Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ebe Dị Nchebe Maka Obibi Bible

Ebe Dị Nchebe Maka Obibi Bible

Ebe Dị Nchebe Maka Obibi Bible

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA BELGIUM

Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 500 gara aga, e biri Bible ndị mbụ zuru ezu n’Antwerp, Belgium. Gịnị dọtara ndị na-ebi Bible n’obodo ahụ? N’ihe ize ndụ ndị dị aṅaa ka ha tinyere onwe ha site n’ibi Bible? Iji chọpụta, anyị aghaghị ịtụle ihe ndị mere laa azụ ná mmalite nke narị afọ nke 16.

ANTWERP dị n’ebe mmiri si asọba n’Osimiri Scheldt, nke dị kilomita 89 site n’Oké Osimiri North. Na narị afọ nke 16, n’oge ọ nọ n’ihe a sị na ọ bụ ọgbọ ọma, Antwerp nwere ọganihu akụ̀ na ụba ọ na-enwetụbeghị ụdị ya. N’eziokwu, obodo ahụ gbasawanyere ngwa ngwa ma ghọọ ọdụ ụgbọ mmiri kasị ukwuu na Europe, nakwa otu n’ime obodo ukwu ole na ole ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Europe bụ́ ndị ihe karịrị 100,000 mmadụ bi na ha.

Mmepe Antwerp mepere dọtara ndị ahịa site na Europe nile. Nke a na ọganihu ọ nọgidere na-enwe so mee ka ndị na-achị obodo ukwu ahụ nwekwuo omume ikwe ibe nọrọ, na-eme ka Antwerp ghọọ ebe a na-akwalite echiche ndị ọhụrụ. Ọnọdụ ịdị jụụ e nwere n’ebe ahụ dọtara ndị na-ebi akwụkwọ bụ́ ndị chere na ebe ahụ dị nchebe maka ibi akwụkwọ na ịgbasa echiche ndị ọhụrụ. N’oge na-adịghị anya, a bịara nwee ndị na-ebi akwụkwọ, ndị na-emepụta akwụkwọ, na ndị na-ere akwụkwọ dị mmadụ 271 n’Antwerp na narị afọ nke 16. Ndị ọchịchị n’oge ahụ ji nganga na-akọwa obodo ukwu ha dị ka “ebe mgbaba nke mba nile na ebe ụdị nkà nile, sayensị nile, na omume ọma nile na-akpọtụ akpọtụ.”

Ịkpọ Akwụkwọ na Ndị Mọnk Ọkụ

Echiche ọhụrụ Martin Luther (1483-1546) so n’ime echiche ndị e biri ma kesaa. Ọ bụ ya bụ onye ndú nke Reformation, bụ́ òtù okpukpe nke e si na ya nweta Okpukpe Protestant. Nanị ọnwa isii mgbe e guzobesịrị Reformation, akwụkwọ Luther pụtawara n’ụlọ ahịa ndị na-ere akwụkwọ n’Antwerp. Ọ bụghị ihe ijuanya na nke a amasịghị Chọọchị Katọlik. Na July 1521, chọọchị ahụ mere ka a kpọọ akwụkwọ 400, ndị ha sịrị na-akwado ịjụ okwukwe, ọkụ n’Antwerp. Afọ abụọ mgbe e mesịrị, a kpọrọ ndị mọnk Okpukpe “Senti” Augustine abụọ si Antwerp, bụ́ ndị kwenyere n’echiche Luther, ọkụ ná ndụ n’elu osisi.

Mwakpo ndị a akwụsịghị ìgwè ndị na-ebi akwụkwọ nwere obi ike nọ n’Antwerp. Obi ike nke ndị ahụ na-ebi akwụkwọ nwere, keere òkè dị oké mkpa n’ime ka Bible ruo ndị nkịtị aka. Ole ndị bụ ụfọdụ n’ime ndị ahụ na-ebi akwụkwọ?

Site n’Onye Na-ebi Akwụkwọ Gaa n’Onye Nwụrụ n’Ihi Okwukwe Ya

Adriaen van Berghen bụ onye na-ebi ma na-ere akwụkwọ. Na 1522, a kpọchiri ya n’ọtọsị n’ihi ire akwụkwọ Luther, n’oge na-adịghịkwa anya mgbe e mesịrị, a mara ya ikpe ịga mkpọrọ. A gbaghaara ya, ma ọ laghachiri n’ọrụ ya n’egbughị oge. Ọ maliteghachiri ibi akwụkwọ—n’oge a, ọ bụ akụkụ ụfọdụ nke “Agba Ọhụrụ” nke Luther sụgharịrị gaa n’asụsụ Dutch. E bipụtara ya na 1523, nanị otu afọ mgbe e bipụtasịrị na nke mbụ ya “Agba Ọhụrụ” nke Luther nke dị n’asụsụ German.

