Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Hibru 4:1-16
4 N’ihi ya, ebe ọ bụ na Chineke kwuru na anyị ka nwere ike iso ya zuo ike, ka anyị lezie anya* ka a ghara inwe onye ọ bụla n’ime anyị na-agaghị eru eru iso zuo ike ahụ.+
2 N’ihi na e zikwara anyị ozi ọma+ otú e ziri ha. Ma okwu ha nụrụ abaraghị ha uru n’ihi na ha enweghị ụdị okwukwe ndị rubere isi nwere.
3 N’ihi na anyị ndị nwere okwukwe so na-ezu ike. Ma o kwuru banyere ndị nupụrụ isi, sị: “M wee jiri iwe ṅụọ iyi, sị, ‘Ha agaghị eso m zuo ike,’”+ n’agbanyeghị na ọ na-ezu ike kemgbe a tọrọ ntọala ụwa, mgbe ọ rụchara ọrụ ya.+
4 N’ihi na e kwuru n’otu ebe n’Akwụkwọ Nsọ banyere ụbọchị nke asaa, sị: “Chineke zuru ike n’ụbọchị nke asaa mgbe ọ rụchara ọrụ ya niile.”+
5 O kwukwara ọzọ, sị: “Ha agaghị eso m zuo ike.”+
6 Ndị e bu ụzọ zie ozi ọma ahụ esoghị ya zuo ike maka na ha nupụrụ isi.+ Ma, ụfọdụ ndị ka nwere ike iso ya zuo ike.
7 N’ihi ya, mgbe ogologo oge gachara, Chineke kwuru n’abụ ọma Devid otú e kwuburu ya, sị, “Taa, ọ bụrụ na unu egee ntị n’olu ya, unu akpọchila obi unu.”+ O si otú a wepụtaghachi ụbọchị a kpọrọ “Taa.”
8 N’ihi na ọ bụrụ na Joshụa+ du ha gaa n’ebe ha so Chineke zuo ike, Chineke agaraghị emecha kwuo banyere ụbọchị izu ike ọzọ.
9 N’ihi ya, a ka nwere ụbọchị izu ike dịịrị ndị Chineke.+
10 N’ihi na onye so Chineke ezu ike ezuokwala ike n’ọrụ nke ya otú Chineke zuru n’ọrụ ya.+
11 N’ihi ya, ka anyị gbalịsie ike ka anyị soro ya zuo ike ahụ, ka e wee ghara inwe onye ga-enupụ isi otú ha nupụrụ.+
12 N’ihi na okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike.+ Ọ dịkwa nkọ karịa mma agha ọ bụla nwere ihu abụọ.+ Ọ na-amabadị n’ime ime wee kewaa mkpụrụ obi* na mmụọ,* na-ekewakwa nkwonkwo na ụmị ha. O nwekwara ike ịchọpụta ihe mmadụ na-eche na ihe mmadụ bu n’obi.
13 E nweghịkwa ihe e kere eke e zoro ezo n’anya ya,+ kama ihe niile gba ọtọ, gherekwa oghe n’anya onye ahụ anyị ga-aza ajụjụ.+
14 N’ihi ya, ebe anyị nwere nnukwu onye nchụàjà kachanụ nke banyere n’eluigwe, ya bụ, Jizọs Ọkpara Chineke,+ ka anyị na-ekwusa banyere okwukwe anyị nwere na ya.+
15 N’ihi na nnukwu onye nchụàjà anyị nwere abụghị onye na-agaghị aghọtali* na anyị adịghị ike,+ kama a nwalere ya n’ụzọ niile otú e si anwale anyịnwa, ma o mehieghị.+
16 N’ihi ya, ka anyị bịa nso n’ocheeze Chineke onye na-eme amara ma jiri obi ike na-ekpe ekpere,+ ka e wee meere anyị ebere, anyị enwetakwa amara ya n’oge anyị chọrọ ka e nyere anyị aka.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Grik, “tụọ egwu.”
^ Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Ma ọ bụ “na-agaghị emetere anyị ebere.”