Levitikọs 11:1-47

  • Anụmanụ ndị dị ọcha na ndị na-adịghị ọcha (1-47)

11  Jehova wee gwa Mosis na Erọn, sị:  “Gwanụ ndị Izrel, sị, ‘Ihe a bụ anụmanụ ndị unu nwere ike iri+ n’ime anụmanụ ndị na-agagharị n’ala:  Unu nwere ike iri anụmanụ ọ bụla na-atagharị ọnụ, nke ọbụ ụkwụ ya kebiri abụọ, gbawaakwa n’etiti.  “‘Ma unu agaghị eri anụmanụ ndị a n’ime anụmanụ ndị na-atagharị ọnụ ma ọ bụ ndị ọbụ ụkwụ ha kebiri abụọ: kamel bụ́ anụ na-atagharị ọnụ ma ọbụ ụkwụ ya ekebighị abụọ. Ọ bụụrụ unu anụ na-adịghị ọcha.+  Unu erikwala ewi nkume+ n’ihi na ọ na-atagharị ọnụ ma ọbụ ụkwụ ya ekebighị abụọ. Ọ bụụrụ unu anụ na-adịghị ọcha.  Unu erikwala ùrúrù* n’ihi na ọ na-atagharị ọnụ ma ọbụ ụkwụ ya ekebighị abụọ. Ọ bụụrụ unu anụ na-adịghị ọcha.  Unu erikwala ézì+ n’ihi na ọbụ ụkwụ ya kebiri abụọ, gbawaakwa n’etiti, ma ọ naghị atagharị ọnụ. Ọ bụụrụ unu anụ na-adịghị ọcha.  Unu erila anụ ha ọ bụla. Unu emetụkwala ozu ha aka. Ha bụụrụ unu ihe na-adịghị ọcha.+  “‘Ihe a bụ ihe ndị unu nwere ike iri n’ime ihe ndị bi na mmiri: Unu nwere ike iri+ ihe ọ bụla nwere nku* na akpịrịkpa, ma ò bi n’oké osimiri ma ò bi n’iyi. 10  Ma ihe ọ bụla na-enweghị nku* na akpịrịkpa nke bi n’oké osimiri nakwa n’iyi n’ime obere ụmụ anụmanụ* niile nakwa n’ime ihe* ọ bụla ọzọ bi na mmiri, unu ga na-asọ ya oyi. 11  Unu ga na-asọ ha oyi. Unu erikwala anụ ha ọ bụla.+ Unu ga na-asọkwa ozu ha oyi. 12  Unu ga na-asọ ihe ọ bụla bi na mmiri nke na-enweghị nku* na akpịrịkpa oyi. 13  “Unu ga na-asọ anụ ndị a na-efe efe oyi, e kwesịghịkwa iri ha eri: ugo,+ ugo na-eri azụ̀, udele ojii,+ 14  égbé uhie na ụdị égbé ojii ọ bụla, 15  ụdị ugoloọma ọ bụla, 16  enyí nnụnụ, ikwiikwii, nnụnụ mmiri, ụdị agụ nkwọ ọ bụla, 17  ikwiikwii nta, nnụnụ mmiri a na-akpọ kọmọrant, ikwiikwii ntị ogologo, 18  ọbọgwụ mmiri, okwolo, udele, 19  ụgbala ọcha,* ụdị ụgbala mmiri ọ bụla, nnụnụ a na-akpọ huupu, na ụsụ. 20  Obere ụmụ anụmanụ* ọ bụla nwere nku bụ́ ndị na-eji ụkwụ anọ ha agagharị, unu ga na-asọ ha oyi. 21  “‘N’ime obere ụmụ anụmanụ* nwere nku bụ́ ndị na-eji ụkwụ anọ ha agagharị, unu nwere ike iri naanị ndị nke nwekwara ụkwụ ogologo abụọ ọzọ ha ji esi n’ala amali. 22  Unu nwere ike iri ndị a: ụdị igurube dị iche iche na-esi otu ebe efere n’ìgwè gaa ebe ọzọ, igurube ndị ọzọ a na-eri eri,+ mbụzụ,* na ụkpara. 23  Obere ụmụ anụmanụ niile ọzọ nwere nku, nweekwa ụkwụ anọ, unu ga na-asọ ha oyi. 24  Ihe ndị a ga-eme ka unu ghara ịdị ọcha. Onye ọ bụla metụrụ ozu ha aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.+ 25  Onye ọ bụla tụtụụrụ nke ọ bụla nwụrụ anwụ n’ime ha kwesịrị ịsụ uwe ya.+ Ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede. 26  “‘Anụmanụ ọ bụla ọbụ ụkwụ ya kebiri abụọ ma ọ gbawaghị agbawa n’etiti, ọ naghịkwa atagharị ọnụ, ọ bụụrụ unu anụ na-adịghị ọcha. Onye ọ bụla metụrụ nke ọ bụla n’ime ha aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha.+ 27  Anụmanụ ọ bụla ji ọbụ ụkwụ na ọbụ aka ya eje ije n’ime anụmanụ ndị na-eji ụkwụ anọ agagharị bụụrụ unu anụ na-adịghị ọcha. Onye ọ bụla metụrụ ozu ha aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede. 28  Onye ọ bụla buuru ozu ha kwesịrị ịsụ uwe ya.+ Ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.+ Ha bụụrụ unu anụ na-adịghị ọcha. 29  “‘N’ime obere ụmụ anụmanụ* ndị na-agagharị n’ala, ndị a ga-abụrụ unu anụ na-adịghị ọcha: nkapị, òké,+ ụdị ngwere ọ bụla, 30  agụ ụlọ,* nnukwu ngwere ndị yiri agụ iyi, ngwere mmiri, ngwere ájá, na ogwumagala. 