Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Azebaịjan

IKWUSA OZI ỌMA NA ỊKỤZI IHE N’ỤWA NIILE

Yurop

Yurop
  • MBA OLE DỊ NA YA 47

  • MMADỤ OLE BI NA HA 744,482,011

  • NDỊ NKWUSA OLE NỌ NA HA 1,611,290

  • MMADỤ OLE A MỤỤRỤ BAỊBỤL 834,121

O Ji Olu Ọma Zaghachi Ya

Na Jọjia, otu nwoke gara n’ebe e dowere akwụkwọ anyị na-aba mba, sị: “Agaghị m ekwe unu zie ozi ọma ebe a. Jọjia bụ obodo e ji okpukpe Ọtọdọks mara.” Nwanna nwoke nọ n’akụkụ ebe ahụ e dowere akwụkwọ anyị ji olu ọma jụọ ya ma ọ̀ gụtụla akwụkwọ anyị mbụ. Nwoke ahụ asị ya, “Mba, agụtụbeghị m ya.” Nwanna ahụ ji akọ gwa ya ka ọ gbalịa gụọ akwụkwọ anyị. Otú ahụ nwanna ahụ si gwa ya okwu mere ka iwe nwoke ahụ dajụọ, ya ewerezie akwụkwọ anyị ụfọdụ. Mgbe abalị ole na ole gachara, nwoke ahụ lọghachiri ma rịọ mgbaghara maka otú o si kpaa àgwà n’ụbọchị ahụ. Ọ sịrị na ya gụụrụ mama ya kpuru ìsì magazin o weere ụbọchị ahụ. Ya na mama ya nwere mmasị n’ihe e kwuru na magazin ahụ, chọọkwa inweta akwụkwọ anyị ọzọ ha ga-agụ. Ugbu a, ọ na-abịazi n’ebe ahụ anyị na-edowe akwụkwọ mgbe niile na-ewere magazin ndị pụtara ọhụrụ.

Ụzọ Kacha Mma Isi Dozie Esemokwu

Ka ụmụnna nwoke abụọ nọ n’ozi ọma n’Azebaịjan, ha gakwuuru otu nwoke guzo n’ihu otu ụlọ, bido ziwe ya ozi ọma. Nwoke ahụ sịrị ha, “Ekwesịghị m ige ihe a unu na-ekwu; ọ bụụrụ m mmehie.” Ọ mịpụtara mma n’akpa azụ ya, sị: “O nwere onye megburu m, ana m agaa iji mma a megwara ya ihe o mere m.”

Ihe a tụrụ ụmụnna ndị ahụ n’anya, ha asị ya, “Mana, igbu mmadụ bụ mmehie.”

Nwoke ahụ jụrụ ha, sị: “Gịnịzi ka m ga-eme?” Ha gụụrụ ya Ndị Rom 12:​17-21 ma kọwaara ya na ọ bụ Chineke nwe ịbọ ọbọ nakwa na anyị ekwesịghị ikwe ‘ka ihe ọjọọ merie anyị, kama ka anyị jiri ihe ọma na-emeri ihe ọjọọ.’ Ha gwara ya na ọ kacha mma ka ya na onye ahụ jiri olu ọma kwurịta nsogbu ha, nakwa na ọ bụrụ na o gbuo mmadụ, obi ya ga na-ama ya ikpe. Ihe a ha gwara ya masịrị ya, ya alawazie.

Mgbe ihe dị ka otu awa gachara, nwoke ahụ hụrụ ụmụnna ahụ ma sị ha: “Esi m ebe onye ahụ m chọrọ igbu na-alọta. O nweghị ihe ọ bụla m mere ya, kama, mụ na ya ekpeziela. Obi dị m ụtọ na unu nyeere m aka ịgbara nsogbu ọsọ.” Ụmụnna ahụ gwara ya na ọ bụ Jehova bụ onye nyeere ya aka.

