Ozi Ọma Luk Dere 23:1-56

  • Mgbe Jizọs nọ n’ihu Paịlet na Herọd (1-25)

  • A kwụwara Jizọs na ndị ohi abụọ n’osisi (26-43)

    • “Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs” (43)

  • Mgbe Jizọs nwụrụ (44-49)

  • Mgbe e liri Jizọs (50-56)

23  Ìgwè mmadụ ahụ niile wee bilie kpụrụ Jizọs kpụgara Paịlet.+  Ha wee malite ibo ya ebubo,+ sị: “Anyị chọpụtara na nwoke a na-eme ka ndị obodo anyị na-emegide ndị ọchịchị. Ọ na-asịkwa na e kwesịghị ịkwụ Siza ụtụ isi,+ nakwa na ya bụ Kraịst, bụ́ eze.”+  Paịlet wee jụọ ya, sị: “Ị̀ bụ Eze ndị Juu?” Ya asị: “Ọ bụ gị kwuru ya.”*+  Paịlet wee gwa ndị isi nchụàjà na ìgwè mmadụ ahụ, sị: “Ahụghị m ihe ọjọọ ọ bụla nwoke a mere.”+  Ma ha kwusiri ike, sị: “Ihe ọ na-ezi ndị mmadụ na Judia niile, malite na Galili ruo ebe a, na-eme ka ndị mmadụ na-enupụ isi.”  Mgbe Paịlet nụrụ ihe a, ọ jụrụ ma ọ̀ bụ onye Galili.  Mgbe ọ chọpụtara na o si n’ógbè Herọd+ na-achị, o zigaara ya Herọd, onye nọkwa na Jeruselem n’oge ahụ.  Mgbe Herọd hụrụ Jizọs, obi tọrọ ya ezigbo ụtọ n’ihi na ọ dịla anya ọ nọ na-achọ ịhụ ya. Ọ nụla ọtụtụ ihe gbasara ya,+ ọ nọkwa na-atụ anya ịhụ ọrụ ebube ụfọdụ ọ ga-arụ.  O wee malite ịjụ ya ọtụtụ ajụjụ, ma ọ tụpụrụghị ya ọnụ.+ 10  Ma, ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ nọ na-ebili, jiri iwe na-ebo ya ebubo. 11  Herọd na ndị agha ya kparịrị ya,+ yiwekwa ya uwe mara mma iji kwaa ya emo,+ mechazie kpụghachiri ya Paịlet. 12  Herọd na Paịlet ghọrọ enyi n’ụbọchị ahụ, n’ihi na tupu ụbọchị ahụ, ha nọ n’iro. 13  Paịlet kpọkọtaziri ndị isi nchụàjà na ndị na-achị achị na ìgwè mmadụ ahụ 14  wee sị ha: “Unu kpọtaara m nwoke a, sị na ọ na-eme ka ndị mmadụ na-enupụ isi. Ma, ajụrụ m ya ajụjụ n’ihu unu gbasara ihe unu sị na o mere. Ahụghịkwa m ihe ọjọọ ọ bụla o mere.+ 15  N’eziokwu, o nweghịkwa ihe Herọd hụrụ o mere, n’ihi na o zighachiteere anyị ya. O nweghị ihe o mere e kwesịrị iji gbuo ya. 16  N’ihi ya, m ga-apịa ya ihe+ ma hapụ ya.” 17 * —— 18  Ma ìgwè mmadụ ahụ niile tiri mkpu, sị: “Gbuo nwoke a* ma hapụrụ anyị Barabas!”+ 19  (Ihe mere e ji tụọ Barabas mkpọrọ bụ maka na o mere ka ndị mmadụ na-agba ndị ọchịchị obodo mgba okpuru, nakwa maka na o gburu mmadụ.) 20  Paịlet gwakwara ha okwu ọzọ, n’ihi na ọ chọrọ ịhapụ Jizọs.