Ọpụpụ 30:1-38

  • Ebe ịchụàjà insens (1-10)

  • Ụmụ nwoke ga-akwụ ụgwọ iji gbara ndụ ha ma a gụọ ha ọnụ (11-16)

  • Nnukwu ite e ji ọla kọpa kpụọ a gbanyere mmiri (17-21)

  • Ihe ndị pụrụ iche e ji mee mmanụ e ji ete mmadụ mmanụ (22-33)

  • Ihe ndị e ji eme insens nsọ (34-38)

30  “Ị ga-arụ ebe ịchụàjà nke a ga na-amụ insens* na ya.+ Ị ga-eji osisi akeshịa rụọ ya.+  Ọ ga-enwe akụkụ anọ há nhata, dịrị otu kubit* n’ogologo, otu kubit n’obosara, na kubit abụọ n’ịdị elu. Ị ga-arụkọta ahụ́ ya na mpi ndị ga-adị na ya ka ha bụrụ otu.+  Ị ga-eji ọlaedo a na-agwaghị agwa machie ya: ma elu ya ma akụkụ ya niile gbaa gburugburu ma mpi ndị ga-adị na ya. Ị ga-eji ọlaedo kpụọ ihe ịchọ mma gburugburu ọnụ ya.  Ị ga-ejikwa ọlaedo kpụọ ihe abụọ dị okirikiri n’otu akụkụ ya nakwa n’akụkụ ya nke ọzọ, n’okpuru ihe ịchọ mma a kpụrụ n’ọnụ ya. Ha ga na-ejide okporo osisi ndị a ga-eji na-ebu ya.  Jiri osisi akeshịa rụọ okporo osisi ndị ahụ ma jiri ọlaedo machie ha.  Ị ga-adọsa ya n’ihu ákwà mgbochi ahụ nke dị nso n’igbe ọgbụgba ndụ*+ ahụ. Ọ ga-adị tupu ebe a dọsara igbe ọgbụgba ndụ ahụ na okwuchi ya, bụ́ ebe m ga-apụta n’ihu gị.+  “Erọn+ ga na-amụ insens na-esi ísì ọma+ n’elu ya.+ Ọ ga-eme ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ n’oge ọ na-edozi ọkụ* ndị ahụ+ kwa ụtụtụ.  Erọn ga na-amụnyekwa insens* mgbe ọ na-amụnye ọkụ* ndị ahụ ná mgbede.* Ọ bụ àjà insens a ga na-achụ n’ihu Jehova n’ọgbọ unu niile.  Unu agaghị achụ àjà insens iwu na-akwadoghị+ ma ọ bụ chụọ àjà a na-esu ọkụ ma ọ bụ àjà ọka n’elu ya. Unu awụsakwala àjà mmanya n’elu ya. 10  Erọn ga-achụ àjà ikpuchi mmehie n’elu mpi ndị dị na ya otu ugboro n’afọ.+ Ọ ga na-eji ọbara anụ e ji achụ àjà mmehie achụ àjà ikpuchi mmehie maka ya+ otu ugboro n’afọ n’ọgbọ unu niile. Ọ* bụ ihe kacha nsọ n’anya Jehova.” 11  Jehova wee gwa Mosis, sị: 12  “Mgbe ọ bụla ị gụrụ ụmụ nwoke Izrel ọnụ ka ị mata ole ha dị,+ onye ọ bụla n’ime ha ga-enye Jehova ihe ọ ga-eji gbara ndụ* ya mgbe a na-agụ ha ọnụ, ka ihe ọjọọ ọ bụla ghara ime ha mgbe a na-edeba aha ha n’akwụkwọ. 13  Ihe a bụ ihe onye ọ bụla e debara aha ya n’akwụkwọ ga-enye: ọkara shekel* e ji shekel dị n’ebe nsọ*+ tụọ. Gira* iri abụọ bụ otu shekel. Ọ bụ ọkara shekel bụ onyinye a na-enye Jehova.+ 14  Onye ọ bụla e debara aha ya n’akwụkwọ, bụ́ onye dị afọ iri abụọ ma ọ bụ karịa, ga-enye Jehova onyinye.+ 15  Ọgaranya agaghị enye ihe karịrị ọkara shekel,* ogbenye agaghịkwa enye ihe dị ala karịa ọkara shekel ka ọ bụrụ onyinye ọ na-enye Jehova iji gbara ndụ* ya. 16  Ị ga-anata ndị Izrel ego ọlaọcha ahụ ha ji gbara ndụ ha, jiri ya kwado ọrụ a na-arụ n’ụlọikwuu nzute, ka o wee bụụrụ ụmụ Izrel ihe ncheta n’ihu Jehova, ka ọ bụrụ ihe unu ji agbara ndụ* unu.” 17  Jehova gwakwara Mosis, sị: 18  “Jiri ọla kọpa kpụọ nnukwu ite na ihe a ga-eji adọkwasị ya.+ Dọsa ya n’agbata ụlọikwuu nzute na ebe ịchụàjà ma gbanye ya mmiri.+ 19  Erọn na ụmụ ya ndị nwoke ga na-asa aka ha na ụkwụ ha n’ebe ahụ.+ 20  Mgbe ha na-abanye n’ụlọikwuu nzute ma ọ bụ mgbe ha bịara ebe ịchụàjà nso ka ha jee ozi nakwa ka ha chụọrọ Jehova àjà ma mee ka anwụrụ ọkụ ya kwụgoo elu, ha ga-eji mmiri sachaa onwe ha ka ha ghara ịnwụ. 21  Ha ga-asa aka ha na ụkwụ ha ka ha ghara ịnwụ. Ọ ga-abụkwara ha iwu ha ga na-edebe mgbe niile, ma yanwa ma ụmụ ya, n’ọgbọ ha niile.”+ 22  Jehova wee gwa Mosis, sị: 23  “Weta ihe ndị a kacha mma na-esi ísì ọma: mea kpụkọrọ akpụkọ dị narị shekel* ise (500), na sinamọn na-esi ísì ọma nke bụ́ ọkara ya, ya bụ, narị shekel abụọ na iri ise (250), kalamọs na-esi ísì ọma nke dị narị shekel abụọ na iri ise (250), 24  nakwa kashịa dị narị shekel ise (500), nke e ji shekel dị n’ebe nsọ* tụọ,+ nakwa mmanụ oliv dị otu hin.* 25  Jiri ha mepụta mmanụ nsọ a ga-eji na-ete mmadụ mmanụ. A ga-agwakọta ha nke ọma.*+ Ọ ga-abụ mmanụ nsọ a ga-eji na-ete mmadụ mmanụ. 26  “Ị ga-eji ya tee ụlọikwuu nzute na igbe ọgbụgba ndụ* mmanụ,+ 27  teekwa tebụl ahụ na arịa ya niile, ihe e ji adọsa ọkụ* na arịa ya niile, ebe ịchụàjà insens ahụ, 28  ebe ịchụàjà nke àjà a na-esu ọkụ na arịa ya niile, na nnukwu ite ahụ na ihe a ga-eji adọkwasị ya. 29  Ị ga-eme ka ha dị nsọ ka ha wee bụrụ ihe ndị kacha nsọ.+ Onye ọ bụla nke ga-emetụ ha aka kwesịrị ịbụ onye dị nsọ.+ 30  Ị ga-etekwa Erọn+ na ụmụ ya ndị nwoke mmanụ+ ma mee ka ha dị nsọ, ka ha wee bụrụ ndị nchụàjà m.+ 31  “Ị ga-agwa ndị Izrel, sị, ‘Mmanụ a ga-abụrụ m mmanụ nsọ a ga-eji na-ete mmadụ mmanụ n’ọgbọ unu niile.+ 32  A gaghị ete ya mmadụ n’ahụ́. Unu agaghịkwa eji ihe ndị e ji mee mmanụ a mepụta ihe ọ bụla. Ọ bụ ihe dị nsọ. Ọ ga na-abụrụ unu ihe dị nsọ. 33  Onye ọ bụla nke mere mmanụ otite dị ka ya ma tee ya onye na-abụghị onye nchụàjà,* a ga-egbu ya.’”*+ 34  Jehova wee gwa Mosis, sị: “Weta ihe ndị a na-esi ísì ọma:+ mmanụ stakti, ọnịka na-esi ísì ọma, galbanọm na-esi ísì ọma, na frankinsens a na-agwaghị agwa. Otú otu hà ka ibe ya ga-aha. 35  Jiri ha mee insens.*+ A ga-agwakọta ha nke ọma,* tinye ya nnu.+ A gaghị etinye ya ihe ọzọ, ọ ga-adịkwa nsọ. 36  Ị ga-asụ ụfọdụ n’ime ya nke ọma ka ọ dị ka ntụ ma dowe ụfọdụ n’ime ya n’ihu igbe ọgbụgba ndụ* ahụ dị n’ụlọikwuu nzute, bụ́ ebe m ga na-apụta n’ihu gị. Ọ ga-abụrụ unu ihe kacha nsọ. 37  Unu emerela onwe unu insens nke e ji ihe ndị a mee.+ Unu ga-ewere ya ka ihe dị nsọ n’anya Jehova. 38  Onye ọ bụla mere ihe ọ bụla dị ka ya ka ọ nụrụ ísì ọma ya, a ga-egbu ya.”*

