Abụ Ọma 97:1-12

  • Jehova dị elu karịa chi ọzọ niile

    • “Jehova abụrụla Eze” (1)

    • Hụnụ Jehova n’anya, kpọọnụ ihe ọjọọ asị (10)

    • Ìhè enwuorola ndị ezi omume (11)

97  Jehova abụrụla Eze.+ Ka ụwa ṅụrịa ọṅụ.+ Ka agwaetiti niile ṅụrịa ọṅụ.+   Ígwé ojii na oké ọchịchịrị gbara ya gburugburu.+ O ji ezi omume na ikpe ziri ezi tọọ ntọala ocheeze ya.+   Ọkụ na-esi n’ihu ya apụta,+Ọ na-erepịakwa ndị iro ya niile gbara ya gburugburu.+   Àmụ̀mà ya na-eme ka ìhè nwuo n’ụwa. Ụwa na-ahụ ya wee maa jijiji.+   Ugwu niile na-agbaze ka mgbá aṅụ* n’ihi Jehova,+N’ihi Onyenwe ụwa niile.   Eluigwe na-akọsa ezi omume ya,Mmadụ niile na-ahụkwa ebube ya.+   Ka e menye ndị niile na-efe arụsị a pịrị apị ihere,+Ndị ji chi ha na-abaghị uru anya isi.+ Chi niile, kpọọrọnụ Chineke isiala.*+   Jehova, Zayọn na-anụ ihe i kpebiri wee ṅụrịa ọṅụ.+ Obodo ndị dị na Juda na-enwe obi ụtọN’ihi ihe i kpebiri.+   N’ihi na Jehova, ọ bụ gị bụ Onye Kacha Elu n’ụwa niile. Ị dị ezigbo elu karịa chi niile ọzọ.+ 10  Unu ndị hụrụ Jehova n’anya, kpọọnụ ihe ọjọọ asị.+ Ọ na-eche ndị* na-erubere ya isi nche.+ Ọ na-anapụta ha n’aka ndị ajọ omume.+ 11  Ìhè enwuorola ndị ezi omume,+Ndị obi ha dị ọcha na-aṅụrịkwa ọṅụ. 12  Unu ndị ezi omume, ṅụrịanụ ọṅụ n’ihi Jehova,Tookwanụ aha nsọ ya.*

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Mgbá aṅụ bụ ihe aṅụ na-anyụpụta nke na-adị n’ụgbụgbọ mmanụ aṅụ. Ihe a na-agbaze ngwa ngwa.
Ma ọ bụ “feenụ ya.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ndị.”
Na Hibru, “ihe dị nsọ e ji echeta ya.”