Abụ Ọma 56:1-13
Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. A ga-eji ụda a na-akpọ “Nduru Na-anaghị Ekwu Okwu nke Nọ n’Ebe Dị Anya” kpọọ ya. Abụ Devid. Miktam.* Mgbe ndị Filistia jidere ya n’obodo Gat.+
56 Chineke, biko, meere m amara n’ihi na mmadụ efu na-emegide m.
Ha na-alụso m ọgụ ma na-emegbu m kwa ụbọchị.
2 Ndị iro m na-emegide m ụbọchị niile.
Ọtụtụ ndị na-alụso m ọgụ maka na ha dị mpako.
3 Ụjọ tụwa m,+ m na-atụkwasị gị obi.+
4 Ọ bụ Chineke, onye m na-eto n’ihi ihe o kwuru, ka m tụkwasịrị obi.
M tụkwasịrị Chineke obi; egwu anaghị atụ m.
Gịnị ka mmadụ nkịtị* ga-eme m?+
5 Kwa ụbọchị, ha na-emebiri m ihe.
Naanị ihe ha na-eche n’echiche bụ ime m ihe ọjọọ.+
6 Ha na-aga zoo ka ha kpara m aka.
Anya ha anaghị apụ apụ n’ebe m nọ,+Ha na-achọ otú ha ga-esi gbuo m.*+
7 Jụ ha n’ihi ihe ọjọọ ha na-eme.
Chineke, jiri iwe kwatuo mba dị iche iche.+
8 Ị ma otú m si na-awagharị ebe niile.+
Biko, gbanye anya mmiri m n’ime karama akpụkpọ gị.+
Ọ̀ bụ na i deghị ha n’akwụkwọ gị?+
9 Ndị iro m ga-agbaghachi azụ n’ụbọchị m ga-akpọ gị ka i nyere m aka.+
Obi siri m ike na Chineke nọnyeere m.+
10 Ọ bụ Chineke, onye m na-eto n’ihi ihe o kwuru, ka m tụkwasịrị obi.
Ọ bụ Jehova, onye m na-eto n’ihi ihe o kwuru, ka m tụkwasịrị obi.
11 M tụkwasịrị Chineke obi; egwu anaghị atụ m.+
Gịnị ka mmadụ nkịtị ga-eme m?+
12 Chineke, m ga-emezurịrị nkwa m kwere gị.+
M ga-ekele gị.+
13 N’ihi na ị napụtara m* n’aka ọnwụ,+I kweghịkwa ka m kpọbie ụkwụ,+Ka m wee dịrị ndụ na-ejegharị n’ihu Chineke.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Na Hibru, “anụ ahụ́.”
^ Na Hibru, “mkpụrụ obi m.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”