Ozi Ọma Mak Dere 14:1-72

  • Ndị nchụàjà kpara nkata igbu Jizọs (1, 2)

  • A wụsara Jizọs mmanụ na-esi ísì ọma (3-9)

  • Judas raara Jizọs nye (10, 11)

  • Ememme Ngabiga ikpeazụ (12-21)

  • Ọ malitere Nri Anyasị Onyenwe Anyị (22-26)

  • O kwuru na Pita ga-agọnahụ ya (27-31)

  • Jizọs kpere ekpere na Getsemeni (32-42)

  • E jidere Jizọs (43-52)

  • E kpere Jizọs ikpe n’ihu ndị Sanhedrin (53-65)

  • Pita gọnahụrụ Jizọs (66-72)

14  Ọ fọrọ ụbọchị abụọ+ ka e mee Ememme Ngabiga+ na Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko.+ Ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ na-achọkwa otú ha ga-esi jiri aghụghọ jide ya ma gbuo ya.+  Ma ha nọ na-asị: “Ọ bụghị n’oge ememme a maka na ndị mmadụ nwere ike ịkpata ọgba aghara.”  Mgbe ọ nọ na-eri nri na Betani, n’ụlọ Saịmọn onye ekpenta, otu nwaanyị ji mkpọ̀ alabasta* nke mmanụ na-esi ísì ọma dị n’ime ya bịa. Mmanụ ahụ bụ ezigbo mmanụ nad,* ọ dịkwa oké ọnụ. Nwaanyị ahụ mepere mkpọ̀ mmanụ ahụ ma malite ịwụsa ya Jizọs n’isi.+  Ụfọdụ ndị wee jiri iwe gwa ibe ha, sị: “Gịnị mere e ji laa mmanụ a na-esi ísì ọma n’iyi?  N’ihi na a gaara ere mmanụ a na-esi ísì ọma ihe karịrị narị mkpụrụ ego dinarịọs* atọ (300) ma nye ya ndị ogbenye.” Ha wesara nwaanyị ahụ ezigbo iwe.*  Ma Jizọs sịrị: “Hapụnụ ya. Gịnị mere unu ji na-enye ya nsogbu? O meere m ihe ọma.+  N’ihi na unu na ndị ogbenye nọ mgbe niile,+ unu nwekwara ike imere ha ihe ọma mgbe ọ bụla unu chọrọ. Ma mụ na unu agaghị anọ mgbe niile.+  O mere ihe o nwere ike ime. O tere m mmanụ na-esi ísì ọma iji kwadebe m tupu oge a ga-eli m eruo.+  N’eziokwu, ana m asị unu na n’ebe ọ bụla a na-ekwusa ozi ọma n’ụwa niile,+ a ga na-akọ ihe nwaanyị a mere, jiri ya na-echeta ya.”+ 10  Judas Iskarịọt, otu n’ime ndịozi iri na abụọ ahụ, wee gakwuru ndị isi nchụàjà ka ha kpaa otú ọ ga-esi rara Jizọs nye n’aka ha.+ 11  Mgbe ha nụrụ ihe Judas kwuru, obi tọrọ ha ụtọ, ha ekwe nkwa inye ya ego ọlaọcha.+ N’ihi ya, ọ malitere ịchọ oge ga-adaba adaba ọ ga-eji rara ya nye. 12  N’ụbọchị mbụ nke Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko,+ mgbe a na-achụ anụ e ji eme Ememme Ngabiga n’àjà,+ ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya: “Olee ebe ị chọrọ ka anyị gaa kwadebe ka ị nọrọ rie nri Ememme Ngabiga?”+ 13  O wee zipụ mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya, sị ha: “Banyenụ n’ime obodo. Unu ga-ahụ otu nwoke bu udu mmiri. Soronụ ya.