NA-ECHENỤ NCHE!
Ebe A Na-ezirịta Ozi n’Ịntanet Ọ̀ Na-akpa Nwa Gị Aka Ọjọọ?—Otú Baịbụl Ga-esi Nyere Ndị Nne na Nna Aka
N’abalị iri na asaa n’ọnwa Jun afọ 2024, Dr. Vivek Murthy, onye bụ́ onyeisi ndị dọkịta na-awa ahụ́ n’Amerịka, kwuru n’akwụkwọ akụkọ bụ́ New York Times na ihe gbasara isi ịkpakọ ndị na-eto eto ọnụ bụzi nsogbu e kwesịrị ilebara anya ozugbo nakwa na ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet so n’ihe kacha akpata nsogbu a.
Olee otú ndị nne na nna ga-esi nyere ụmụ ha aka ka ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet ghara ịkpa ha aka ọjọọ? Baịbụl kwuru ihe ụfọdụ ga-enyere ha aka.
Ihe ndị nne na nna nwere ike ime
Chegodị gbasara ihe ndị a Baịbụl kwuru.
“Onye ma ihe na-echebara ihe ọ bụla ọ chọrọ ime echiche.”—Ilu 14:15.
Ebe ọ bụ na ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet nwere ike ịkpa nwa gị aka ọjọọ, ọ bụghị iwu na ị ga-ekwerịrị ka ọ na-aga ebe ahụ. Tupu i kwe ka nwa gị na-aga n’ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet, jide n’aka na nwa gị etoruola idebe iwu ndị i nwere ike inye gbasara ịga ebe ahụ, dị ka, awa ole ọ ga-anọ ebe ahụ, imete ezigbo ndị enyi, na izere ihe ndị na-adịghị mma.
Ị chọọ ịmatakwu gbasara ihe a, gụọ isiokwu ndị a “Should My Child Use Social Media?” nakwa “Teaching Your Teenager Social Media Safety.”
“Na-ejinụ oge unu eme ihe kacha mkpa.”—Ndị Efesọs 5:16.
I kwe ka nwa gị na-aga n’ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet, gwa ya ihe ndị ọ ga-eme na ihe ndị ọ na-agaghị eme, kọwakwaara ya otú ime ihe ndị ahụ ga-esi chebe ya. Na-eleru anya ala ka ị chọpụta mgbe nwa gị kpawara àgwà ga-egosi ma ọ̀ ka kwesịrị ịna-aga n’ebe ahụ.
Jiri vidio bụ́ Kpachara Anya n’Ebe A Na-emeta Ndị Enyi n’Ịntanet nyere nwa gị aka ịghọta ihe mere o ji kwesị ịkpachara anya.
Ihe ndị ọzọ ga-enyere gị aka
Baịbụl kwuru na oge anyị bi na ya dị “oké egwu, taakwa akpụ.” (2 Timoti 3:1-5) Ma, ọ gwakwara anyị ihe ndị nwere ike inyere anyị aka idi nsogbu ndị na-abịara anyị. Isiokwu a kwuru ihe ụfọdụ gbasara ndị na-eto eto isi na-anaghịzi akpakọcha ọnụ. E nwere isiokwu karịrị iri abụọ na ya nwere ike inyere ndị nne na nna na ụmụ ha aka.