Ebe E Dowere Akwụkwọ Anyị Masịrị Otu Nwanna Nwaanyị Na-anaghị Ejekwa Ozi

Afọ ole na ole gara aga, otu nwanna nwaanyị nọ na Nọọwee bịara lawa azụ n’ọgbakọ. Mgbe a malitere ịna-edowe akwụkwọ anyị n’ebe ndị na-ekwo ekwo, nwanna nwaanyị a na-ahụ otu ebe a na-edowe akwụkwọ anyị mgbe ọ bụla ọ na-aga ahịa.

Ọ bụ eziokwu na ọ gakwurughị ụmụnna ndị nọ ebe ahụ, ma ọmarịcha ihe ndị a mapawara n’ihe ndị ahụ e ji edowe akwụkwọ anyị na akwụkwọ ndị dị ebe ahụ na-amasị ya. Àgwà ọma ụmụnna ndị na-anọ ebe ahụ na ejiji ọma ha mere ka ọ gụwa ya agụụ ịlọghachikwute Jehova na ọgbakọ ya.

Ọ hụkwara adres Ịntanet anyị bụ́ jw.org, ya ekpebie na ya ga-aga na ya. Obi tọrọ ya ụtọ mgbe ọ chọpụtara na ọ dịịrị ya mfe isi na jw.org chọta Ụlọ Nzukọ Alaeze dị ya nso na oge ha ji amụ ihe. O sikwa na jw.org danloduo ihe ụfọdụ, gbarakwa gaa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị. Ụmụnna nabatara ya nke ọma. Ndị okenye mekwara ndokwa ka otu nwanna nwaanyị bido mụwara ya ihe. Obere oge, ya na ọtụtụ ụmụnna bịara bụrụ enyi, ya esi otú ahụ bidoghachi ife Chineke otú ọ na-eme na mbụ. Ugbu a, ọ na-agachi ọmụmụ ihe na ozi ọma anya. Obi na-atọkwa ya ụtọ na ya na Jehova adịghachila ná mma.

O Ziri Ụmụ Klas Ya Ozi Ọma n’Ime Ụgbọala

Na Nọọwee, otu nwata nwaanyị dị afọ iri na ise aha ya bụ Ronja na ụmụ klas ya ndị nwoke atọ kparịtara gbasara evolushọn mgbe ha nọ n’ụgbọala e ji ebu ụmụ akwụkwọ. Ụmụ nwoke atọ a anabataghị ihe Ronja kweere. Ihe a wutere ya. Ma, ọ kwadoghị akwado n’ụbọchị ahụ. N’ihi ya, ọ gwara mama ya ka o nyere ya aka ịkwado ihe ọ ga-ekwu ga-eme ka ha kweta na e nwere Onye Okike.

Nọọwee: Ebe Ronja na-agwa ụmụ akwụkwọ ibe ya ihe o kweere

N’echi ya, mgbe ha nọkwa n’ụgbọala, Ronja jizi ihe ndị ahụ ọ kwadebere kọwaara ha ihe o kweere. Ma, ụmụ nwoke ndị ahụ mere ya akaja n’ihi na o kweere na Jehova. Otu n’ime ha tiri mkpu, sị: “O nweghị onye kweere na Jehova n’ụgbọala a. Ndị kweere n’evolushọn welienụ aka elu, ndị kweere na Jehova weliekwanụ aka elu.” Ọ tụrụ Ronja n’anya mgbe otu nwata nwoke nọ ya n’akụkụ weliri aka elu, sị: “Ekweere m na Jehova.” Ụmụaka abụọ ọzọ sịkwara na hanwa kweekwara na Jehova. E nwere ụmụaka ndị ọzọ nụrụ ihe ahụ Ronja na ụmụ klas ya kparịtara. Ụfọdụ n’ime ha kwetara n’ihe Ronja kwuru.