+ 14  N’ebe ọ bụla ọ banyere, sịnụ nna nwe ụlọ ahụ, ‘Onye Ozizi sịrị: “Olee ọnụ ụlọ ndị ọbịa ebe mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-anọ rie nri Ememme Ngabiga?”’ 15  Ọ ga-egosi unu nnukwu ọnụ ụlọ dị n’elu a kwadebere ma dozie. Kwadeberenụ anyị nri Ememme Ngabiga n’ebe ahụ.” 16  Ndị na-eso ụzọ ya gawara ma banye n’ime obodo ahụ. Ihe niile mekwara otú Jizọs gwara ha. Ha wee kwadebe maka Ememme Ngabiga. 17  Ná mgbede, ya na ndịozi ya iri na abụọ ahụ bịara.+ 18  Mgbe ha nọ na-eri ihe na tebụl, Jizọs sịrị: “N’eziokwu, ana m asị unu na otu onye n’ime unu, onye mụ na ya na-erikọ nri, ga-arara m nye.”+ 19  Ọ malitere iwute ha, ha ana-agwa ya n’otu n’otu, sị: “Ọ bụghị m, ka ọ̀ bụ m?” 20  Ọ sịrị ha: “Ọ bụ otu onye n’ime unu iri na abụọ, onye mụ na ya na-esurukọ achịcha n’efere.+ 21  N’ihi na Nwa nke mmadụ na-ahapụ unu, otú e dere banyere ya. Ma, onye ga-arara Nwa nke mmadụ nye ga-ata ahụhụ.+ Ọ gaara akara onye ahụ mma ma a sị na a mụghị ya amụ.”+ 22  Mgbe ha nọ na-eri ihe, o weere otu ogbe achịcha, gọzie ya, nyawaa ya, were ya nye ha, sị: “Naranụ m ya. Nke a pụtara ahụ́ m.”+ 23  O bukwaara iko, kelee Chineke, bunyekwa ha ya. Ha niile wee ṅụọ ihe dị na ya.+ 24  O wee sị ha: “Nke a pụtara ọbara m,+ bụ́ ‘ọbara ọgbụgba ndụ’+ nke a ga-awụpụ n’ihi ọtụtụ mmadụ.+ 25  N’eziokwu, ana m asị unu na agaghị m aṅụ mmanya si ná mkpụrụ vaịn ọzọ ruo ụbọchị ahụ m ga-aṅụ nke ọhụrụ n’Alaeze Chineke.” 26  N’ikpeazụ, mgbe ha bụchara abụ otuto,* ha gawara n’Ugwu Oliv.+ 27  Jizọs wee sị ha: “Unu niile ga-ahapụ m,* n’ihi na e dere, sị: ‘M ga-egbu onye ọzụzụ atụrụ,+ atụrụ ya ga-agbasasịkwa.’+ 28  Ma a kpọlitechaa m n’ọnwụ, m ga-ebu unu ụzọ gaa Galili.”+ 29  Ma Pita sịrị ya: “Ọ bụrụgodị na ndị ọzọ niile ahapụ gị,* agaghị m ahapụ gị.”+ 30  Jizọs wee sị ya: “N’eziokwu, ana m asị gị na n’abalị a, tupu oké ọkpa akwaa ugboro abụọ, ị ga-agọnahụ m ugboro atọ taa.”+ 31  Ma ọ nọ na-ekwusi ike, sị: “Ọ bụrụgodị na m ga-eso gị nwụọ, e nweghị ihe ga-eme ka m gọnahụ gị.” Ndị ọzọ malitekwara ikwu otu ihe ahụ.+ 32  Ha wee bịa n’ebe a na-akpọ Getsemeni, ya agwa ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Nọdụnụ ala ebe a ka m gaa kpee ekpere.”+ 33  Ọ kpọọrọ Pita, Jems, na Jọn gawa.+ O wee malite ichegbu onwe ya nke ukwuu. 34  Ọ sịrị ha: “Ọ na-ewutesi m ike.*+ Nọrọnụ n’ebe a, na-echenụ nche.”+ 35  Mgbe ọ gatụrụ n’ihu, o gburu ikpere n’ala malite ikpe ekpere ka oge ahụ siri ike ghara ịbịara ya, ma ọ bụrụ na o kwere omume. 