ISI NKE 99
Jizọs Agwọọ Ndị Ìsì, Nyerekwa Zakịọs Aka
MATIU 20:29-34 MAK 10:46-52 LUK 18:35–19:10
-
JIZỌS AGWỌỌ NDỊ ÌSÌ NA JERIKO
-
ZAKỊỌS ONYE ỌNAỤTỤ ECHEGHARỊA
Jizọs na ndị ha na ya so na-aga abịarutela Jeriko. Isi Jeriko ruo Jeruselem na-ewe ihe dị ka otu ụbọchị. E nwere ike ikwu na e nwere obodo abụọ a na-akpọ Jeriko. Jeriko nke ochie dị ihe dị ka otu kilomita na ọkara ma e si ya gawa Jeriko nke ọhụrụ, nke e wuru mgbe ndị Rom na-achị. Ka Jizọs na ndị ha na ya so si n’otu n’ime obodo ndị a na-aga na nke ọzọ, ndị ìsì abụọ na-arịọ arịrịọ nụrụ ka ndị mmadụ na-eme mkpọtụ. Aha otu n’ime ha bụ Batimiọs.
Mgbe ha nụrụ na Jizọs na-agafe, Batimiọs na onye ìsì nke ọzọ bidoro na-eti mkpu, sị: “Onyenwe anyị, meere anyị ebere, Nwa Devid!” (Matiu 20:30) Ụfọdụ ndị so n’ìgwè mmadụ ahụ gwara ha ka ha mechie ọnụ, ma ha tisiwere mkpu ike. Mgbe Jizọs nụrụ mkpu ha na-eti, ọ kwụsịrị, gwa ndị ha na ya so ka ha kpọọ ndị ahụ na-eti mkpu. Ha gakwuuru ndị ìsì ahụ ma gwa otu n’ime ha, sị: “Nwee obi ike, bilie, ọ na-akpọ gị.” (Mak 10:49) Obi tọrọ ya ụtọ, ya eyipụ uwe elu ya, bilie n’ike, gawa ebe Jizọs nọ.
Jizọs jụrụ ya, sị: “Gịnị ka unu chọrọ ka m meere unu?” Ha abụọ rịọrọ ya, sị: “Onyenwe anyị, ka e meghee anya anyị.” (Matiu 20:32, 33) Jizọs metaara ha ebere ma metụ anya ha aka, gwazie otu n’ime ha, sị: “Lawa, okwukwe gị emewo ka ahụ́ dị gị mma.” (Mak 10:52) Ndị ìsì abụọ ahụ malitere hụwa ụzọ, bidokwa towe Chineke. Mgbe ndị mmadụ hụrụ ihe merenụ, ha malitekwara ito Chineke. Mmadụ abụọ ahụ kpuburu ìsì malitere soro Jizọs na-aga.
Ọtụtụ ìgwè mmadụ gbara Jizọs gburugburu ka o si na Jeriko na-agafe. Onye ọ bụla chọrọ ịhụ onye ahụ gwọrọ ndị ìsì abụọ ahụ. Ha nọ na-adagide Jizọs nke na ụfọdụ ndị enwedịghị ike ịhụ ya anya. Ọ bụ otú a ka ọ dị otu nwoke aha ya bụ Zakịọs. Ọ bụ onyeisi nke ndị ọnaụtụ e nwere na Jeriko nakwa n’ebe ndị dị ya nso. Zakịọs dị mkpụmkpụ. N’ihi ya, o nweghị ike ịhụ Jizọs. Ọ gbaara ọsọ gaa n’ihu, gaa rịgoro n’elu osisi fig ọhịa dị n’ụzọ ebe Jizọs ga-esi agafe. Zakịọs nọzi n’elu ebe ahụ na-ahụ ihe na-emenụ nke ọma. Mgbe Jizọs rutere ebe ahụ hụ Zakịọs n’elu osisi, ọ sịrị ya: “Zakịọs, mee ọsọ ọsọ rịdata, n’ihi na aghaghị m ịnọ n’ụlọ gị taa.” (Luk 19:5) Zakịọs mere ngwa ngwa rịdata, gbara lawa n’ụlọ ka ọ gaa kwadebe maka onye ọbịa a pụrụ iche.
Mgbe ndị mmadụ hụrụ ihe na-emenụ, ha bidoro ịtamu ntamu. Ha chere na o kwesịghị ekwesị ka Jizọs gaa nọrọ n’ụlọ nwoke ha weere ka onye mmehie. Zakịọs bara ọgaranya n’ihi ego ọ na-eji aghụghọ anara ndị mmadụ ma ọ nawa ha ụtụ isi.
Mgbe Jizọs banyere n’ụlọ Zakịọs, ndị mmadụ nọ na-atamu ntamu, na-asị: “Nwoke bụ́ onye mmehie ka ọ gara nọrọ n’ụlọ ya.” Ma, Jizọs Luk 19:7, 8.
achọpụtala na Zakịọs ga-echegharịli. O chegharịkwara. O biliri ọtọ, gwa Jizọs, sị: “Lee! Onyenwe anyị, ọkara nke ihe m nwere ka m ga-enye ndị ogbenye, ihe ọ bụla m pụnaara onye ọ bụla site n’ebubo ụgha, m ga-enyeghachi ya okpukpu anọ.”—Ihe a Zakịọs kwuru gosiri n’eziokwu na o chegharịala. O nwere ike ịbụ na ọ ga-eji akwụkwọ o ji edekọ ụtụ ndị ọ na-anata gbakọọ ego ole ọ naara ndị mmadụ. O kwekwara nkwa na ọ ga-akwụghachi ha okpukpu anọ. Ọ chọdịrị ime karịa ihe iwu Chineke kwuru. (Ọpụpụ 22:1; Levitikọs 6:2-5) Ihe ọzọ bụkwa na Zakịọs kwere nkwa inye ndị ogbenye ọkara ihe o nwere.
Obi tọrọ Jizọs ụtọ maka otú a Zakịọs si gosi na ya echegharịala. Ọ gwara Zakịọs, sị: “Nzọpụta abịawo n’ụlọ a taa, n’ihi na ya onwe ya bụ nwa Ebreham. N’ihi na Nwa nke mmadụ bịara ịchọ na ịzọpụta ihe furu efu.”—Luk 19:9, 10.
Jizọs emebuola ihe atụ banyere nwa furu efu. (Luk 15:11-24) Ugbu a, o gosila ha onye e nwere ike ikwu na o furu efu, ma e mechaa chọta ya. Ndị ndú okpukpe na ndị òtù ha nwere ike ịna-akatọ Jizọs maka inyere ndị dị ka Zakịọs aka. Ma n’agbanyeghị nke a, Jizọs nọgidere na-achọ ma na-akpọghachite ụmụ Ebreham ndị furu efu.