Otu Nwoke Na-amaghị Akwụkwọ Chọtara Akwụkwọ Anyị

N’ehihie otu ụbọchị, ụmụ nwoke Siria abụọ na-asụ Arabik bịara n’Alaka Ụlọ Ọrụ anyị dị na Denmak. Ha gwara ụmụnna nwaanyị nọ n’ọfis ebe a na-anabata ndị ọbịa na ha na-achọ Ndịàmà Jehova. Mgbe ụmụnna nwaanyị ndị ahụ gwara ha na ọ bụ na nke Ndịàmà Jehova ka ha nọ, obi tọrọ ha ụtọ. Ma, olee otú ha si mata ebe Alaka Ụlọ Ọrụ anyị dị? Ha gosiri ndị na-arụ n’ọ́bá akwụkwọ ọhaneze foto ha ji ekwentị ha seta. Foto ahụ bụ foto peeji ebe e dere aha ndị bipụtara akwụkwọ anyị a na-akpọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? nke asụsụ Arabik. Foto ahụ nyeere ndị ọ́bá akwụkwọ ahụ aka ịgwa ha ebe Alaka Ụlọ Ọrụ anyị dị.

Ụmụ nwoke abụọ a amachaghị asụ asụsụ Danish. A kpọtaziiri ha nwanna nwoke na-asụ Arabik. E mechara chọpụta na otu n’ime ụmụ nwoke abụọ ahụ chọsiri ike ịmụ Baịbụl. Nwanna ahụ natara ya adres ya ma kwe ya nkwa na ya ga-abịa n’ụlọ ya n’oge na-adịghị anya, nakwa na ya na nwanna ọzọ na-asụ Arabik ga-eso bịa.

Mgbe ha ruru, ha chọpụtara na Ndịàmà Jehova abịatụbeghị n’ụlọ ya mbụ. Ọ gwara ha na ya hụrụ akwụkwọ ahụ n’igbe akwụkwọ ozi ya na post ọfis. Ma, o nweghị aha e dere n’igbe ahụ gosiri na onye nwe ya bụ onye Arabik. Ebe ọ bụ na ọ maghị akwụkwọ, ọ gwara otu enyi ya ka ọ gụọrọ ya akwụkwọ ahụ. Ha ji abalị atọ gụchaa ya. Ihe ọ nụrụ n’akwụkwọ ahụ mere ka o kweta na ya achọtala eziokwu.

Otu ihe na-enye nwoke a nsogbu n’obi bụ na ọ gbara ọsọ ndụ gbata n’obodo a ọ nọ na ya. Ya na ndị ezinụlọ ya anọghịzi. Mana, ihe ọ na-amụta na Baịbụl na-akasi ya obi. Mgbe mbụ ụmụnna ndị ahụ bịara n’ụlọ ya, ọ jụrụ ha, sị: “Gịnị mere unu abịabeghị n’ụlọ m kemgbe? Ihe a bụ ụdị ihe m na-achọ.” Ya na ụmụnna ahụ ka na-amụ ihe ruo ugbu a. Obi dịkwa ya ụtọ n’ihe ọ na-amụta.

Onye Na-amabughị Chineke Bịaziri Mara Chineke

Otu nwoke aha ya bụ Dmitry bụ onyeisi n’ụlọ ọrụ na-emepụta sịga na Yukren. Ma, mgbe ọ matara na sịga adịghị mma n’ahụ́, ọ kwụsịrị ọrụ ahụ na-enye ya ezigbo ego. N’ime ọnwa atọ, nne ya na nne nwunye ya nwụnahụkwara ya. Ọnwụ ha kpara ya aka ọjọọ. Ọ tụrụ anya na ndị chọọchị ha ga-akasị ya obi ma zaa ya ajụjụ ụfọdụ na-enye ya nsogbu n’obi. Ma, ụdị ihe ahụ emeghị. Otu enyi ya gwara ya na mmadụ ịbụ onye Ọtọdọks pụtara onye ahụ “ịnya obe n’olu na-agagharị, mana, o nweghị ihe onye ahụ ma gbasara Chineke.” Otú a ka ọ dị Dmitry. O mechara mata na o nweghị ihe ọ bụla ya ma gbasara Chineke ma ọ bụ Baịbụl. O bidoro kpewe ekpere maka enyemaka n’ihi na ọ maghịzi ihe ọ ga-eme. Mgbe e mechara, o chetara na ya anụtụla banyere Ndịàmà Jehova. Ọ gara n’Ịntanet chọta adres Ịntanet anyị, gaakwa na ya. Ọtụtụ ihe e kwuru ebe ahụ banyere Baịbụl masịrị ya. Ọ gaziri chọta Ụlọ Nzukọ Alaeze dị ya nso. Mgbe o ruru n’ebe a na-adọsa ụgbọala, otu nwanna na-enye ndị mmadụ oche kelere ya ma jụọ ya ihe ọ chọrọ ka o meere ya. Dmitry zara ya, sị: “Achọrọ m ibido mụwa Baịbụl.” Ihe a bụ ọnwa isii ọ mụwara ihe. Ọ na-agachikwa ọmụmụ ihe anya.