36  O wee sị: “Aba,* Nna,+ ihe niile kwere omume n’ebe ị nọ. Ekwela ka m ṅụọ ihe dị n’iko a. Ma ọ bụghị ka e mee ihe m chọrọ, kama ka ihe ị chọrọ mee.”+ 37  Ọ bịaghachiri hụ ka ha na-ehi ụra. O wee sị Pita: “Saịmọn, ị̀ na-ehi ụra? Í nweghị ike ị ga-eji chee nche ruo otu awa?+ 38  Na-echenụ nche, na-ekpekwanụ ekpere mgbe niile, ka a ghara ịnwata unu.+ N’eziokwu, ọ na-agụ mmadụ ime ihe dị mma,* ma anụ ahụ́ adịghị ike.”+ 39  Ọ pụrụ ọzọ gaa kpee ekpere, kwuokwa otu ihe ahụ.+ 40  Ọ bịaghachikwara hụ ka ha na-ehi ụra, n’ihi na ụra ji ha aka ọjọọ. Ha amaghị ihe ha ga-aza ya. 41  O wee bịa nke ugboro atọ, sị ha: “N’ụdị oge dị otú a ka unu na-ehi ụra, na-ezukwa ike. O zuolanụ. Oge eruola.+ Lee, a na-arara Nwa nke mmadụ nye n’aka ndị mmehie. 42  Bilienụ ka anyị pụọ. Lee, onye ga-arara m nye abịala nso.”+ 43  Ozugbo ahụ, mgbe ọ ka kpụ okwu n’ọnụ, Judas, otu n’ime ndịozi iri na abụọ ahụ, bịarutere, ya na ìgwè mmadụ ndị ji mma agha na okpiri. Ọ bụ ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ na ndị okenye dunyere ha.+ 44  Onye ga-arara ya nye nyere ha ihe àmà ha na ya kwekọrịtara. Ọ sịrị ha: “Onye ọ bụla m susuru ọnụ, ọ bụ ya. Jidenụ ya. Kpụrụnụ ya pụọ, unu ekwekwala ka ọ gbafuo.” 45  O wee bịarute n’ebe ọ nọ, sị: “Onye Ozizi.”* O wee jiri nwayọọ susuo ya ọnụ. 46  N’ihi ya, ha jidere ya ma kpụrụ ya. 47  Ma, otu n’ime ndị guzo n’akụkụ mịịrị mma agha ya, gbuo ya ohu nnukwu onye nchụàjà, bepụ ya ntị.+ 48  Ma Jizọs sịrị ha: “Ùnu ji mma agha na okpiri bịa ijide m ka à ga-asị na unu bịara ijide onye ohi?+ 49  Mụ na unu na-anọ mgbe m na-ezi ihe n’ụlọ nsọ kwa ụbọchị,+ ma unu ejideghị m. Ma, ihe mere ihe a ji mee bụ ka ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ mezuo.”+ 50  Ha* niile hapụrụ ya gbaa ọsọ.+ 51  Ma otu nwa okorobịa nke yi naanị ezigbo uwe elu linin malitere iso ya n’azụ n’ebe na-adịchaghị anya. Ha gbalịrị ijide ya, 52  ma ọ hapụrụ uwe linin ya gbara ahụ́ ọtọ* gbalaga. 53  Ha duuru Jizọs gakwuru nnukwu onye nchụàjà.+ Ndị isi nchụàjà na ndị okenye na ndị odeakwụkwọ niile zukọkwara.+ 54  Ma Pita nọ ebe dị anya na-eso ya n’azụ, ruo na mbara èzí nnukwu onye nchụàjà ahụ. O sokwa ndị na-eje ozi n’ụlọ nọrọ ọdụ na-anya ọkụ n’otu ọkụ na-enwusi ike.+ 55  Ndị isi nchụàjà na ndị ọzọ so ná ndị Sanhedrin* nọ na-achọgharị ebubo ha ga-ebo Jizọs ka ha wee gbuo ya. Ma, e nweghị nke ha hụrụ.