Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Pụrụ Isi Mee Ka M Dịkwuo Mma Ile Anya?

Olee Otú M Pụrụ Isi Mee Ka M Dịkwuo Mma Ile Anya?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Olee Otú M Pụrụ Isi Mee Ka M Dịkwuo Mma Ile Anya?

“Ọ naghị adịrị m mfe, ahụ́ adịghịkwa eru m ala iso ụmụ agbọghọ nwee mkparịta ụka. Amaghị m ihe ha na-eche, ihe dị ha n’obi, ma ọ bụ otú ha si ele ihe anya.”—Tyler.

OLEE àgwà ụmụ agbọghọ na-enwekarịsị mmasị na ya n’ebe ụmụ nwoke nọ? “Obi ike,” ka otu onye nọ n’afọ iri na ụma aha ya bụ Emily na-ekwu. Robyn, bụ́ onye ọzọ nọ n’afọ iri na ụma, weere ime ihe ọchị dị ka otu n’ime àgwà ndị kachasị mkpa. Oleekwanụ ihe na-amasịkarị ụmụ okorobịa n’ebe ụmụ agbọghọ nọ? N’ụzọ na-adịghị eju anya, otu nnyocha e mere gosiri na ha weere ịma mma dị ka nke kachasị mkpa. E depụtara inwekọ mmasị n’otu ihe na inwekọ otu ụkpụrụ dị ka ihe nke isii.

Ihe odide dị iche iche na nnyocha ndị na-ekwu banyere mmekọrịta ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọ bụ ihe ndị a na-ahụkarị na magazin na-ekwu maka ndị ntorobịa. O doro anya na ọtụtụ ndị na-eto eto na-echesi echiche ike—ma ọ bụ ikekwe na-enwe nchegbu—banyere otú ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ha si ele ha anya. Ma eleghị anya, nke ahụ pụrụ ịdị na-echegbu ọbụna gị onwe gị mgbe ụfọdụ. Ọ bụghị na ị dị njikere ịlụ di ma ọ bụ nwunye n’isi nso. Ọ bụ nanị na ọ dịghị onye chọrọ ịbụ onye na-adịghị mma ile anya ma ọ bụ onye na-amaghị mma! Tyler na-ekwu, sị: “Mgbe ị nọ n’afọ iri na ụma, ị na-achọ ịbụ onye mmadụ nile ga-enwe mmasị n’ebe ọ nọ. Ị chọrọ ịbụ onye ndị ọgbọ gị ga-anabata, ma ndị nwoke ma ndị nwanyị.” Ọzọ, ị pụrụ ịdị na-eche na otu ụbọchị, ị ga-achọ inweta onye òtù ọlụlụ kwesịrị ekwesị. Mgbe oge ahụ ruru, dị ka ọ na-adịkarị, ị ga-achọ ịbụ onye onye dị otú ahụ ga-enwe mmasị n’ebe ọ nọ.

Otú ọ dị, dị ka Onye Kraịst na-eto eto, ọ pụrụ ịbụ na i nwere ahụmahụ dị nta banyere iso onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị na-emekọ ihe. Tụkwasị na nke ahụ, nrụgide ndị ọgbọ gị na-amanye gị ịbụ onye mara mma. N’ihi ngosi a na-egosi ndị mara mma na-akpọsa ngwá ahịa na ndị gbara dimkpa na-eme ihe nkiri na TV nakwa na magazin, ọ bụghị ihe ijuanya na ị ga-enwe mmetụta nke enweghị obi ike nakwa nke ịbụ onye na-erughị ihe a chọrọ! Gịnịzi ka a chọrọ iji bụrụ onye ndị ọzọ na-enwe mmasị dị mma, nke kwesịrị ekwesị n’ebe ọ nọ—tinyere ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị?

