Abụ Ọma 90:1-17

  • Chineke na-anọru ebighị ebi, ma mmadụ anaghị anọte aka

    • Otu puku afọ gara aga dị ka ụnyaahụ (4)

    • Mmadụ na-anọ afọ iri asaa ma ọ bụ iri asatọ (10)

    • ‘Kụziere anyị otú anyị ga-esi na-agụ ụbọchị anyị’ (12)

Ekpere Mosis, onye nke ezi Chineke, kpere.+ 90  Jehova, ị bụ ebe mgbaba anyị*+ si n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.   Tupu i kee ugwu dị iche iche,Ma ọ bụ, tupu i kee ụwa nakwa ala,+Ruo mgbe ebighị ebi,* ị bụ Chineke.+   Ị na-eme ka mmadụ efu laghachi n’ájá. Ị na-asị: “Ụmụ mmadụ, laghachinụ n’ájá.”+   N’ihi na n’anya gị, otu puku afọ gara aga dị ka ụnyaahụ.+ Ọ dị ka awa ole na ole n’abalị.   Ị na-ekpochapụ ha,+ e chefuo ha ka nrọ a rọrọ n’abalị. N’ụtụtụ, ha na-adị ka ahịhịa ndụ pupụtara epupụta.+   Ha na-awa okooko n’ụtụtụ, maakwa pokopoko. Ma ná mgbede, ha na-achanwụ, kpọnwụọkwa.+   N’ihi na iwe gị na-ala anyị n’iyi,+Ọnụma gị na-emenyekwa anyị ụjọ.   Ị na-edowe mmehie anyị n’ihu gị.*+ Ị na-ahụ ihe niile anyị na-eme na nzuzo.+   Ndụ* anyị na-agwụ n’ike n’ike n’ihi iwe ị na-ewesa anyị. Afọ ndụ anyị na-agwụ ọsọ ọsọ ka ebe mmadụ zere ume.* 10  Anyị na-adị ndụ ruo afọ iri asaa,Ma ọ bụkwanụ afọ iri asatọ,+ ma ọ bụrụ na anyị siri ezigbo ike. Ma ihe juru n’afọ ndị a bụ nsogbu na ahụhụ. Ha na-agwụ ngwa ngwa, nke anyị agaa.+ 11  Ònye ga-aghọtali otú iwe gị nwere ike ịdịru ọkụ? Ọ bụ otú egwu e kwesịrị ịna-atụ gị si dị ukwuu ka iwe gị sikwa dị ukwuu.+ 12  Kụziere anyị otú anyị ga-esi na-agụ ụbọchị anyị,+Ka anyị* wee mara ihe. 13  Jehova, biko, lọghachi.+ Olee mgbe ihe a ga-ebi?+ Meere ndị ohu gị ebere.+ 14  Mee ka ịhụnanya gị*+ zuo anyị ahụ́ n’ụtụtụ,Ka anyị wee na-eti mkpu ọṅụ ma na-enwe obi ụtọ+ n’oge niile anyị dị ndụ. 15  Mee ka ụbọchị ole anyị ga-aṅụrị ọṅụ hara ka ụbọchị ole i mesiri anyị ike,+Ka ọ dịkwa ọtụtụ ka afọ ole ọdachi dakwasịrị anyị.+ 16  Mee ka ndị ohu gị hụ ihe ọma ndị ị na-eme,Meekwa ka ụmụ ha hụ ebube gị.+ 17  Ka Jehova bụ́ Chineke anyị meere anyị amara. Mee ka ihe ndị anyị na-eme gaziere anyị. Biko, mee ka ihe ndị anyị na-eme gaziere anyị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ebe anyị bi.”
Ma ọ bụ “Malite mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi.”
Ma ọ bụ “Ị ma ihe ọjọọ anyị na-eme.”
Na Hibru, “Ụbọchị.”
Na Hibru, “ka okwu a takwụnyeere mmadụ.”
Ma ọ bụ “obi anyị.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”