Ihe Dị Oké Mkpa ná Ndụ—Mmiri
Ihe Dị Oké Mkpa ná Ndụ—Mmiri
JIZỌS gwara otu nwanyị Sameria nke na-esere mmiri n’otu olulu mmiri banyere isi iyi nke mmiri na-asụpụta asụpụta inye ndụ ebighị ebi. (Jọn 4:14) Ọ bụ ezie na mmiri o zoro aka na ya bụ mmiri ihe atụ, n’ụzọ nkịtị, mmiri dị oké mkpa ná ndụ, ọ bụ nanị ikuku oxygen dị mkpa karịa ya. Mmadụ pụrụ ịdị ndụ ruo ọtụtụ izu n’erighị nri ma ọ pụrụ ịdị ndụ ruo nanị ụbọchị ise n’aṅụghị mmiri!
Ọ bụ mmiri mejupụtara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụzọ atọ n’ụzọ anọ nke ịdị arọ ahụ́ anyị. Dị ka ihe atụ, ọ bụ mmiri mejupụtara pasent 75 ruo 85 nke ụbụrụ anyị, ọ bụkwa mmiri mejupụtara pasent 70 nke uru ahụ́ anyị. Tụkwasị n’ihe ndị ọzọ, mmiri na-enyere ahụ́ anyị aka ịgbari na ịmịkọrọ ihe oriri, na-ebugara mkpụrụ ndụ ihe ndị na-edozi ahụ́. Ọ na-ewepụ ihe ndị bụ́ nsí na ihe ndị ọzọ ahụ́ na-achọghị, na-eme ka nkwonkwo na eriri afọ ghara ịkpọ nkụ, na-achịkwakwa ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ nke ahụ́. Ma ị̀ maara na ịṅụ mmiri otú kwesịrị ekwesị na-enyekwa aka n’ime ka mmadụ felata?
Ṅụọ Mmiri Iji Felata
Nke mbụ, mmiri enweghị calorie, o nweghị abụba, o nweghịkwa cholestrol, soldium dị na ya dịkwa ntakịrị. Nke abụọ, ọ na-ebelata agụụ. Nke atọ, mmiri na-enyere ahụ́ aka ịgbari abụba ndị o chekwara. N’ụzọ dị aṅaa? Mgbe akụrụ na-enweghị mmiri otú o kwesịrị, ha apụghị ịrụ ọrụ nke ọma. Imeju na-eweghara ụfọdụ n’ime ọrụ ha, ma ime otú ahụ na-ebelata ikike o nwere ịgbari abụba nke ọma. N’ihi ya, abụba ahụ na-adịgide n’ime ahụ́, mgbe ahụ ị na-ebukwu ibu. N’ihi ya, dị ka Dr. Donald Robertson nke na-arụ ọrụ na Southwest Bariatric Nutrition Center dị na Scottsdale, Arizona,
U.S.A., na-ekwu, “ịṅụ mmiri nke ọma bụ ụzọ dị mkpa isi felata. Ọ bụrụ na ndị na-agbalị ifelata adịghị aṅụ mmiri nke ọma, ahụ́ ha apụghị ịgbari abụba nke ọma.”N’eziokwu, mmiri ịdọrọ n’ahụ́ na-emekarị ka mmadụ bukwuo ibu. N’ihi ya, ndị mmiri na-adọrọkarị n’ahụ́ ha na-eche na ọgwụ ya bụ ibelata mmiri ha na-aṅụ. Otú ọ dị, ọ bụ ihe ahụ ha na-achọ izere na-eme. Mgbe mmiri kọrọ mmadụ n’ahụ́, ọ na-agbalị ijigide mmiri ọ bụla dị adị site n’ichekwa ya n’ebe ndị dị ka n’ụkwụ, n’aka, na n’ogwe ụkwụ ya. Ya mere, ndị ọkachamara n’ihe banyere nri na-atụ aro ka anyị na-enye ahụ́ anyị ihe dị ya mkpa—mmiri zuru ezu. Chetakwa na ka ị na-erikwu nnu, otú ahụ ka mmiri ga na-adọrọkwu gị n’ahụ́ iji gwagbuo ya.
