Akwụkwọ Ozi Nke Abụọ E Degaara Ndị Kọrịnt 11:1-33
11 M chọrọ ka unu na-enwere m ndidi, ọ bụrụgodị na ọ dị ka m naghị eche echiche nke ọma. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na unu na-enwere m ndidi.
2 Ekwere m unu nkwa na m ga-akpọrọ unu kpọnye Kraịst ka ọ lụwa unu. Achọkwara m ka unu dị ka nwa agbọghọ na-amaghị nwoke mgbe m ga-akpọgara unu ya.+ Ọ bụ ya mere ihe gbasara unu ji emetụ m n’obi otú o si emetụ Chineke.
3 M na-echegbu onwe m na otú ahụ agwọ ji aghụghọ rafuo Iv,+ e nwere ike imerụ obi unu, unu agharazie iji obi unu niile na-eso ụzọ Kraịst, gharakwa ịna-ebi ndụ dị ọcha n’anya ya.+
4 N’ihi na, ọ na-abụ mmadụ bịa zie unu ozi ọma gbasara Jizọs nke dị iche na nke anyị ziri unu, ma ọ bụ, mee ka mmụọ na-abụghị mmụọ nsọ duwe unu, ma ọ bụ, zie unu ozi ọma dị iche na nke unu nabatara,+ unu anabata onye ahụ ngwa ngwa.
5 N’ihi na echere m na ọ dịghị otu mkpụrụ ihe ndịozi unu ahụ, ndị na-eme ka ọ̀ bụ ha kacha mma, ji kara m.+
6 Ọ bụrụgodị na amaghị m ekwu okwu,+ ọ pụtaghị na amaghị m ihe. N’ihe niile anyị na-eme, anyị na-egosi unu na anyị ma ihe.
7 Eji m obi ụtọ zie unu ozi ọma Chineke n’anaghị unu ihe ọ bụla. Ewedara m onwe m ala ka e bulie unu elu. Ihe a m mere ọ̀ bụ ihe ọjọọ?+
8 Anatara m ọgbakọ ndị ọzọ ihe ka à ga-asị na m napụrụ ha ya n’ike,* ka m jiri ya jeere unu ozi.+
9 Mgbe m nwere mkpa n’oge mụ na unu nọ, o nweghị onye n’ime unu m bụụrụ ibu arọ, n’ihi na ụmụnna ndị si Masedonia bịa wetara ihe niile kọrọ m.+ Emere m ihe niile m nwere ike ime ka m ghara ịbụrụ unu ibu arọ, agaghịkwanụ m abụrụ unu ibu arọ.+
10 Ebe ọ bụ na m na-eso ụzọ Kraịst, o nweghị ihe ga-eme ka m kwụsị isi a m na-anya+ n’obodo niile dị n’Akeya.
11 Gịnị mere anataghị m unu ihe ọ bụla? Ọ̀ bụ n’ihi na ahụghị m unu n’anya? Chineke ma na m hụrụ unu n’anya.
12 E nwere ndị na-anya isi, na-asị na ha bụ ndịozi otú anyị bụ. N’ihi ya, m ga na-eme ihe m na-eme+ iji hụ na ha enweghị ihe ha ga-eji na-anya isi.
13 N’ihi na ndị dị otú ahụ bụ ndịozi ụgha, ndị aghụghọ, ndị na-eme ka hà bụ ndịozi Kraịst.+
14 Ọ naghịkwa eju m anya, n’ihi na Setan n’onwe ya na-eme ka ọ̀ bụ mmụọ ozi nke ìhè.+
15 N’ihi ya, ọ naghịkwa eju m anya na ndị na-ejere ya ozi na-eme ka hà bụ ndị ezi omume. Ma, ihe ga-eme ha n’ikpeazụ ga-abụ n’ihi ihe ha na-eme.+
16 Ana m ekwu ọzọ, sị: Ka onye ọ bụla ghara iche na mụ anaghị eche echiche nke ọma. Ma, ọ bụrụgodị na ọ dị unu ka anaghị m eche echiche nke ọma, nabatanụ m, ka m nweekwanụ ihe m ga-eji nyatụ isi.
17 Otú a m si na-ekwu ihe a abụghị otú Onyenwe anyị gaara esi ekwu ya, kama, m na-anya isi ka onye na-anaghị eche echiche nke ọma.
