Abụ Ọma 137:1-9
137 Anyị nọdụrụ ala n’akụkụ osimiri ndị dị na Babịlọn.+
Anyị bere ákwá mgbe anyị chetara Zayọn.+
2 Anyị konyere ụbọ akwara anyị+N’elu osisi pọpla ndị dị n’ebe ahụ.*
3 Ndị dọọrọ anyị n’agha gwara anyị ka anyị bụọrọ ha abụ n’ebe ahụ.+
Ndị na-akwa anyị emo chọrọ ka anyị meere ha ihe ọchị. Ha sịrị:
“Bụọrọnụ anyị otu n’ime abụ ndị a na-abụ na Zayọn.”
4 Olee otú anyị ga-esi bụọ abụ JehovaN’ala ọzọ?
5 Jeruselem, ọ bụrụ na mụ echefuo gị,Ka aka nri m ghara ịba uru.*+
6 Ọ bụrụ na mụ echetaghị gị,Ọ bụrụ na emeghị m ka JeruselemBụrụ ihe kacha enye m ọṅụ,+Ka ire m tapara n’okpo ọnụ m.
7 Jehova, biko, chetaIhe ndị Ịdọm kwuru n’ụbọchị e meriri Jeruselem. Ha sịrị:
“Kwatuo ya! Kwaturuo ya ala!”+
8 Babịlọn,* obodo a ga-ebibi n’oge na-adịghị anya,+Onye ga-emegwara gị ihe i mere anyị+Ga-enwe obi ụtọ.
9 Onye ga-ejide ụmụ gị
Kụrie ha na nkume+ ga-enwe obi ụtọ.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ebe a na-ekwu bụ Babịlọn.
^ O nwere ike ịbụ, “kpọnwụọ.”
^ Na Hibru, “Ada bụ́ Babịlọn.”