+ 56  N’eziokwu, ọtụtụ ndị nọ na-agbagide ya akaebe ụgha,+ ma ihe otu onye na-ekwu adabaghị n’ihe ibe ya na-ekwu. 57  Ụfọdụ ndị na-ebilikwa na-agbagide ya akaebe ụgha, sị: 58  “Anyị nụrụ ka ọ sịrị, ‘M ga-akwatu ụlọ nsọ a e ji aka rụọ. N’ime ụbọchị atọ, m ga-arụ ọzọ nke a na-ejighị aka rụọ.’”+ 59  Ma ihe ndị a ha nọ na-ekwu adabaghị n’ihe ibe ha na-ekwu. 60  Nnukwu onye nchụàjà biliziri guzoro n’ihu ha jụọ Jizọs, sị: “Ị̀ gbara nkịtị? Ị́ nụghị ebubo ndị a na-ebo gị?”+ 61  Ma ọ gbachiri nkịtị, o nweghịkwa ihe ọ bụla ọ zara.+ Nnukwu onye nchụàjà malitere ịjụ ya ọzọ, sị: “Ọ̀ bụ gị bụ Kraịst, Ọkpara nke Onye A Gọziri Agọzi?” 62  Jizọs sịrị: “Ọ bụ m. Unu ga-ahụkwa Nwa nke mmadụ+ ka ọ nọ ọdụ n’aka nri+ Chineke dị ike* ma na-abịa n’ígwé ojii nke eluigwe.”+ 63  Nnukwu onye nchụàjà wee dọwaa uwe ya ma kwuo, sị: “Ànyị ka kwesịrị ịchọwa ndị akaebe?+ 64  Unu nụrụ ka o kwuluru Chineke. Gịnị ka unu kpebiri?”* Ha niile mara ya ikpe, sị na o kwesịrị ọnwụ.+ 65  Ụfọdụ ndị malitere ịgbụ ya asọ mmiri,+ kpuchie ya ihu, suo ya ọkpọ ma sị ya: “Buo amụma.” Ndị na-eje ozi n’ụlọikpe mara ya ụra n’ihu wee kpụrụ ya pụọ.+ 66  Mgbe Pita nọ n’ala na mbara èzí, otu n’ime ụmụ agbọghọ ndị na-ejere nnukwu onye nchụàjà ozi bịara.+ 67  Mgbe ọ hụrụ Pita ka ọ na-anya ọkụ, o legidere ya anya, sị: “Gị na onye Nazaret a, bụ́ Jizọs, na-anọ.” 68  Ma ọ gọrọ agọ, sị: “Amaghị m onye ọ bụ, aghọtaghịkwa m ihe ị na-ekwu.” O wee pụọ gaa n’ebe ọnụ ụzọ ámá.* 69  Nwa agbọghọ ahụ na-eje ozi hụrụ ya n’ebe ahụ, malitekwa ịsị ndị guzo n’akụkụ: “Onye a bụ otu n’ime ha.” 70  Ọ gọrọ agọ ọzọ. Mgbe obere oge gachara, ndị guzo n’akụkụ malitere ịgwa Pita ọzọ, sị: “O doro anya na ị bụ otu n’ime ha, n’ihi na n’eziokwu, ị bụ onye Galili.” 71  Ma ọ malitere ịbụ onwe ya ọnụ na ịṅụ iyi, sị: “Amaghị m onye a unu na-ekwu okwu ya.” 72  Ozugbo ahụ, oké ọkpa kwara nke ugboro abụọ.+ Pita wee cheta na Jizọs gwara ya, sị: “Tupu oké ọkpa akwaa ugboro abụọ, ị ga-agọnahụ m ugboro atọ.”+ N’ihi ya, o jidelighị onwe ya. O wee bewe ákwá.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Gụọ B14.
Ma ọ bụ “Ha ji iwe gwa ya okwu; Ha baara ya mba.”
Ma ọ bụ “abụ ọma.”
Na Grik, “ga-ada.”
Na Grik, “adaa.”
Na Grik, “Ọ na-ewute mkpụrụ obi m nke ukwuu, ọbụna ruo ọnwụ.”
Aba bụ okwu Hibru ma ọ bụ Arameik. Ọ pụtara “Nna!”
Na Grik, “mmụọ dị njikere.”
Ma ọ bụ “Rabaị.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ya bụ, ndị na-eso ụzọ Jizọs.
Ma ọ bụ “n’enweghị ezigbo ihe o yi; yiri naanị ihe o yi n’úkwù.”
Na Grik, “n’aka nri nke ike.”
Ma ọ bụ “Gịnị ka unu chere?”
Ma ọ bụ “n’ebe e si abata na mbara èzí.”