Nzuzu Dị n’Ịchọ Ahụ́ Bụ́ “Ịgba”

Onye ọkà n’akparamàgwà mmadụ bụ́ William S. Pollack na-ekwu na n’ihi mmetụta nke ndị na-eme ihe ntụrụndụ na-enwe n’ahụ́ ha, ọtụtụ ndị na-eto eto “na-etinye oge buru ibu n’ịkpa ókè ná nri ha na-eri, n’inwe mmega ahụ́ site n’ibuli ihe ndị dị arọ, nakwa n’inwe mmega ahụ́ ndị ọzọ, gbanwee otú ha hà n’ibu na ọdịdị ahụ́ ha.” Ụfọdụ ọbụna na-emeru ya n’ókè dị ize ndụ, dị ka ịfọ nke nta ka ha nwụọ n’ihi ịkwụ agụụ, iji nwee ahụ́ bụ́ “ịgba.” N’agbanyeghị nke ahụ, ka Ụlọ Ọrụ Na-eme Nnyocha n’Okwu Ndị Metụtara Ọha na Eze na-ekwu: “Ọ bụ nanị ihe na-erughị pasent 5 n’ụmụ nwanyị na-enwe ike eru ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ịma mma ahụ nke usoro mgbasa ozi na-egosi dị ka nke bụ́ ịgba—ọ bụkwa nanị n’ibu ibu. Ọ bụrụ na a bịa n’inwe ọdịdị ahụ́, ihu na ihe ndị ọzọ bụ́ ịgba, o nwere ike ịbụ ihe dị ka 1 pasent.”

Okwu ndụmọdụ Bible dị ná Ndị Rom 12:2 dị irè: “Ekwela ka ụwa nke gbara gị gburugburu kpụzie gị otú o si chọọ.” (Phillips) Otú ọ dị, nke a apụtaghị na ị ga-eleghara ọdịdị gị anya. Ọ bụ nnọọ ihe ezi uche dị na ya ilezi ahụ́ gị anya site n’inwe mmega ahụ́ kwesịrị ekwesị na iri nri dị mma. (Ndị Rom 12:1; 1 Timoti 4:8) Izu ike nke ọma na ihi ụra pụkwara ime ka ị dịkwuo nnọọ mma ile anya ma nwekwuo ahụ́ ike. N’otu oge ahụ, lebara ịdị ọcha na ejiji gị anya. Otu onye ntorobịa bụ́ onye Britain aha ya bụ David na-ekwu, sị: “E nwere otu nwa agbọghọ mara nnọọ mma, ma ọ na-esi ísì. Ndị mmadụ na-agbara ya ọsọ n’ihi nke a.” Ya mere, na-asachi ahụ́ anya. Aka, ntutu, na mbọ aka dị ọcha pụrụ ime ka ị dịkwuo mma ile anya.

Ọ bụ ezie na Bible kagburu itinyebiga uche ókè n’ihe i yi, ọ na-adụ Ndị Kraịst ọdụ ka ha “jiri uwe a haziri nke ọma na-achọ onwe ha mma n’imeru ihe n’ókè na uche zuru okè.” (1 Timoti 2:9) Na-eyi uwe ndị ga-eme ka ọdịdị gị ka mma n’abụghị ụdị ndị a na-adịghị eyikebe ma ọ bụ ndị na-ekwesịghị ekwesị. * Iji ezi uche na-elebara ọdịdị gị anya pụrụ ime ka i nwekwuo obi ike. Otu onye ntorobịa aha ya bụ Paul si otú a tinye ya: “Ọ pụrụ ịbụ na ị maghị mma nke ukwuu, ma ị pụrụ imeziwanye ọdịdị gị.”

Ụdị Onye Mmadụ Bụ n’Ime

Ọ bụ ezie na ihu na ọdịdị ahụ́ mara mma pụrụ ịdị na-adọrọ mmasị nke ndị ọzọ, n’ikpeazụ “ịma mma bụ bolombolo.” (Ilu 31:30, Byington) Mma ahụ́ adịghị adịtekebe aka, n’ezie, a pụghịkwa iji ya dochie àgwà ọma nke mmadụ. (Ilu 11:22) Chetakwa na “mmadụ na-ele ihe anya na-ahụ, ma Jehova na-ele obi.” (1 Samuel 16:7) Ya mere, kama itinye uche gị nile n’otú ị ha n’ibu ma ọ bụ otú ị gbaruru dimkpa, rụọ ọrụ n’iji “mmadụ zoro ezo nke obi n’uwe na-apụghị ire ure bụ́ mmụọ dị jụụ na nke dị nwayọọ, bụ́ nke bara oké uru n’anya Chineke” chọọ onwe gị mma. (1 Pita 3:3, 4; Ndị Efesọs 4:24) N’eziokwu, n’ụwa nke taa, ọtụtụ ndị ntorobịa adịkebeghị eji àgwà ọma akpọrọ ihe—ya fọdụziekwa àgwà ime mmụọ. * Ma ndị na-ele ihe anya otú Chineke si ele ihe anya na-eji ha akpọrọ ihe, ọ na-adọrọkwa mmasị ha!