Otú ọ dị, na 1542, mgbe a hụrụ ọ̀tụ̀tụ̀ buru ibu nke akwụkwọ ndị a machibidoro iwu n’ụlọ ya dị na Delft, Netherlands, e jideghachiri Van Berghen. Na mbụ, otu ọkàikpe nyere ya obere ntaramahụhụ—ịnyara “ụfọdụ n’ime akwụkwọ ndị ahụ a machibidoro iwu n’olu” nọrọ n’elu ebe a na-egbu ndị omempụ ruo awa abụọ. Ma mgbe e mesịrị, a gbanwere ikpe a mara Van Berghen gaa n’amamikpe ọnwụ, e jikwa ọpịa bepụ isi onye ahụ na-ebi akwụkwọ nke nwere obi ike.

Ihe Odide Etiti Peeji Mere Ka Ndụ Ya Funahụ Ya

N’oge ahụ, onye kasị na-ebi Bible ndị dị n’asụsụ Dutch bụ Jacob van Liesvelt. O bipụtara ngụkọta nke mbipụta Bible 18 n’asụsụ Dutch. Na 1526, o bipụtara Bible zuru ezu n’asụsụ Dutch. Bible ahụ pụtara afọ anọ tupu e nwee Bible mbụ zuru ezu e biri n’asụsụ French nakwa afọ itoolu tupu e bipụta Bible Bekee mbụ zuru ezu! Bible Van Liesvelt dabeere n’ụzọ bụ́ isi na Bible German nke Luther na-edechabeghị edecha.

Mbipụta ikpeazụ nke Van Liesvelt nke dị n’asụsụ Dutch, bụ́ nke 1542, nwere onyinyo nke ihe ndị a tụrụ atụ nakwa ihe odide etiti peeji ọhụrụ. Dị ka ihe atụ, n’akụkụ Matiu 4:3, e nwere onyinyo nke Ekwensu a tụrụ dị ka onye mọnk gbara afụ ọnụ nke ji rosary ma nwee ụkwụ ewu. Otú ọ dị, ọ bụ ihe odide etiti peeji ahụ kpọmkwem kpasuru Chọọchị Katọlik iwe. E ji otu ihe odide—nke gụrụ sị, “Ọ bụ nanị n’aka Jizọs Kraịst ka nzọpụta na-esi abịa”—mere ihe mgbakwasị ụkwụ n’ịma Van Liesvelt ikpe ọnwụ. N’agbanyeghị na Van Liesvelt kwuru na ya natara chọọchị ikike ibi Bible ahụ, e gbupụrụ ya isi n’Antwerp na 1545.

E Bu Ụzọ Kwadoo Ya, Ma Mesịa Machibido Ya Iwu

Ka ọ dịgodị, na France, onye Katọlik a ma nnọọ ama nke na-arụ ọrụ maka ọdịmma ụmụ mmadụ, bụ́ Jacques Lefèvre d’Étaples ji nnọọ ọrụ n’aka n’ịsụgharị Bible site na Latin gaa na French, ọ bụ ezie na o nyochakwara ihe odide Grik mbụ. D’Étaples chọrọ ime ka Bible ruo ndị nkịtị aka. O dere, sị: “Oge na-abịa mgbe a ga-ekwusa banyere Kraịst n’ụzọ dị ọcha n’abụghị nke e ji ọdịnala ụmụ mmadụ gwagbuo, bụ́ nke na-adịbeghị otú ahụ ugbu a.” Na 1523, o bipụtara nsụgharị French nke “Agba Ọhụrụ” na Paris. Ndị ọkà mmụta okpukpe nke Mahadum Sorbonne a na-akwanyere ùgwù jụrụ nsụgharị ya n’ihi na ọ dị n’asụsụ ógbè. N’ịbụ onye ha wakporo, D’Étaples gbagara Paris ma gaa Strasbourg nke dị n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ France.