Nye Ahụ́ Gị Mmiri
Kwa ụbọchị, ná nkezi, ihe dị ka lita mmiri abụọ na-esi n’akpụkpọ ahụ́, akpa ume, eriri afọ, na akụrụ apụ. Ihe dị ka ọkara otu lita mmiri na-apụ anyị n’ahụ́ nanị site n’iku ume. Ọ bụrụ na e dochighị mmiri a, mmiri ga-agwụ anyị n’ahụ́. Ụfọdụ ihe mgbaàmà nke mmiri ịgwụ n’ahụ́ bụ isi ọwụwa, ike ọgwụgwụ, ahụ mgbu, mamịrị na-eji oji, edilighị okpomọkụ, asọ mmiri ịtakọrọ n’ọnụ na anya mmiri ịgwụ n’anya.
Ya mere, mmiri ha aṅaa ka anyị kwesịrị ịdị na-aṅụ? Dr. Howard Flaks, bụ́ ọkachamara n’ibu oké ibu, na-ekwu, sị: “Ọ dịkarịa ala, onye ahụ́ siri ike kwesịrị ịṅụ lita abụọ ma ọ bụ lita abụọ na ọkara kwa ụbọchị. Ọ dị mkpa ka ị na-aṅụ karịa otú ahụ ma ọ bụrụ na ị na-enwe mmega ahụ́ nke ukwuu ma ọ bụ biri n’ebe e nwere ihu ígwé na-ekpo ọkụ. Ndị bubigara ibu ókè kwesịkwara ịdị na-aṅụkwu otu iko mmiri maka kilogram iri ọ bụla ha ji gafee otú ha kwesịrị ịha n’ịdị arọ.” Otú ọ dị, ụfọdụ ndị na-ekwu ugbu a na ịdị na-aṅụ mmiri mgbe akpịrị na-akpọ gị nkụ ezuola, n’agbanyeghị na ọ bụrụ na akpịrị akpọọ gị nkụ, ọ pụrụ ịbụ na mmiri agwụtụla gị n’ahụ́.
À pụrụ ịṅụ ihe ọṅụṅụ ndị ọzọ kama ịṅụ mmiri? Ọ bụ ezie na ihe ọṅụṅụ ndị e si ná mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri nweta, bụ́ ndị a gwara mmiri, dị mma, ha nwere calorie. Ọzọkwa, ihe ọṅụṅụ ndị nwere shuga na mmiri ara ehi hie nne na-eme ka ahụ́ na-achọkwu mmiri, ebe ọ bụ na mmiri dị mkpa iji gbarie ha. Ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya na ndị nwere caffeine dị ka kọfị na tii na-eme ka mmadụ na-anyụtụkwu mamịrị karị, na-eme ka ọ dị mkpa ka mmadụ na-aṅụkwu mmiri iji ṅụchie nke ọ na-anyụpụ. Ọ dịghị nnọọ ihe a pụrụ iji dochie anya ihe ahụ dị oké mkpa, mmiri. Ya mere, gịnị ma ị ṅụọ otu iko mmiri ugbu a?
[Igbe/Foto dị na peeji nke 24]
Aro Ndị Ga-eme Ka Ị Na-aṅụ Mmiri Karị
● Na-ebu karama mmiri.
● Ṅụọ otu iko mgbe ọ bụla ị na-eri nri.
● Ṅụọ mmiri tupu i nwee mmega ahụ́, n’oge ị na-enwe mmega ahụ́, na mgbe i nwesịrị mmega ahụ́.
● Mgbe ị na-ezurutụ ike n’ọrụ, ṅụọ mmiri kama ịṅụ kọfị.
● Iji mee ka mmiri pọmpụ dị ụtọ karị, tinye ya mmiri oroma lemon ma ọ bụ zaa ya azaa.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 23]
Photo: www.comstock.com