Abụ Ọma 88:1-18
Abụ ụmụ Kora.+ Abụ ọma. Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. A ga-eji ụda Mehalat* kpọọ ya. A ga na-ekwe ya ekwe ma a bụwa ya. Maskil* nke Himan+ onye Zira.
88 Jehova, Chineke onye na-azọpụta m,+N’ehihie, m na-ebe ákwá.
N’abalị, m na-ebere ákwá bịa n’ihu gị.+
2 Ka ekpere m na-ekpe ruo gị ntị.+
Gee ntị* n’ákwá m na-ebe ka i nyere m aka.+
3 N’ihi na ọtụtụ ọdachi adakwasịla m,*+M nọzi n’ọnụ ili.*+
4 A gụnyela m ná ndị na-agbada n’olulu.*+
Adịzi m ka onye na-enweghị onye na-enyere ya aka,*+
5 Nke tọgbọ n’ebe ndị nwụrụ anwụ tọgbọOtú ndị e gburu egbu si atọgbọrọ n’ili,Bụ́ ndị ị na-anaghịzi echeta,Ndị ị na-anaghịzi elekọta.
6 Ị tụbala m n’olulu kacha mie emie,N’ebe gbara ọchịchịrị, n’ime nnukwu abis.*
7 Oké iwe ị na-ewesa m dị m ka ì bunyere m ibu na-anyịgbu m.+
Ihe ndị ị na-eme m dị m ka à ga-asị na nnukwu ebili mmiri na-erikpu m. (Sila)
8 Ị chụpụla ndị mụ na ha dị ná mma, ha anọrọzie m n’ebe dị anya.+
I meela ka ha kpọọ m asị.
Ọnyà amala m, enweghịkwa m ike ịgbapụ.
9 Ahụhụ m na-ata emeela ka anya m gharazie ịna-ahụcha ụzọ.+
Jehova, m na-akpọku gị malite n’ụtụtụ ruo n’abalị.+
M gbasara aka m na-arịọ gị arịrịọ.
10 Ọ̀ bụ ndị nwụrụ anwụ ka ị ga-arụrụ ọrụ ebube?
Ndị nwụrụ anwụ hà ga-ebili too gị?+ (Sila)
11 Ọ̀ bụ n’ili ka a ga-akọsa ịhụnanya gị?
Ọ̀ bụ n’ebe ndị mmadụ na-anọ erekasị* ka a ga-akọsa na ị bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi?
12 Ọ̀ bụ n’ọchịchịrị ka a ga-amata ihe ndị dị ebube ị na-eme,Ka ọ̀ bụ n’ala ndị e chefuru echefu ka a ga-amata ezi omume ị na-eme?+
13 Ma, Jehova, m ka na-ebesara gị ákwá ka i nyere m aka.+
Kwa ụtụtụ, m na-ekpe ekpere, rịọ gị arịrịọ.+
14 Jehova, gịnị mere i ji jụ m?*+
Gịnị mere na ị naghị enyere m aka?*+
15 Kemgbe m bụ nwata,M na-ata ahụhụ, ọ fọkwara obere ka m nwụọ.+
Ahụ́ afọghịzi m maka na ị hapụrụ m ka m na-atagbu onwe m n’ahụhụ.
16 Iwe dị ọkụ ị na-ewesa m ezuola m ahụ́.+
Oké ụjọ ị na-emenye m na-ala m n’iyi.
17 Ọ na-agba m gburugburu ka mmiri malite n’ụtụtụ ruo n’abalị.
Ọ na-esi n’akụkụ niile agba m gburugburu.*
18 Ị chụpụla ndị enyi m na ndị mụ na ha dị ná mma, ha anọrọzie m n’ebe dị anya.+
Ọ bụzi mụ na ọchịchịrị na-anọ.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Ma ọ bụ “Hulata gee ntị.”
^ Na Hibru, “mkpụrụ obi m.” Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Ma ọ bụ “Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Ma ọ bụ “onye ike na-adịghịzi.”
^ Ma ọ bụ “n’ili.”
^ Ma ọ bụ “olulu na-enweghị nsọtụ.”
^ Ma ọ bụ “n’Abadọn.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
^ Na Hibru, “i ji ezoro m ihu gị.”
^ O nwere ike ịbụ, “abịa otu mgbe.”