Mgbe ahụ, ụzọ kasị mma isi bụrụ onye na-adọrọ mmasị nke ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị bụ́ Ndị Kraịst, ndị ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe bụ site n’ịbụ onye jikwa ihe ime mmụọ kpọrọ ihe. Meziwanye ọnọdụ ime mmụọ gị site n’ikpe ekpere, inwe ọmụmụ Bible onwe onye, nakwa ịga nzukọ Ndị Kraịst. (Abụ Ọma 1:1-3) Ka o sina dị, e nwere nkà na àgwà ndị ọzọ bara uru ị pụrụ ịzụlite. Ọ dịghị mkpa ịdị na-eyi oge mkpapụ ma ọ bụ gị na mmadụ ịbanye ná mmekọrịta ịhụnanya tupu ị zụlite àgwà ndị a. Kama nke ahụ, ị pụrụ ịmụta ha ná mmekọrịta nke gị na ndị ọzọ kwa ụbọchị.

Dị ka ihe atụ, ị̀ na-eme ihere mgbe gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị nọ? Otu onye ntorobịa aha ya bụ Paul na-ekweta, sị: “Mgbe ụfọdụ ahụ́ adịghị eru m ala—n’ihi na ha bụ ụmụ nwanyị, amaghịkwa m ụmụ nwanyị otú m maara ụmụ nwoke. Achọghịkwa m imenye onwe m ihere.” Olee ụzọ ị pụrụ isi nweta obi ike na ahụ́ iru ala nke ga-eme ka ahụ́ ruo ndị ọzọ ala? Otu ụzọ bụ site n’iji ohere nke isoro ụdị ndị dị iche iche nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst na-akpakọrịta mee ihe. Gosi mmasị onwe onye n’ebe ndị ọzọ nọ mgbe a bịara nzukọ—ọ bụghị nanị n’ebe ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị bụ́ ndị ọgbọ gị nọ kamakwa n’ebe ụmụaka, ndị toworo eto, na ndị agadi nọ. (Ndị Filipaị 2:4) Ịmụta ụzọ isi soro ụdị mmadụ dị iche iche dị otú ahụ na-emekọ ihe nke ọma ga-enyere gị aka inwe obi ike n’onwe gị.

Otú ọ dị, kpachara anya. Jizọs sịrị: “Ị ghaghị ịhụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.” (Matiu 19:19) Ọ bụrụ na i nwere obi ike n’ebe onwe gị nọ, o yiri ka ị gaghị na-emekebe ihere mgbe gị na ndị ọzọ nọ. * Otú ọ dị, ọ bụ ezie na ọ dị mkpa inwe ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ùgwù onwe onye, i kwesịghị inwebiga ya ókè. “Ana m agwa onye ọ bụla n’etiti unu n’ebe ahụ,” ka Pọl onyeozi kwuru, “ka ọ ghara iche banyere onwe ya karịa ka ọ dị mkpa iche.”—Ndị Rom 12:3.

Ọzọkwa, jiri obi eziokwu nyochaa àgwà gị na otú gị na ndị ọzọ sị emekọ ihe. Otu nwa agbọghọ onye Britain aha ya bụ Lydia sịrị: “E nwere otu nwa okorobịa n’ụlọ akwụkwọ anyị, onye ọtụtụ ụmụ agbọghọ na-enwe mmasị n’ebe ọ nọ. Ma mgbe ha matara onye ọ bụ, ha adịghị enwekwa mmasị n’ebe ọ nọ n’ihi na o nwere àgwà ọjọọ, ọ dịghịkwa eji akọ eme ihe.” Ndị mmadụ na-enwe mmasị n’ebe onye na-eji okwu ndị na-egosi obiọma na akọ na-eme ihe nakwa onye na-echebara ndị ọzọ echiche nọ. (Ndị Efesọs 4:29, 32; 5:3, 4) “Àgwà ndị dị mma yiri akwụkwọ ikike ngafe, nke na-enye gị ohere ma mee ka i nwee ike ịgakwuru ndị mmadụ,” ka Dr. T. Berry Brazelton na-ekwu. Àgwà ọma “dị oké mkpa n’ịbụ onye ndị ọzọ ga-anabata.”

