Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ỊMALITE MKPARỊTA ỤKA

IHE ỌMỤMỤ NKE 2

Malite Ya Ka Mkparịta Ụka Nkịtị

Malite Ya Ka Mkparịta Ụka Nkịtị

Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: ‘Okwu e kwuru mgbe kwesịrị ekwesị na-adị ezigbo mma.’​—Ilu 15:23.

Ihe Filip Mere

1. Lee VIDIO, ma ọ bụ gị agụọ Ọrụ Ndịozi 8:30, 31. Zazie ajụjụ ndị a:

  1.    Olee otú Filip si malite mkparịta ụka?

  2.   Gịnị mere o ji bụrụ otú dị mma ọ ga-esi malite mkparịta ụka ma kụziere nwoke ahụ ihe ọhụrụ?

Gịnị Ka Anyị Na-amụta n’Aka Filip?

2. Ọ bụrụ na anyị amalite ịkpanyere mmadụ ụka kama iziwe ya ozi ọma ozugbo anyị hụrụ ya, o nwere ike ime ka obi ruo ya ala, ya adịkwa njikere ige anyị ntị ma anyị ziwe ya ozi ọma.

Na-eme Ka Filip

3. Na-eleru anya ala. Otú ihu mmadụ dị ma ọ bụ otú o si emegharị ahụ́ nwere ike ime ka ị mata ọtụtụ ihe gbasara ya. Onye ahụ ò yiri onye nwere ike ige gị ntị? I nwere ike ịmalite ịgwa ya gbasara Baịbụl ma ị jụọ ya, sị: “Ị̀ ma na . . . ?” Ọ bụrụ na mmadụ achọghị ikwusara gị okwu, amanyela ya.

4. Na-enwe ndidi. Echela na ị ga-amalite ozugbo kwuwe gbasara Baịbụl. Chere ruo oge dabara adaba ị ga-eji gwawa onye ahụ gbasara Baịbụl. Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịbụ n’oge ọzọ gị na ya ga-ekwurịta ka ị ga-agwa ya gbasara Baịbụl.

5. Dịrị njikere ịgbanwe ihe ị chọrọ ịgwa ya. Mgbe ụfọdụ, onye gị na ya na-akparịta ụka nwere ike ikwuwe ihe ị na-atụghị anya ya. N’ihi ya, dịrị njikere ịgwa ya eziokwu Baịbụl ga-abara ya uru, ọ bụrụgodị na ọ bụghị ihe i bubu n’obi iji ezi ya ozi ọma.