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ihe na-esi ísì ọma a na-amụnye ọkụ.”
Ihe dị ka sentimita 44.5 (inch 17.5). Gụọ B14.
Na Hibru, “n’igbe Ihe Àmà.”
Ma ọ bụ “oriọna.”
Ma ọ bụ “ihe na-esi ísì ọma a na-amụnye ọkụ.”
Ma ọ bụ “oriọna.”
O nwere ike ịbụ n’agbata oge anyanwụ dara na mgbe chi bidoro iji.
Ya bụ, ebe ịchụàjà insens ahụ.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
O nwere ike ịbụ ọlaọcha. Otu shekel bụ gram 11.4. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “e ji shekel dị nsọ.”
Otu gira bụ gram 0.57. Gụọ B14.
Otu shekel bụ gram 11.4. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Otu shekel bụ gram 11.4. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “e ji shekel dị nsọ.”
Hin bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu hin bụ lita 3.67. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “Ọ ga-adị ka nke onye na-eme mmanụ otite mere.”
Na Hibru, “igbe Ihe Àmà.”
Ma ọ bụ “ihe e ji adọsa oriọna.”
Na Hibru, “tee ya onye mbịarambịa,” ya bụ, nwoke na-esighị n’ezinụlọ Erọn.
Na Hibru, “a ga-esi ná ndị ya gbupụ ya.”
Ma ọ bụ “ihe na-esi ísì ọma a na-amụnye ọkụ.”
Ma ọ bụ “Ọ ga-adị ka nke onye na-eme mmanụ otite mere.”
Na Hibru, “Ihe Àmà.”
Na Hibru, “a ga-esi ná ndị ya gbupụ ya.”