N’ihi mmegide a, ndị na-ebi akwụkwọ na France adịghịzi anwa anwa ebipụta Bible n’asụsụ French. Oleezi ebe D’Étaples pụrụ ibi Bible ya? Antwerp bụ ebe ezi uche dị na ya ịhọrọ. Mbipụta Bible nke D’Étaples nke 1530, bụ́ nke Merten de Keyser biri n’Antwerp, bụ nsụgharị Bible French mbụ dị n’otu mpịakọta. N’ụzọ na-akpali mmasị, De Keyser biri nsụgharị a site ná nkwado nke Mahadum Katọlik nke dị na Louvain, bụ́ mahadum kasị ochie na Belgium, nakwa nkwado nke Eze Ukwu Rom Dị Nsọ bụ́ Charles nke Ise n’onwe ya! Ka o sina dị, na 1546, a gụnyere nsụgharị nke D’Étaples n’ime akwụkwọ ndị a machibidoro ndị Katọlik iwu ịgụ.

‘Bishọp Ji Akwụkwọ . . . Tyndale EJide Ego’

N’England, n’otu oge a, William Tyndale bụ́ onye e chiri ụkọchukwu chọrọ ịsụgharị Bible gaa n’asụsụ Bekee. Otú ọ dị, bishọp nke London, bụ́ Cuthbert Tunstall, katọrọ ya. Mgbe Tyndale ghọtara na ọ pụghị ịsụgharị Bible n’England, ọ gbagara Germany. N’ikpeazụ, na February 1526, o nwere ihe ịga nke ọma n’ime ka e bie nsụgharị Bekee mbụ ya zuru ezu nke “Agba Ọhụrụ.” Tupu otu ọnwa agasịa, mbipụta ndị mbụ nke nsụgharị ahụ apụtaworị n’England.

Otú ọ dị, Bishọp Tunstall kpebisiri ike igbochi ndị nkịtị ịgụ Bible ahụ. N’ihi ya, ọ kpọrọ nsụgharị Tyndale nke ọ bụla ọ pụrụ ịhụ ọkụ. N’agbanyeghị nke ahụ, a nọgedere na-ekesa ya. Ya mere bishọp ahụ mere ndokwa, site n’aka onye ahịa aha ya bụ Packington, ịzụchapụ Bible nile Tyndale nwere tupu ha ahapụ kọntinent ahụ ma rute England. Tyndale nabatara atụmatụ ahụ ma jiri ego ndị ọ na-akpata na-eme ihe n’imeziwanye nsụgharị ya nakwa n’ibi mbipụta ya nke e dezigharịrị edezigharị. “Ya mere, ọzụzụ ahụ a zụrụ ya mere ka ọ kakwuo mma,” ka otu akwụkwọ nke oge ahụ kwuru. “Bishọp ji akwụkwọ ndị ahụ, Packington anara ekele, Tyndale ejidekwa ego.” N’ihi ya, bishọp nke London jiri ego kwadoo ọrụ nsụgharị Bible Tyndale n’amaghị ama!

Njikọ Tyndale na Antwerp Nwere

Ma ọbụna mgbe a zụsịrị ma kpọsịa ha nile ọkụ, “Agba Ọhụrụ” Tyndale nọgidere na-enubanye n’England. Olee otú nke ahụ si kwe omume? Ndị na-ebi akwụkwọ abụọ nwere obi ike nọ n’Antwerp bụ́ Hans na Christopher van Ruremond, zooro ezoro bie ọtụtụ mbipụta nke “Agba Ọhụrụ” Tyndale. Ọ bụ ezie na Bible ndị a nwere ọtụtụ mkpụrụ okwu ndị e dehiere edehie, ma ndị nọ n’England nwere nnọọ ọchịchọ ịzụ ha.

Otú ọ dị, na 1528, a tụrụ Hans mkpọrọ na London maka ibi mkpuru 1,500 nke “Agba Ọhụrụ” Tyndale nakwa maka iwebata 500 n’ime ha n’England. Ma eleghị anya, ọ nwụrụ n’ụlọ mkpọrọ n’England. Na 1531, a tụkwara nwanne nwoke Hans bụ́ Christopher mkpọrọ n’England maka ire “Agba Ọhụrụ” ahụ. O yikwara ka Christopher ọ̀ nwụrụ n’ụlọ mkpọrọ.

“Ihe Ncheta Ọma nke Tyndale” —E Biri Ya n’Antwerp

Site na 1529 ruo 1535, Tyndale nọrọ ihe ka ukwuu n’oge ya n’Antwerp, bụ́ ebe dịịrị ya mma karị ịnọ rụọ ọrụ ya. N’ebe ahụ, na 1530, Merten de Keyser biri nsụgharị Pentateuch nke Tyndale, bụ́ ebe aha ahụ bụ́ Jehova pụtara na nke mbụ ya n’asụsụ Bekee.

