Eprel 15-21
ABỤ ỌMA 29-31
Abụ nke 108 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)
1. Chineke Na-adọ Anyị Aka ná Ntị Maka na Ọ Hụrụ Anyị n’Anya
(Nkeji 10)
Jehova zooro Devid ihu ya mgbe Devid nupụụrụ ya isi (Ọma 30:7; it-1 802 ¶3)
Mgbe Devid chegharịrị, ọ rịọrọ Jehova ka o meere ya amara (Ọma 30:8)
Jehova anọgideghị na-ewesa Devid iwe (Ọma 30:5; w07 3/1 19 ¶1)
Ọ ga-abụ na Abụ Ọma nke 30 na-ekwu banyere ihe mere mgbe Devid gụchara ndị Izrel ọnụ.—2 Sam. 24:25.
AJỤJỤ Ị GA-ECHEBARA ECHICHE: Olee otú onye a chụrụ n’ọgbakọ ga-esi rite uru n’aka ná ntị a dọrọ ya ma gosi na o chegharịala?—w21.10 6 ¶18.
2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Nkeji 10)
Ọma 31:23—Gịnị ka Jehova na-eme ndị dị mpako? (w06 5/15 19 ¶13)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?
3. Ọgụgụ Baịbụl
(Nkeji 4) Ọma 31:1-24 (th ihe ọmụmụ nke 10)
4. Ịmalite Mkparịta Ụka
(1 nkeji) IKWUSA OZI ỌMA N’EBE NDỊ MMADỤ NA-ANỌKARỊ. Zie onye ji ọrụ n’aka ozi ọma dị nkenke. (lmd isi nke 5 nọmba nke 3)
5. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 3) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Gosi nwaanyị nwere nwa vidio e mepụtara maka ụmụaka, gosikwa ya otú ọ ga-esi enweta vidio ndị ọzọ yiri ya. (lmd isi nke 3 nọmba nke 3)
6. N’Oge Ọzọ
(Nkeji 3) IKWUSA OZI ỌMA N’EBE NDỊ MMADỤ NA-ANỌKARỊ. Gwa onye na-ekwebughị ka a mụwara ya Baịbụl ka gị na ya mụwa Baịbụl. (lmd isi nke 8 nọmba nke 3)
7. Ime Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs
(Nkeji 4) lff isi nke 14 na nọmba nke 5 (th ihe ọmụmụ nke 6)
Abụ nke 45
8. Ihe Mere Anyị Ji Nwee Okwukwe na . . . Chineke Hụrụ Anyị n’Anya
(Nkeji 7) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kpọnye VIDIO. Juzie ụmụnna ajụjụ a:
Gịnị ka akụkọ nwanna a na-akụziri anyị banyere ịhụnanya Chineke?
9. Akụkọ Si na Ngalaba Na-ahụ Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’Ụwa Niile nke Afọ 2024
(Nkeji 8) Okwu. Kpọnye VIDIO.
10. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ
(Nkeji 30) rr isi nke 8 ¶16-22