Ilu 21:1-31
21 Obi eze dị ka iyi n’aka Jehova.+
Ọ na-eme ka ọ gaa ebe ọ bụla ọ chọrọ.+
2 Ihe niile mmadụ na-eme na-adị mma n’anya ya,*+Ma Jehova na-enyocha obi.*+
3 Ime ihe dị mma na ihe ziri eziNa-amasị Jehova karịa ịchụ àjà.+
4 Mpako na nganga*Dị ka ọkụ* ndị ajọ omume ji ahụ ụzọ, ha bụkwa mmehie.+
5 Atụmatụ onye na-arụsi ọrụ ike ga-eme ka ihe gaziere ya,*+Ma ndị niile ọ na-adị ngwa ngwa na-ada ogbenye.+
6 Akụ̀ a ghara ụgha kpataDị ka alụlụụ na-anaghị anọte aka, dịrịkwa ka ọnyà nke nwere ike igbu mmadụ.*+
7 Ike ndị ajọ omume na-akpa ga-ala ha n’iyi,+Maka na ha jụrụ ime ihe ziri ezi.
8 Ihe onye ikpe mara na-eme rụrụ arụ,Ma onye aka ya dị ọcha na-eme ihe ziri ezi.+
9 Ọ ka mma na mmadụ gara biri n’otu akụkụ elu ụlọKama ya na nwaanyị na-esekarị okwu ibi n’otu ụlọ.+
10 Ihe ọjọọ na-agụsi onye ajọ omume agụụ ike.+
Ọ naghị emetere onye agbata obi ya ebere.+
11 A taa onye na-akwa emo ahụhụ, onye na-amaghị ihe amara ihe.
Onye ma ihe ghọtakwuo ihe, ọ na-amụta ihe.*+
12 Chineke bụ́ Onye Ezi Omume na-ahụ ụlọ onye ajọ omume.
Ọ na-eme ka ọdachi dakwasị ndị ajọ omume.+
13 Onye ọ bụla nke na-emechi ntị ya ka ọ ghara ịnụ ákwá onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya na-ebeGa-akpọ òkù ma a gaghị aza ya.+
14 Onyinye a naara na nzuzo na-eme ka iwe dajụọ,+Aka azụ a naara na nzuzo na-emekwa ka ọnụma dajụọ.
15 Ime ihe ziri ezi na-eme onye ezi omume obi ụtọ,+Ma ndị ajọ omume kpọrọ ihe ziri ezi asị.
16 Onye ọ bụla nke kwụsịrị ịghọta iheGa-anwụ.+
17 Onye oriri na nkwari na-amasịkarị ga-ada ogbenye.+
Onye na-anaghị eji anya ahụ mmanya na mmanụ agaghị aba ọgaranya.
18 A na-eji onye ajọ omume agbapụta onye ezi omume,A ga-akpụrụkwa onye aghụghọ kama ịkpụrụ onye ezi omume.+
19 Ọ ka mma na mmadụ bi n’ala ịkpaKama ya na nwaanyị na-esekarị okwu, nke na-ewekwa iwe ọsọ ọsọ, ga-ebi.+
20 Akụ̀ dị oké ọnụ na mmanụ na-adị n’ụlọ onye ma ihe,+Ma onye nzuzu ga-emefucha* ihe o nwere.+
21 Onye na-agbalị ime ezi omume ma na-ahụ ndị ọzọ n’anyaGa-adị ndụ. Ọ ga-abụ onye ezi omume, a ga na-akwanyekwara ya ùgwù.+
22 Onye ma ihe nwere ike ịrị mgbidi obodo ndị dikeMa bata n’obodo ha kwatuo ebe a rụsiri ike nke ha tụkwasịrị obi.+
23 Onye na-eche ọnụ ya na ire ya ncheNa-agbara nsogbu ọsọ.+
24 A na-asị na mmadụ dị mpako nakwa na ọ na-etu ọnụMa ọ bụrụ na ọ naghị eche echiche eme ihe maka na onwe ya na-ebu ya isi.+
25 Ihe na-agụ onye umengwụ agụụ ga-egbu yaN’ihi na ọ chọghị ịrụ ọrụ.+
26 Anyaukwu na-eme ka ihe ọ na-eche mgbe niile bụrụ ihe ọ ga-enwetakwu,Ma onye ezi omume na-enye ndị mmadụ ihe, e nweghịkwa ihe ọ na-ajụ inye.+
27 Chineke kpọrọ àjà ndị ajọ omume asị,+Ma ya fọdụzie mgbe ha bu ihe ọjọọ n’obi na-achụ ya.*
28 Onye akaebe nke na-anaghị ekwu eziokwu ga-ala n’iyi,+Ma a ga-anabata akaebe onye na-ege ntị nke ọma gbara.
29 Ihere anaghị eme onye ajọ omume,+Ma onye ezi omume na-ahọrọ ụzọ dị mma ọ ga-eso.+
30 E nweghị amamihe ma ọ bụ nghọta ma ọ bụ ndụmọdụ ọ bụla ga-aghasali nzube Jehova.+
31 A na-akwadebe ịnyịnya maka ụbọchị agha,+Ma, ọ bụ Jehova na-azọpụta mmadụ.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ya bụ, n’anya mmadụ.
^ Ma ọ bụ “ihe mmadụ bu n’obi.”
^ Na Hibru, “Anya dị mpako na obi dị nganga.”
^ Ma ọ bụ “oriọna.”
^ Ma ọ bụ “na-abara ya uru.”
^ O nwere ike ịbụ, “Ga-abụrụ ndị ọnwụ na-agụ alụlụụ na-anaghị anọte aka.”
^ Ma ọ bụ “ọ na-ama ihe o kwesịrị ime.”
^ Na Hibru, “ga-elo.”
^ Ma ọ bụ “mgbe ha na-achụ ya, na-emekwa omume na-eme ihere.”