Na May 1535, e jidere Tyndale n’Antwerp. Ka ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ, otu n’ime ndị ọ kụziiri ihe, bụ́ Miles Coverdale, sụgharịtọpụrụ nsụgharị Tyndale nke Akwụkwọ Nsọ Hibru. N’October 6, 1536, na Vilvoorde, Belgium, e kegidere Tyndale n’elu osisi, dọgbuo ya, ma kpọọ ya ọkụ. Okwu ikpeazụ ya bụ: “Onyenwe anyị, meghee anya Eze England!”

Ihe Nlereanya nke Tyndale

N’oge na-adịghị anya mgbe e gbusịrị Tyndale, Eze Henry nke Asatọ nke England nyere ikike ka a na-agụ otu nsụgharị Bible na chọọchị dị iche iche. Ọ bụ Matthias Crom, bụ́ onye ọzọ na-ebi akwụkwọ n’Antwerp, biri ya. Bible a, bụ́ nke a maara n’ebe nile dị ka Bible Matthew (bụ́ nke a kpọkwasịrị aha Thomas Matthew), bu nsụgharị Tyndale n’ụzọ bụ́ isi. * Lee ihe megidere onwe ya ọ bụ na ndị bishọp ahụ jizi nsụgharị ha kpọburu ọkụ afọ ole na ole bu ụzọ na-eme ihe—nsụgharị e ji maka ya gbuo Tyndale!

E chekwara ihe dị ukwuu ná nsụgharị nke Tyndale n’ime King James Version. N’ihi ya, ọtụtụ okwu ndị sitere na King James Version bụ́ ndị nweworo mmetụta dị ukwuu n’asụsụ Bekee, bụ ndị Tyndale chepụtara ma bụrụ ndị e biri na mbụ n’Antwerp. Dị ka Prọfesọ Latré si kwuo, mmetụta Tyndale nwere n’ebe asụsụ Bekee dị dị ukwuu ọbụna karịa nke Shakespeare!

Ná ngwụsị nke narị afọ nke 16, Antwerp enweghịzi ọnọdụ nke ịbụ ebe a na-ekwe ka okpukpe ọzọ dịrị nakwa ebe dị nchebe maka obibi Bible. N’ụzọ bụ́ isi, ọ bụ mkpagbu nke Òtù Mgbanwegharị Ihe nke Chọọchị Katọlik kpasuru, mere e ji nwee mgbanwe a. N’agbanyeghị nke ahụ, obi ike nke ndị mbụ ahụ na-ebi Bible n’Antwerp na àjà ndị ha chụrụ enyewo aka n’ụzọ dị ukwuu n’ime ka Okwu Chineke ruo ndị na-agụ Bible aka gburugburu ụwa.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 28 Ma eleghị anya, Thomas Matthew bụ utu aha John Rogers, enyi na onye ọrụ ibe Tyndale.

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

N’elu: Iji aka edozi mkpụrụ akwụkwọ ndị e ji ígwè mee bụ́ ndị e ji ebi akwụkwọ; Martin Luther, ka ọ na-asụgharị Bible; map oge gboo nke obodo Antwerp

[Foto dị na peeji nke 16]

Ebe Jacob van Liesvelt na-ere akwụkwọ

[Foto ndị dị na peeji nke 17]

Jacques Lefèvre d’Étaples na peeji ebe e dere aha mbipụta Bible ya nke 1530, bụ́ nke e biri n’Antwerp

[Foto dị na peeji nke 17]

Ebe a na-akpọ Bible Bekee ọkụ n’ihu ọha na London

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

William Tyndale, peeji nke sitere na Bible ya, na Miles Coverdale

[Ebe E Si Nweta Foto Ndi Dị na peeji 16]

Peeji nke 15: Ígwè na-ebi mkpụrụ akwụkwọ: Printer’s Ornaments/nke Carol Belanger Grafton dere/Dover Publications, Inc.; Luther: Site n’akwụkwọ bụ́ Bildersaal deutscher Geschichte; map: Site n’ikike nke Museum Plantin-Moretus/Stedelijk Prentenkabinet Antwerpen; peeji nke 17: Foto: Site n’akwụkwọ bụ́ Histoire de la Bible en France; peeji Bible: © Cliché Bibliothèque nationale de France, Paris; Bible ndị na-ere ọkụ: Site n’akwụkwọ bụ́ The Parallel Bible, The Holy Bible, 1885; peeji nke 18: Tyndale: Site n’akwụkwọ bụ́ The Evolution of the English Bible; Coverdale: Site n’akwụkwọ bụ́ Our English Bible: Its Translations and Translators