IME KA HA BỤRỤ NDỊ NA-ESO ỤZỌ JIZỌS
IHE ỌMỤMỤ NKE 12
Nwee Obi Ike
Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Mmanụ na ihe na-esi ísì ọma na-eme ka obi dị mmadụ ụtọ. Ezigbo ndụmọdụ enyi nyere enyi ya na-emekwa ka obi dị enyi ya ụtọ.”—Ilu 27:9.
Ihe Jizọs Mere
1. Lee VIDIO, ma ọ bụ gị agụọ Mak 10:17-22. Zazie ajụjụ ndị a:
Gịnị Ka Anyị Na-amụta n’Aka Jizọs?
2. Anyị kwesịrị igosi ndị anyị na-amụrụ Baịbụl na anyị hụrụ ha n’anya ma kọwaara ha n’ezoghị ọnụ ihe ha kwesịrị ime ka ha na Jehova dịrịkwuo ná mma.
Na-eme Ka Jizọs
3. Nyere onye ị na-amụrụ Baịbụl aka ikpebi ihe ndị ọ ga-eme ma mee ha.
-
a. Jiri “Ihe Ị Ga-agba Mbọ Mee” nke dị n’isi nke ọ bụla n’akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi nyere ya aka.
-
b. Nyere ya aka ka ọ chọpụta ihe ndị ọ ga-eme ka o nwee ike ime ihe ndị o kpebiri ime, ma ndị ga-ewe obere oge ma ndị ga-ewe ogologo oge.
4. Chọpụta ihe ndị na-eme ka ọ ghara ịna-eme nke ọma, nyekwara ya aka imeri ha.
-
-
‘Ọ bụrụ na onye m na-amụrụ Baịbụl anaghị agba mbọ ime baptizim, gịnị na-egbochi ya?’
-
‘Olee ihe m ga-eme ka m nyere ya aka?’
-
-
Kpee ekpere ka Jehova mee ka i jiri obi ike gwa ya hoo haa ihe o kwesịrị ime, kwuokwa ya otú na-egosi na ị hụrụ ya n’anya.
5. Kwụsị ọmụmụ Baịbụl ahụ ma ọ bụrụ na ọ naghị eme nke ọma.
-
Jụọ onwe gị ajụjụ ndị a ka ị mata ma onye ị na-amụrụ Baịbụl ọ̀ na-eme nke ọma:
-
‘Onye m na-amụrụ ihe ọ̀ na-eme ihe ọ na-amụta?’
-
‘Ọ̀ na-abịa ọmụmụ ihe ma na-agwa ndị ọzọ eziokwu ọ na-amụta?’
-
‘Ọ̀ bụrụ na ọ mụọla ihe ruo ogologo oge, ọ̀ chọrọ ịbụ Onyeàmà Jehova?’
-
-
Ọ bụrụ na onye ị na-amụrụ ihe achọghị ime nke ọma:
-
Gwa ya ka o chebara ihe o nwere ike ịbụ ya mere na ọ naghị eme nke ọma echiche.
-
Meda obi kọwaara ya ihe mere i ji akwụsị ọmụmụ ihe gị na ya.
-
Gwa ya ihe o kwesịrị ime tupu gị amụwara ya ihe ọzọ.
-