+ 21  Ha wee malite iti mkpu, na-asị: “Kwụwa ya n’osisi! Kwụwa ya n’osisi!”*+ 22  Na nke ugbo atọ ya, ọ sịrị ha: “Maka gịnị? Olee ihe ọjọọ nwoke a mere? Ahụghị m ihe ọ bụla o mere e kwesịrị iji gbuo ya. N’ihi ya, m ga-apịa ya ihe ma hapụ ya.” 23  Ha wee jiri oké olu na-ekwusi ike ka a kwụwa ya n’osisi. Olu ha nọ na-ala elu+ nke na 24  ike gwụrụ Paịlet, ya ekpebie ka e mee ihe ha chọrọ. 25  Ọ hapụrụ nwoke ahụ ha chọrọ, onye a tụrụ mkpọrọ maka na o gburu mmadụ, na-agbakwa ọchịchị mgba okpuru. Ma, o nyefere Jizọs n’aka ha ka ha mee ya ihe ha chọrọ. 26  Ma ka ha kpụ ya na-apụ, ha kwụsịrị Saịmọn, onye Saịrini, mgbe o si n’ime obodo na-abịa. Ha manyere ya ka o buru osisi ịta ahụhụ* ahụ soro Jizọs n’azụ.+ 27  E nwekwara ìgwè mmadụ na ụmụ nwaanyị ndị na-eso Jizọs n’azụ. Ụmụ nwaanyị ndị ahụ nọ na-eti aka n’obi ma na-ebere ya ákwá arịrị. 28  Jizọs tụgharịrị lee ụmụ nwaanyị ahụ anya, sị: “Ụmụ nwaanyị Jeruselem, kwụsịnụ ibere m ákwá. Bewerenụ onwe unu na ụmụ unu.+ 29  Ụbọchị na-abịa mgbe ndị mmadụ ga-asị, ‘Ụmụ nwaanyị aga, na ụmụ nwaanyị na-amụghị nwa, na ụmụ nwaanyị na-enyeghị nwa ara na-enwe obi ụtọ.’+ 30  Mgbe ahụ, ha ga-amalite ịsị ugwu ukwu, ‘Dakwasị anyị!’ sịkwa ugwu nta, ‘Kpuchie anyị!’+ 31  Ọ bụrụ na ihe ndị a na-eme mgbe osisi dị ndụ, gịnị ga-eme mgbe ọ kpọnwụrụ akpọnwụ?” 32  E dukwa ụmụ nwoke abụọ ọzọ, bụ́ ndị omekome, na-aga ka e gbuo ha na ya.+ 33  Mgbe ha rukwara ebe a na-akpọ Okpokoro Isi,+ ha kpọgidere ya na ndị omekome ahụ n’osisi, otu onye n’aka nri ya, otu onye n’aka ekpe ya.+ 34  Ma Jizọs nọ na-asị: “Nna, gbaghara ha, n’ihi na ha amaghị ihe ha na-eme.” Ha fekwaara uwe ya nza ka ha mara onye ga-achịrị nke ọ ga-achịrị.+ 35  Ìgwè mmadụ guzo na-ekiri ihe na-emenụ. Ma ndị na-achị achị nọ na-akwa ya emo, sị: “Ọ zọpụtara ndị ọzọ. Ya zọpụtanụ onwe ya, ma ọ bụrụ na ọ bụ Kraịst, Onye Chineke Họọrọ.”+ 36  Ndị agha kwakwara ya emo, bịakwa nye ya mmanya gbara ụka,+ 37  sị ya: “Ọ bụrụ na ị bụ Eze ndị Juu, zọpụta onwe gị.” 38  E dekwara ihe n’elu osisi a kpọgidere ya, sị: “Onye a bụ Eze ndị Juu.”