Anyị Na-edowere Ndị Nwere Mmasị Akwụkwọ Ozi

Otu di na nwunye bi na Briten aha ha bụ Paul na Faith nwere obi ụtọ mgbe ha na otu nwaanyị aha ya bụ Susan kparịtara ụka. Ha gwakwara ya na ha ga-abịaghachi. Mgbe ha lọghachiri, ọ dabara na Susan anọghị n’ụlọ. Di na nwunye ahụ mere ihe e kwuru n’Ozi Alaeze Anyị nke ọnwa Nọvemba afọ 2014. Ha dere akwụkwọ dowere nwaanyị ahụ, gwa ya na ha ga-abịaghachi echi ya. Mgbe ha bịaghachiri, ọ tụrụ ha n’anya ịhụ na nwaanyị ahụ dekwara akwụkwọ dowere ha n’ọnụ ụzọ ya. N’akwụkwọ ahụ, ọ gwara ha na n’ụbọchị ahụ, na ya gara ahịa ịzụ ihe maka agbamakwụkwọ nwa ya nwaanyị. Di na nwunye ahụ dekwara akwụkwọ ọzọ dowere ya, gwa ya na ha ga-abịaghachi n’izu ọzọ. Mgbe ha bịara, ha hụrụ na Susan nọ na-eche ha eche. Ha jizi akwụkwọ Bible Na-akụzi malitere ya ọmụmụ Baịbụl.

Briten: Ebe Paul na Faith na-edowe akwụkwọ ha dere n’ọnụ ụzọ mmadụ

Ebe ọ bụ na nwa Susan na-aga ịla di n’oge na-adịghị anya, ọ jụrụ ha ma hà nwere ike ịhapụ ịbịa n’oge ahụ ma bịa mgbe e mechara. Mgbe di na nwunye ahụ mechara bịaghachi, o nweghị onye nọ n’ụlọ. Ha dekwara akwụkwọ ọzọ dowere nwaanyị ahụ, deekwa akara ekwentị ha na ya. Obi tọrọ ha ụtọ mgbe Susan zitaara ha ozi n’ekwentị, na-asị ha ewela iwe maka na ha ahụghị ya, na ya na onye agbata obi ya nọ n’ubi dị n’akụkụ ụlọ ha na-akpa nkata. Kemgbe ahụ, ọmụmụ ihe ha na Susan na-aga nnọọ nke ọma. Na nso nso a, ọ bịakwara ọmụmụ ihe nke mbụ ya.

Ọ na-amasị di na nwunye a ide akwụkwọ dowere ndị ha na-enwetaghị n’ụlọ. Ha sịrị: “O nweela ọtụtụ ndị ọzọ na-anọghị n’ụlọ gụrụ akwụkwọ anyị doweere ha. Ime ihe a dị mma.”

Okwukwe Ya Metụrụ Nọọsụ Lekọtara Ya n’Obi

N’ọnwa Ọgọst afọ 2014, e bugara otu nwanna nwere nsogbu n’akpa ume ya n’otu ụlọ ọgwụ dị na Họngarị. Ọ dị mwute na o teghị aka, nwanna ahụ anwụọ. O nwere otu nọọsụ aha ya bụ Tünde nọ na-elekọta nwanna ahụ mgbe ahụ ahụ́ na-adịghị ya. Nwunye nwanna a dere ihe ndị a na-esonụ gbasara nọọsụ ahụ:

“N’oge ọkọchị n’afọ 2015, mụ na nwa m nwoke gara Mgbakọ Ukwu ‘Ṅomie Jizọs.’ Ná ngwụcha ihe omume nke ụbọchị ikpeazụ, ka anyị nọ n’ebe a na-adọsa ụgbọala na-akwado ịla, otu nwaanyị bịara kwụsị n’ihu m, gbọtọ akpa ya, makụọ m ma bido bewe ákwá. Nwaanyị a bụ nọọsụ lekọtara di m mgbe ahụ́ na-adịghị ya ihe dị ka otu afọ gara aga. Ọ gwara m na mgbe ọ bụla a na-agbanwe ndị nọọsụ na-elekọta ndị ọrịa, na ya na-ekpe ekpere ka ọ bụrụ ya ka a ga-asị gaa lekọta di m. O kwuru na ọ na-adabakarị na a na-asị ya gaa lekọta di m.

“Nọọsụ ahụ sịrị na ọ bụ àgwà ọma di m na ihe ndị ọ na-akọrọ ya na ọ na-atụ anya na ha ga-eme n’ọdịnihu mere ya ji nwewe mmasị iso Ndịàmà Jehova mụsiwa Baịbụl ike.

“Nọọsụ a ka na-amụkwa Baịbụl. Ọ na-atụkwa anya ịhụ mgbe a ga-akpọlite di m n’ọnwụ. Ọ sịrị na ya ga-agwa di m na ọ bụ àgwà ọma ya na okwukwe ya siri ike nyeere ya aka ịmata Jehova na nkwa ọma ndị o kwere.”

Ha Ziri Ozi Ọma n’Ọtụtụ Ụgbọala Juru n’Ụzọ

Bọlgeria: Ebe ụmụnna anyị abụọ na-ezi ndị na-anya ụgbọala ozi ọma n’ókè mba Gris na Bọlgeria

N’ihi ngagharị iwe ndị mmadụ nọ na-eme nke mere ka okporo ụzọ kpọchie, ndị ọrụ nchekwa obodo na-emechi ụfọdụ ụzọ e si esi Gris abanye Bọlgeria. Ihe a mere ka ọtụtụ ụgbọala jupụta n’ụzọ n’ihi na ụzọ kpọchiri akpọchi. Ụmụnna ndị nọ n’otu ọgbakọ dị na Bọlgeria ji ohere ahụ gaa na-enye ndị ahụ nọ n’okporo ụzọ akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl. Ha ji akwụkwọ anyị n’asụsụ iri na abụọ. Ike gwụchara ọtụtụ n’ime ndị na-anya ụgbọala ndị ahụ, obi adịghịkwa ha mma. Mana, ha nwere mmasị iso anyị kparịta ụka. Ụmụnna anyị gere ha ntị nke ọma ma kasie ha obi. Otu n’ime ha jụrụ, sị: “Ùnu bụ Ndịàmà Jehova?” Ha sịrị ya ee. Ya asị ha, “Kam sịkwa. Ama m na o nweghị ndị ọzọ ga-abịa ebe a na-ekwusa ozi ọma ma ọ́ bụghị Ndịàmà Jehova.” Otu onye Ọstria na-anya ụgbọala kwuru, sị: “O nweghị ebe unu na-anọghị. Unu na-agbalị. Biko, jisienụ ike na-akasi ndị mmadụ obi ma na-eme ka ha nwee olileanya.” Onye ọzọ kwuru, sị: “O nwetụbeghị mgbe ọ gụrụ m agụụ ịgụ akwụkwọ unu. Ma ugbu a, m ga-eji obi m niile gụọ ya.” Anya mmiri bidoro gbawa otu onye na-anya ụgbọala mgbe otu nwanna zichara ya ozi ọma. Ọ sịrị na ya bụ Onyeàmà Jehova, mana, o teela ya gasọrọ ọmụmụ ihe. Ha gbara ya ume ka ọ gụọ akwụkwọ ha nyere ya, nakwa ka ọ gbalịa chọta Ndịàmà Jehova ma ọ laruo.