihe anya ga-enyere gị aka ịma ihe dị mma, ihe dị mkpa, na ihe bara uru. Ọ bụ ihe ndị i ji kpọrọ ihe ka ị ga-akacha na-eme ná ndụ. I jiri ihe ndị dị mma kpọrọ ihe, ha ga-eme ka ihe ndị ị ga-achọ ime ná ndụ bụrụ ihe ndị dị mma, meekwa ka i jiri awa ọ bụla nakwa ụbọchị ọ bụla na-eme ihe bara uru. Olee ebe anyị ga-achọta ihe ndị ahụ anyị kwesịrị iji kpọrọ ihe? Ọtụtụ ndị na-achọta ya na Baịbụl. Ha ma na amamihe dị na ya bụ ịgba.—Ilu 2:6, 7.
Jiri ịhụnanya kpọrọ ihe karịchaa. Ndị Kọlọsi 3:14 kwuru na ịhụnanya “na-eme ka mmadụ niile dịrị n’otu.” Ma ịhụnanya adịghị, anyị agaghị na-enwe obi ụtọ, obi agaghịkwa na-eru anyị ala, karịchaa n’ezinụlọ. Ndị na-ewere akụnụba ma ọ bụ ọrụ ha ka ihe kacha mkpa anaghị enwe obi ụtọ. N’eziokwu, ọ bụ ya mere na ihe Baịbụl kwuru gosiri na ịhụnanya bụ àgwà bara ezigbo uru. Baịbụl kwukwara banyere ịhụnanya ọtụtụ narị ugboro.—1 Ndị Kọrịnt 13:1-3; 1 Jọn 4:8.
Wepụta oge na-amụ banyere Chineke. O nwere otu nwoke aha ya bụ Geoff. Ya na nwunye ya na ụmụ ya abụọ na-ebi n’udo. O nwekwara ezigbo ndị enyi. Ọrụ ọ na-arụ n’ụlọ ọgwụ na-atọkwa ya ụtọ. Ma, ọrụ a ọ na-arụ mere ka ọ na-ahụ otú ndị mmadụ si atagbu onwe ha n’ahụhụ nakwa otú ọtụtụ ndị si anwụ. Ihe a mere ka ọ na-ajụ onwe ya ma “è kere mmadụ ka ọ na-ata ahụhụ, na-anwụkwa anwụ.” Otu ụbọchị, ọ gụrụ akwụkwọ ụfọdụ Ndịàmà Jehova bipụtara ma nweta azịza ajụjụ ya. Azịza ndị ahụ jukwara ya afọ.
Geoff kọọrọ nwunye ya na ụmụ ya ihe ndị ọ na-amụta, ọ masịkwara ha. Ọ bụ otú a ka ha niile si malite ịmụ banyere Chineke. Ihe a ha na-amụ mere ka ha na-ebi n’udo, ha ejirikwa oge ha na-eme ihe kacha mma. Baịbụl ha malitere ịmụ mekwara ka ha nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa mgbe ahụhụ na-agaghịzi adị, mgbe ndụ ga-enwekwa isi.—Mkpughe 21:3, 4.
Akụkọ banyere Geoff na-echetara anyị ihe Jizọs Kraịst kwuru. Ọ sịrị: “Ndị ma na ọ bụ Chineke kwesịrị ịna-eduzi ha na-enwe obi ụtọ.” (Matiu 5:3) Ị̀ ga-achọ iwepụta ntakịrị oge ị ga-eji na-amụ Baịbụl? N’eziokwu, i wepụta oge gị jiri ya na-amụ Baịbụl, ọ ga-abara gị uru kwa ụbọchị nakwa ná ndụ gị niile. O nweghị ihe ọzọ ị ga-eji oge gị mee ga-abara gị uru karịa ya.