Akwụkwọ Ozi E Degaara Taịtọs 2:1-15
2 Ma gịnwa, nọgide na-akụzi ihe dabara n’ozizi dị mma.*+
2 Ka ndị agadi nwoke na-emeru ihe n’ókè, na-eji ihe akpọrọ ihe, na-ele ihe anya otú dị mma, nwee okwukwe siri ike, na-ahụ ndị ọzọ n’anya, na-atachi obi.
3 Ka ndị agadi nwaanyị na-akpa àgwà gosiri na ha na-asọpụrụ Chineke, ghara ịna-ekwutọ ndị ọzọ, ghara ịna-aṅụ oké mmanya, ka ha na-akụzi ihe dị mma,
4 ka ha wee na-adụ ụmụ nwaanyị na-akatabeghị ahụ́ ọdụ* ka ha hụ di ha n’anya, ka ha hụ ụmụ ha n’anya,
5 ka ha na-ele ihe anya otú dị mma, dị ọcha, na-arụ ọrụ n’ụlọ,* bụrụ ndị ezigbo mmadụ, ndị na-erubere di ha isi,+ ka a ghara ịkatọ okwu Chineke.
6 Na-adụkwa ụmụ okorobịa ọdụ ka ha na-ele ihe anya otú dị mma.+
7 N’ihe niile, na-arụ ọrụ dị mma otú ndị ọzọ ga na-esi n’aka gị amụta ihe. Na-akụzi ihe bụ́ eziokwu* otú na-egosi na i ji ihe kpọrọ ihe,+
8 na-ekwu okwu dị mma* nke a na-enweghị ike ịkatọ akatọ,+ ka ihere wee mee ndị na-emegide anyị, ebe ọ bụ na e nweghị ihe ọjọọ ha ga-ekwu banyere anyị.+
9 Ka ndị ohu na-erubere ndị nwe ha isi n’ihe niile,+ na-agbalị ka ha na-eme ihe dị ndị nwe ha mma, ghara ịna-asa ha okwu,
10 ghara ịna-ezu ha ohi.+ Kama ka ha na-egosi na ha bụ ndị e kwesịrị ịtụkwasị obi n’ihe niile, ka ha wee na-achọ ozizi Onye Nzọpụta anyị, bụ́ Chineke, mma n’ihe niile.+
11 N’ihi na e meela ka amara Chineke pụta ìhè, nke na-eme ka a zọpụta ụdị mmadụ niile.+
12 Amara a na-akụziri anyị ka anyị ghara ịna-akpa àgwà na-adịghị Chineke mma, gharakwa ikwe ka ihe ọjọọ ndị dị n’ụwa na-agụ anyị agụụ.+ Ọ na-akụzikwara anyị ka anyị na-ebi ndụ otú gosiri na anyị na-ele ihe anya otú dị mma, na-eme ezi omume ma na-efe Chineke otú ọ chọrọ n’oge a.*+
13 Ka ọ dị ugbu a, anyị na-eche ka ihe na-eme obi ụtọ anyị na-atụ anya ya mezuo,+ na-echekwa mgbe Chineke ukwu na Onye Nzọpụta anyị, bụ́ Jizọs Kraịst, ga-eme ka ebube ha pụta ìhè.
14 Kraịst nyere ndụ ya n’ihi anyị+ ka ọ tọhapụ anyị*+ ka anyị ghara ịna-eme ụdị ihe ọ bụla bụ́ imebi iwu nakwa ka ọ sachaara onwe ya ndị pụrụ iche bụ́ ndị nke ya, ndị ji ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ọrụ dị mma.+
15 Na-akụzi ihe ndị a, na-adụkwa ndị ọzọ ọdụ* ma na-adọ ha aka ná ntị ebe ọ bụ na i nwere ikike zuru ezu ime ihe ndị a.+ Ekwela ka onye ọ bụla leda gị anya.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “bara uru.”
^ Ma ọ bụ “na-echetara ha; na-azụ ha.”
^ Ma ọ bụ “na-elekọta ụlọ ha.”
^ O nwere ike ịbụ, “Jiri obi dị ọcha na-akụzi ihe.”
^ Ma ọ bụ “bara uru.”
^ Gụọ Nkọwa Okwu, “Oge a.”
^ Na Grik, “gbapụta anyị; napụta anyị.”
^ Ma ọ bụ “na-agbakwa ndị ọzọ ume.”