31  Obere ụmụ anụmanụ ndị a ga-abụrụ unu anụ na-adịghị ọcha.+ Onye ọ bụla metụrụ ozu ha aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.+ 32  “‘Ihe ọ bụla ozu ha dasara ga-abụ ihe na-adịghị ọcha, ma ọ̀ bụ arịa osisi, uwe, akpụkpọ anụ, ma ọ̀ bụ ákwà iru uju. Ụdị arịa ọ bụla e ji eme ihe nke ozu ha dasara, a ga-etinye ya n’ime mmiri. Ọ ga-abụkwa ihe na-adịghị ọcha ruo mgbede. E mechaa, ọ ga-adị ọcha. 33  Ọ bụrụ na ha dabara n’ite ụrọ, unu ga-akụri ya. Ihe ọ bụla dị n’ite ahụ ga-abụ ihe na-adịghị ọcha.+ 34  Nri ọ bụla nke mmiri dị n’ite ahụ wụsara ga-abụ ihe na-adịghị ọcha. Ihe ọ bụla a na-aṅụ aṅụ dị n’ite ahụ ga-abụkwa ihe na-adịghị ọcha. 35  Ihe ọ bụla ozu ha dasara ga-abụ ihe na-adịghị ọcha. Ma ọ̀ bụ nnukwu ekwú ma ọ̀ bụ obere ekwú, a ga-akụri ya. Ha bụ ihe na-adịghị ọcha. Ha ga na-abụkwara unu ihe na-adịghị ọcha. 36  Ma ọ bụrụ na ha adanye n’iyi ma ọ bụ n’olulu mmiri, iyi ahụ na olulu mmiri ahụ ka ga-adị ọcha, ma onye ọ bụla metụrụ ozu ha aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha. 37  Ọ bụrụ na ozu ha adaa n’elu mkpụrụ ọ bụla a ka ga-akụ akụ, mkpụrụ ahụ dị ọcha. 38  Ma ọ bụrụ na a wụsara mmiri ná mkpụrụ, ya enwee otú ozu ha si dasa na ya, mkpụrụ ahụ ga-abụrụ unu ihe na-adịghị ọcha. 39  “‘Ọ bụrụ na anụmanụ unu na-eri eri anwụọ, onye ọ bụla metụrụ ozu ya aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.+ 40  Onye ọ bụla riri ihe ọ bụla n’anụ ahụ nwụrụ anwụ kwesịrị ịsụ uwe ya. Ọ ga-abụkwa onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.+ Onye bupụrụ ozu ya kwesịrị ịsụ uwe ya. Ọ ga-abụkwa onye na-adịghị ọcha ruo mgbede. 41  Unu ga na-asọ obere anụmanụ* ọ bụla na-adịghị ọcha na-agagharị n’ala oyi.+ A gaghị eri ya eri. 42  Unu erila anụ ọ bụla na-akpụ afọ n’ala ma ọ bụ obere anụmanụ* ọ bụla na-eji ụkwụ anọ agagharị ma ọ bụ obere anụmanụ ọ bụla nwere ọtụtụ ụkwụ, n’ihi na ha bụ ihe a na-asọ oyi.+ 43  Unu ekwela ka nke ọ bụla n’ime obere ụmụ anụmanụ* mee ka unu* bụrụ ndị a na-asọ oyi. Unu ejikwala ha merụọ onwe unu, ha ewee mee ka unu bụrụ ndị na-adịghị ọcha.+ 44  N’ihi na abụ m Jehova bụ́ Chineke unu,+ unu ga-edokwa onwe unu nsọ ma dị nsọ+ n’ihi na adị m nsọ.+ Unu ejila obere anụmanụ* ọ bụla na-agagharị n’ala mee onwe unu ka unu ghara ịdị ọcha. 45  N’ihi na abụ m Jehova, onye dupụtara unu n’Ijipt, iji gosi na m bụ Chineke unu.+ Unu ga-adị nsọ,+ n’ihi na adị m nsọ.+ 46  “‘Ihe a bụ iwu banyere anụmanụ, anụ ndị na-efe efe, ihe ọ bụla na-agagharị na mmiri, nakwa banyere obere anụmanụ* ọ bụla na-agagharị n’ala, 47  ka e wee mee ka e nwee ihe dị iche n’ihe na-adịghị ọcha na ihe dị ọcha nakwa n’anụ ndị e nwere ike iri eri na ndị a na-agaghị eri eri.’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Anụmanụ a yiri òké bekee, ma ntị ya na ụkwụ ya na-adị ogologo karịa nke òké bekee.
Ma ọ bụ “ntù.”
Ma ọ bụ “ntù.”
O nwere ike ịbụ obere ụmụ anụmanụ ndị na-ebikọ ọnụ.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “ntù.”
Ma ọ bụ “shekeleke.”
Ma ọ bụ “Ahụhụ.”
O nwere ike ịbụ obere ụmụ anụmanụ ndị na-ebikọ ọnụ.
Ma ọ bụ “abụzụ.”
O nwere ike ịbụ obere ụmụ anụmanụ ndị na-ebikọ ọnụ.
Ma ọ bụ “ncheke.”
O nwere ike ịbụ obere ụmụ anụmanụ ndị na-ebikọ ọnụ.
O nwere ike ịbụ obere ụmụ anụmanụ ndị na-ebikọ ọnụ.
O nwere ike ịbụ obere ụmụ anụmanụ ndị na-ebikọ ọnụ.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi unu.”
O nwere ike ịbụ obere ụmụ anụmanụ ndị na-ebikọ ọnụ.
O nwere ike ịbụ obere ụmụ anụmanụ ndị na-ebikọ ọnụ.