Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Iji Teta! Mee Ihe n’Ụzọ Dị Irè

Iji Teta! Mee Ihe n’Ụzọ Dị Irè

Iji Teta! Mee Ihe n’Ụzọ Dị Irè

MGBE ọ dị afọ 16, Vanessa, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova nọ na United States, aghaghị ide otu akụkọ n’ụlọ akwụkwọ banyere nsogbu achọghị iri ihe. “Emere m nnyocha,” ka ọ na-ekwu, “ma achọtaliri m nanị ihe ọmụma ole na ole. Agwara m ndị mụrụ m banyere ya, ha tụkwara aro ka m chọọ isiokwu ahụ n’ime mbipụta anyị dị iche iche.”

Site n’inyocha mbipụta dị iche iche nke Ndịàmà Jehova, Vanessa chọtaliri ọtụtụ ihe ọmụma maka akụkọ ya. “Ma nke ahụ bụ nanị otu akụkụ nke ihe omume ahụ,” ka ọ na-ekwu. “Aghaghịkwa m ikwu ya n’ihu onye nkụzi ahụ na ụmụ akwụkwọ 20!” Olee otú Vanessa ga-esi rụọ ọrụ a siri ike?

Dị ka Ndịàmà Jehova n’akụkụ nile nke ụwa, Vanessa na-enweta ọzụzụ maka ikwu okwu n’ihu ọha n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, bụ́ nke a na-eduzi n’Ụlọ Nzụkọ Alaeze dị n’ógbè ha. “N’ụlọ akwụkwọ a, a na-akwadebe anyị nke ọma ịga ozi ma gwa ndị ọzọ okwu,” ka Vanessa na-ekwu. “Anyị na-enwetakwa ndụmọdụ banyere ihe ndị ọ dị mkpa ka anyị rụọ ọrụ na ha ka ndị mmadụ nwee ike ịghọta ihe anyị na-ekwu karị.” Gịnị si ná mgbalị siri ike Vanessa tinyere n’akụkọ o dere n’ụlọ akwụkwọ ya pụta? “Enwetara m akara kasị elu,” ka Vanessa kwuru.

Vanessa bụ otu n’ime ọtụtụ ndị ntorobịa na-eji mbipụta ndị dabeere na Bible na ọzụzụ ime mmụọ ndị ọzọ ha na-enweta eme ihe n’ụzọ dị irè. E kwesịrị ịja ndị na-eto eto dị otú ahụ mma, n’ihi na ha na-aṅa ntị na ndụmọdụ dị n’Eklisiastis 12:1: “Chetakwa Onye keworo gị n’ụbọchị nile ị dị n’okorobịa.”