ABỤ NKE 18
Anyị Na-ekele Chineke Maka Ihe Mgbapụta
-
1. Anyị bịara
k’anyị kelee gị, Jehova.
Ọ bụ gị kacha gosi
n’ị hụr’anyị n’anya.
I nyer’anyị Ọkpara gị
k’anyị dịn-dụ.
Ọ bụ ya bụ onyinye
kach’onyinye niile.
(UKWE)
O jin-dụ ya gbapụt’anyị.
Ọbara ya n’azọpụta.
Anyị niile
ga n’eto Jehova ru’ebigh’ebi.
-
2. Jizọs chọrọ
k’anyị nwetan-dụe-bigh’ebi.
Àjà ya gosir’anyị
n’ọ hụr’anyị n’anya.
Anyị gaar’anwụ
m’a sị n’o nyeghịn-dụ ya.
Anyị nwere olileanya
n’anyị g’adịn-dụ.
(UKWE)
O jin-dụ ya gbapụt’anyị.
Ọbara ya n’azọpụta.
Anyị niile
ga n’eto Jehova ru’ebigh’ebi.
(Gụọkwa Hib. 9:13, 14; 1 Pita 1:18, 19.)