Omenala na ihe a na-ewere dị ka ezi àgwà abụghị otú ihe ahụ n’ebe nile n’ụwa. Ya mere, ị pụrụ ịchọ ịhụ otú ndị ikom na ndị inyom bụ́ Ndị Kraịst tozuru okè si na-emeso ibe ha. Dị ka ihe atụ, ọ̀ bụ omenala ná mba unu bụ nwoke imeghere nwanyị ụzọ? Ya bụrụ otú ahụ ịmụta igosipụta àgwà ọma a ga-eme ka a matakwuo gị dị ka onye ahụ́ ruru ala, nke nwere ezi àgwà.

N’ikpeazụ, ị pụrụ ịhụ na ọ na-enye aka ịzụlite omume kwesịrị ekwesị nke ime ihe ọchị. Bible na-ekwu na e nwere “mgbe ịchị ọchị,” ọ na-adịkwara onye na-eme ihe ọchị mfe ọtụtụ mgbe inweta ndị enyi.—Eklisiastis 3:1, 4.

Inwe Omume Enyi na Ime Mfegharị

Otu akwụkwọ nke sị na ya bụ “nduzi maka inwe ihe ịga nke ọma n’iyi oge mkpapụ” dụrụ ọdụ na ihe na-adọta mmasị nke onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe mmadụ bụ ime mfegharị. A gwara ndị na-agụ ya ka ha na-amụmụ ọnụ ọchị ma na-ele mmadụ anya n’anya nakwa ime ka ‘okwu mbụ ha ga-ekwu’ bụrụ nke dabara adaba. Ndụmọdụ ndị dị otú ahụ na-emegide echiche dị na ndụmọdụ Pọl nyere Timoti ka ọ na-emeso ndị na-abụghị nwoke ibe ya omume “n’ịdị ọcha nile.”—1 Timoti 5:2.

Ọ bụ ezie na ime mfegharị pụrụ ịkwalite otú mmadụ si ele onwe ya anya, ọ dịghị esite n’obi, ọ bụkwa emeghị ihe n’eziokwu. Ọ dịghị mkpa na i ga-eme mfegharị ma ọ bụ na-emetụ ihere iji nwee mkparịta ụka dị ụtọ. Ọ dịghịkwa mkpa na ị ga-ajụ ajụjụ ndị na-emenye ihere ma ọ bụ ndị na-ekwesịghị ekwesị iji mata ihe ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị na-eche. Nọgide na-ekwurịta ihe ‘bụ́ ezi omume, ihe dị ọcha, na ihe na-akpali ịhụnanya,’ ị ga-egosikwa n’ezie na ị na-aghọ nwoke ma ọ bụ nwanyị tozuru okè, onye ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe. (Ndị Filipaị 4:8) Gị irubere ụkpụrụ Chineke isi ga-eme ka ị bụrụ ọ bụghị nanị onye ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ya nwere mmasị n’ebe ọ nọ kamakwa onye Chineke n’onwe ya nwere mmasị n’ebe ọ nọ. *Ilu 1:7-9.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 Lee “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . Gịnị Bụ Isi Ihe Dị n’Ịhọrọ Uwe Kwesịrị Ekwesị?” nke pụtara ná mbipụta anyị nke March 8, 1991.

^ par. 12 Dị ka otu onye nchọpụta si kwuo, ihe ọmụmụ na-egosi na a na-amakarị ndị ntorobịa nwere ọgụgụ isi njakịrị n’ihi ikike ha. Ụfọdụ ndị ntorobịa na-emeghachi omume site n’ikwu okwu banyere ọgụgụ isi ha dị ka a ga-asị na o nweghị oké ihe ọ bụ.

^ par. 15 Isi nke 12 nke akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, nke Ndịàmà Jehova bipụtara, nwere ọtụtụ aro ndị dị irè banyere ụzọ isi zụlite ùgwù onwe onye.

^ par. 21 Ọ bụrụ na i torubeghị ogo ịlụ di ma ọ bụ nwunye, ọ bụ ihe amamihe dị na ya iso ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị na-akpakọrịta n’ìgwè. Lee isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . Gịnị Ma Ọ Bụrụ na Ndị Mụrụ M Echee na Mụ Etorubeghị Ime Mkpapụ?” nke pụtara ná mbipụta Teta! nke February 8, 2001.

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

Kama ilekwasị anya nanị n’ọdịdị gị, rụọ ọrụ iji zụlite àgwà ime mmụọ

[Foto dị na peeji nke 26]

Mụta inwe ahụ́ iru ala mgbe gị na ụdị mmadụ dị iche iche nọ