18 Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị ji ihe ndị dị n’ụwa na-anya isi,* mụnwa ga-anyakwa isi.
19 Ebe unu sị na unu na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị, gịnị mere unu ji jiri ọṅụ na-anabata ndị na-anaghị ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị?
20 N’eziokwu, unu na-anabata onye ọ bụla ji unu mere ohu, onye ọ bụla nke na-erigbu unu, onye ọ bụla nke na-anara unu ihe unu nwere, onye ọ bụla nke na-ebuli onwe ya elu ma na-eleda unu anya, nakwa onye ọ bụla nke na-ama unu ụra.
21 Ihe a anyị na-ekwu na-eme anyị ihere, n’ihi na ọ dị ụfọdụ ndị ka anyị anaghị ejicha ikike anyị nwere eme ihe anyị kwesịrị ime.
Ma ọ bụrụ na ihere anaghị eme ụfọdụ ndị ịnya isi, ihere anaghịkwa eme m ịnya isi, n’agbanyeghị na mmadụ nwere ike iwere m ka onye na-anaghị eche echiche nke ọma.
22 Hà bụ ndị Hibru? Mụnwa bụkwa.+ Hà bụ ndị Izrel? Mụnwa bụkwa. Hà bụ ụmụ* Ebreham? Mụnwa bụkwa.+
23 Hà bụ ndị ozi Kraịst? Ana m aza ka onye ara, abụ m karịa ha: Arụọla m ọrụ karịrị nke ha rụrụ.+ A tụọla m mkpọrọ ọtụtụ ugboro karịa ha.+ E tiela m ihe ọtụtụ ugboro, anọọkwala m n’ọnụ ọnwụ ọtụtụ ugboro.+
24 Ndị Juu pịara m ọnụ ụtarị iri atọ na itoolu* ugboro ise.+
25 Ndị ọzọ pịara m ụtarị ugboro atọ.+ A tụrụ m nkume otu ugboro.+ Ugboro atọ ka m nọ n’ụgbọ mmiri na-aga njem, ụgbọ ekpuo.+ M nọrọ n’ime oké osimiri otu ụbọchị, ehihie na abalị.
26 Ana m aga ọtụtụ ebe. Ka m na-aga, e nwere oge ndị m hụsiri anya ma n’osimiri, ma n’aka ndị ohi, ma n’aka ndị obodo anyị,+ ma n’aka ndị mba ọzọ,+ ma n’obodo ukwu,+ ma n’ala ịkpa, ma n’oké osimiri, ma n’aka ndị na-abụghị ezigbo ụmụnna.
27 Arụrụ m ọrụ siri ike, gbaa ezigbo mbọ,+ mụọ anya abalị ọtụtụ ugboro.+ Agụụ gụrụ m, akpịrị kpọkwara m nkụ. Anọrọ m ọtụtụ ugboro n’erighị nri,+ oyi ana-atụ m, enweghịkwa m uwe m ga-eyi.*
28 E wezụga ihe ndị a, m nọkwa na-echegbu onwe m kwa ụbọchị maka ọgbakọ niile.+
29 M na-emetere ndị e kwesịrị inyere aka ebere. Ezigbo iwe na-ewekwa m ma mmadụ mee ihe kpara okwukwe ndị ọzọ aka ọjọọ.
30 Ọ bụrụ na m ga-anyarịrị isi, aga m eji ihe ndị gosiri na mụ adịghị ike nyaa isi.
31 Chineke nke Onyenwe anyị Jizọs, onye bụ́kwa Nna ya, ma na ọ bụghị ụgha ka m na-agha. A ga na-eto Chineke a ruo mgbe ebighị ebi.
32 Na Damaskọs, gọvanọ nke nọ n’okpuru eze Aritas dunyere ndị nche ka ha na-eche obodo ahụ nche iji jide m.
33 Ma, e ji nkata si na windo dị ná mgbidi butuo m,+ mụ esizie ebe ahụ gbalaga.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Grik, “m zuru ha ohi.”
^ Na Grik, “na-anya isi dị ka anụ ahụ́ si dị.”
^ Na Grik, “mkpụrụ.”
^ Na Grik, “ọnụ ụtarị iri anọ e wepụrụ otu.”
^ Na Grik, “agbakwara m ọtọ.”