+ 39  Otu n’ime ndị omekome ahụ a kwụwara n’elu osisi malitekwara ịkparị ya,+ sị: “Ọ̀ kwa ị sị na ị bụ Kraịst? Zọpụtanụ onwe gị, zọpụtakwa anyị.” 40  Onye nke ọzọ wee baara onye nke ahụ mba, sị ya: “Ọ̀ bụ na ị naghị atụ egwu Chineke, ebe ọ bụ na ahụhụ a tara gị ka a tara nwoke a? 41  Anyị na-ata ahụhụ ihe anyị metara. Ma, nwoke a emeghị ihe ọjọọ ọ bụla.” 42  O kwuziri, sị: “Jizọs, cheta m ma ị banye n’Alaeze gị.”+ 43  Jizọs asị ya: “N’eziokwu, ana m asị gị taa, mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.”+ 44  Ka ọ dị ugbu a, ọ bụ ihe dị ka n’awa nke isii,* ma ọchịchịrị gbara n’ala ahụ niile ruo n’awa nke itoolu,*+ 45  n’ihi na ìhè anyanwụ apụtaghị. Ákwà mgbochi nke dị n’ụlọ nsọ+ dọwakwara ụzọ abụọ.+ 46  Jizọs wee tie mkpu n’oké olu, sị: “Nna, m na-enyefe mmụọ m n’aka gị.”+ Mgbe o kwuchara ihe a, o kubiri ume.+ 47  Mgbe onyeisi ndị agha ahụ hụrụ ihe merenụ, ọ malitere ito Chineke, sị: “N’eziokwu, nwoke a bụ onye ezi omume.”+ 48  Mgbe ìgwè mmadụ ahụ zukọtara ebe ahụ hụrụ ihe niile merenụ, ha tiiri aka n’obi na-ala n’ụlọ ha. 49  Ndị niile ya na ha ma guzokwa n’ebe dịtụ anya. Ụmụ nwaanyị ndị si na Galili soro ya nọkwa ebe ahụ, ha hụkwara ihe ndị a.+ 50  Ma, e nwere otu nwoke aha ya bụ Josef, onye so ná ndị na-ekpe ikpe n’ụlọikpe kacha elu nke ndị Juu.* Ọ bụkwa ezigbo mmadụ na onye ezi omume.+ 51  (Nwoke a akwadoghị nkata ha kpara na ihe ha mere.) Ọ bụ onye Arimatia, bụ́ obodo ndị Judia. Ọ na-echekwa ka Alaeze Chineke bịa. 52  Nwoke a gakwuuru Paịlet rịọ ya ka e bunye ya ozu Jizọs. 53  O wee budata ya+ ma fụchie ya ezigbo ákwà linin, liekwa ya n’ili* e gwuru n’oké nkume,+ nke ọ na-adịbeghị onye e liri na ya. 54  Ma, ọ bụ ụbọchị e ji akwadebe maka Ụbọchị Izu Ike,*+ ọ fọkwara obere ka Ụbọchị Izu Ike+ ruo. 55  Ma ụmụ nwaanyị ndị ahụ, ndị si na Galili soro Jizọs, so gaa kirie ili* ahụ ma hụ otú e si lie ozu ya.+ 56  Ha laghachikwara ka ha kwadebe ihe na-esi ísì ọma na mmanụ na-esi ísì ọma. Ma, ha zuru ike n’Ụbọchị Izu Ike+ otú iwu kwuru.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọ bụ akpaala okwu ndị Juu nke na-egosi na mmadụ kwetara ihe e kwuru.
Gụọ A3.
Na Grik, “Kpọrọ onye a pụọ.”
Ma ọ bụ “Gbuo ya n’elu osisi! Gbuo ya n’elu osisi!”
Ya bụ, ihe dị ka n’elekere iri na abụọ nke ehihie.
Ya bụ, ihe dị ka n’elekere atọ nke ehihie.
Ma ọ bụ “na Sanhedrin.”
Ma ọ bụ “n’ili ncheta.”
Ya bụ, Fraịdee.
Ma ọ bụ “ili ncheta.”