Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Hibru 2:1-18
2 Ọ bụ ya mere anyị ji kwesị ichebara ihe ndị anyị nụrụ echiche karịa otú anyị na-eme,+ ka a ghara inwe mgbe anyị ga-akpafu.+
2 N’ihi na ọ bụrụ na okwu e si n’ọnụ ndị mmụọ ozi+ kwuo mezuru, ọ bụrụkwa na a tara onye ọ bụla dara iwu na onye ọ bụla nupụrụ isi ahụhụ kwesịrị ya,+
3 olee otú a ga-esi ghara ịta anyị ahụhụ ma ọ bụrụ na anyị leghaara nnukwu ihe Chineke mere ka e wee zọpụta anyị anya?+ Ọ bụ Onyenwe anyị malitere ikwu banyere nnukwu ihe a.+ Ndị nụrụ ihe o kwuru gbakwara akaebe na ọ bụ eziokwu.
4 Chineke sokwa gbaa àmà. O ji ihe àmà na ihe ịtụnanya na ọrụ ebube dị iche iche+ nakwa mmụọ nsọ ya o nyere ndị na-ejere ya ozi otú o si chọọ gbaa àmà a.+
5 N’ihi na ọ bụghị ndị mmụọ ozi ka o mere ka ha bụrụ ndị ga-achị ụwa* nke ga-abịa,+ nke anyị na-ekwu banyere ya.
6 Ma otu onye gbara àmà n’otu ebe, sị: “Gịnị ka mmadụ bụ nke mere i ji na-echeta ya? Ma ọ bụ, gịnị ka nwa nke mmadụ bụ nke mere i ji na-elekọta ya?+
7 I mere ka ndị mmụọ ozi katụ ya. I ji ebube na nsọpụrụ chọọ ya mma, meekwa ka o lekọtawa ọrụ aka gị.
8 I mere ka ihe niile dịrị n’okpuru ya.”+ Ebe ọ bụ na Chineke mere ka ihe niile dịrị n’okpuru ya,+ e nweghị ihe ọ bụla ọ na-emeghị ka ọ dịrị n’okpuru ya.+ Ma, anyị ahụwabeghị ka Jizọs na-achị ihe niile.+
9 Ma anyị na-ahụ Jizọs, onye e mere ka ndị mmụọ ozi kara,+ ka e ji ebube na nsọpụrụ chọọ ya mma maka na ọ nwụrụ.+ N’ihi amara Chineke, ọ nwụrụ maka mmadụ niile.+
10 Onye ahụ ihe niile dị n’ihi ya, onye ihe niile sikwa n’aka ya dịrị, nọ na-eme ka ọtụtụ ụmụ ya dị ebube.+ N’ihi ya, o kwesịrị ekwesị na o mere ka Nnukwu Onye Ndú e si n’aka ya zọpụta ha+ taa ahụhụ, ka ahụhụ ọ tara wee mee ka o zuo okè.+
11 N’ihi na ma onye mere ka ha dị nsọ ma ndị e mere ka ha dị nsọ+ sicha n’otu onye.+ N’ihi ya, ihere anaghị eme ya ịkpọ ha ụmụnna ya,+
12 otú o kwuru, sị: “M ga-akọsara ụmụnna m aha gị. M ga-eji abụ too gị n’ime ọgbakọ.”+
13 O kwukwara, sị: “M ga-atụkwasị ya obi.”+ Ọ sịkwara: “Leenụ mụ na ụmụaka Jehova* nyere m.”+
14 N’ihi ya, ebe ọ bụ na “ụmụaka” ahụ bụ ụmụ mmadụ ndị nwere anụ ahụ́ na ọbara, ọ ghọkwara mmadụ nke nwere anụ ahụ́ na ọbara,+ ka o wee si n’ọnwụ ya bibie Ekwensu,+ onye nwere ikike ịkpata ọnwụ+
15 nakwa ka o wee tọhapụ ndị niile egwu ọnwụ mere ka ha bụrụ ndị ohu ná ndụ ha niile.+
16 N’ihi na ọ bụghị ndị mmụọ ozi ka ọ na-enyere aka n’eziokwu, kama ọ bụ ụmụ* Ebreham+ ka ọ na-enyere aka.
17 Ọ bụ ya mere o ji dị ka “ụmụnna” ya n’ụzọ niile,+ ka o wee bụrụ nnukwu onye nchụàjà dị obi ebere, onye a tụkwasịkwara obi n’ozi ọ na-ejere Chineke, nakwa ka o wee chụọ àjà+ maka mmehie ụmụ mmadụ nke ga-eme ka ha na Chineke dị n’udo.+
18 Ebe ọ bụ na ọ tara ahụhụ mgbe a na-anwa ya ọnwụnwa,+ ọ ga-enyeliri ndị a na-anwa ọnwụnwa aka.+