Ozi Ọma Jọn Dere 2:1-25

  • Agbamakwụkwọ na Kena; mmiri ghọrọ mmanya (1-12)

  • Jizọs mere ka ụlọ nsọ dị ọcha (13-22)

  • Jizọs ma ihe dị mmadụ n’obi (23-25)

2  N’ụbọchị nke atọ, e nwere oriri alụmdi na nwunye na Kena nke dị na Galili, nne Jizọs nọkwa n’ebe ahụ.  A kpọkwara Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya ka ha bịa oriri alụmdi na nwunye ahụ.  Mgbe mmanya gwụwara, nne Jizọs sịrị ya: “Ha enweghị mmanya.”  Ma Jizọs sịrị ya: “Nwaanyị, olee otú o si gbasa mụ na gị?* Oge m erubeghị.”  Nne ya wee sị ndị na-eje ozi: “Meenụ ihe ọ bụla ọ gwara unu.”  E nwere ite nkume isii e ji agbanye mmiri a dọsara n’ebe ahụ n’ihi iwu ndị Juu tiri banyere ịdị ọcha.+ Nke ọ bụla n’ime ha ga-abali ihe dị ka lita mmiri iri anọ na anọ ma ọ bụ lita iri isii na isii.*  Jizọs sịrị ha: “Gbajuonụ ite ndị ahụ mmiri.” Ha wee gbajuo ha n’ọnụ.  Ọ sịziri ha: “Kurunụ ya bugara onye na-ahazi oriri a.” Ha wee kuru ya bugara ya.  Mgbe onye na-ahazi oriri ahụ detụrụ mmiri ahụ e mere ka ọ ghọọ mmanya ọnụ, ebe ọ na-amaghị ebe o si (ọ bụ eziokwu na ndị na-eje ozi bụ́ ndị kupụtara mmiri ahụ ma), ọ kpọrọ nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ, 10  sị ya: “Ndị ọzọ na-ebu ụzọ ebupụta mmanya dị mma. Mgbe mmanya gbuwere ndị mmadụ, e bupụtazie nke na-adịchaghị mma. Ma, ị hapụrụ mmanya dị mma ruo ugbu a.” 11  Jizọs mere ihe a na Kena nke dị na Galili. Ọ bụ ya bụ ọrụ ebube mbụ ọ rụrụ.* O si otú a mee ka ebube ya pụta ìhè.+ Ndị na-eso ụzọ ya wee nwee okwukwe n’ebe ọ nọ. 12  Mgbe e mechara, ya na nne ya na ụmụnne ya ndị nwoke+ na ndị na-eso ụzọ ya gbadara Kapaniọm.+ Ma ha anọghị ọtụtụ ụbọchị n’ebe ahụ. 13  Ememme Ngabiga+ ndị Juu ruwere nso, Jizọs wee gbagoo Jeruselem. 14  Ọ hụrụ ndị nọ n’ụlọ nsọ na-ere ehi na atụrụ na nduru,+ nakwa ndị na-agbanwe ego ka ha nọ n’oche ha. 15  O ji ụdọ mere ụtarị wee jiri ya chụpụ ndị niile chị atụrụ na ehi bịa n’ụlọ nsọ. Ọ wụfukwara mkpụrụ ego ndị na-agbanwe ego ma kpuo tebụl ha ihu.+ 16  Ọ sịrị ndị ahụ na-ere nduru: “Wepụsịanụ ihe ndị a ebe a! Kwụsịnụ ime ka ụlọ Nna m bụrụ ụlọ ahịa!”+ 17  Ndị na-eso ụzọ ya wee cheta na e dere, sị: “Ihe gbasara ụlọ gị ga na-anụ m ọkụ n’obi.”+ 18  N’ihi ya, ndị Juu sịrị ya: “Olee ihe àmà ị ga-emere anyị+ iji gosi na i nwere ikike ime ihe ndị a ị na-eme?” 19  Jizọs zara ha, sị: “Kụtuonụ ụlọ nsọ a. M ga-arụ ya n’ụbọchị atọ.”+ 20  Ndị Juu ahụ wee sị ya: “E ji afọ iri anọ na isii rụọ ụlọ nsọ a. Ị̀ ga-arụ ya n’ụbọchị atọ?” 21  Ma ụlọ nsọ ọ na-ekwu bụ ahụ́ ya.+ 22  Mgbe a kpọlitere ya n’ọnwụ, ndị na-eso ụzọ ya chetara na ọ na-ekwu ihe a.+ Ha wee kwere ihe e kwuru n’Akwụkwọ Nsọ nakwa ihe Jizọs kwuru. 23  Ma, mgbe ọ nọ na Jeruselem n’oge Ememme Ngabiga, ọtụtụ ndị nwere okwukwe n’aha ya mgbe ha hụrụ ihe àmà ndị ọ na-eme. 24  Ma Jizọs atụkwasịchaghị ha obi n’ihi na ọ ghọtara ha niile, 25  ọ dịghịkwa ya mkpa ka onye ọ bụla kọwaara ya ihe ọ bụla banyere mmadụ, n’ihi na ọ ma ihe dị mmadụ n’obi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ihe a bụ akpaala okwu n’asụsụ Arameik. Ọ na-egosi na mmadụ achọghị ime ihe a gwara ya mee. Na Jizọs kpọrọ nne ya “nwaanyị” apụtaghị na ọ na-akparị ya.
Ihe dị ka galọn 12 ruo galọn 17. Gụọ Nkọwa Okwu. O nwere ike ịbụ na mmiri nwere ike ịba n’ite nke ọ bụla bụ bat abụọ ma ọ bụ atọ. Otu bat bụ lita 22 (galọn 5.81). Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Grik, “ihe àmà mbụ o mere.”