Ọ́ Gaghị Akara M Mma Igbu Onwe M?
Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
Ọ́ Gaghị Akara M Mma Igbu Onwe M?
Kwa afọ, ọtụtụ nde ndị na-eto eto na-anwa igbu onwe ha. Ọtụtụ puku na-emecha gbuo onwe ha. Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị na-eto eto na-egbu onwe ha, ndị na-ebipụta “Teta!” chere na ọ dị mkpa ikwu banyere ya.
“HAPỤ M ka m nwụọ. Ọ kaara m mma ịnwụ anwụ karịa ịdị ndụ.” Ònye kwuru okwu ahụ? Ọ̀ bụ onye na-ekweghị na Chineke? Ọ̀ bụ onye jụrụla Chineke? Ọ̀ bụ onye Chineke jụrụla? Ọ dịghị nke ọ bụ n’ime ha. Onye kwuru ya bụ otu nwoke na-efesi Chineke ike, onye ihe na-ewute n’obi, aha ya bụkwa Jona. * (Jona 4:3, Today’s English Version) Baịbụl ekwughị na Jona chọrọ igbu onwe ya. Kama, arịrịọ ya ahụ mere ka otu ihe dị oké mkpa doo anya—mgbe ụfọdụ, nhụjuanya nwedịrị ike ime ka obi jọọ ohu Chineke njọ.—Abụ Ọma 34:19.
Obi nwere ike ịjọ ụfọdụ ndị na-eto eto njọ nke ukwuu otú ahụ nke na ọ ga-adị ha ka ha nwụọ. O nwere ike ịdị ha otú ọ dị nwa agbọghọ dị afọ iri na isii aha ya bụ Laura, * bụ́ onye sịrị: “Ruo ọtụtụ afọ, e nwere ọtụtụ oge obi na-anaghị adị m mma. Ihe na-abatakarị m n’obi bụ igbu onwe m.” Ọ bụrụ na o nwere onye ị maara kwurula na ya ga-egbu onwe ya—ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ọ batatụla gịnwa n’obi—gịnị ka ị ga-eme? Ka anyị burugodị ụzọ lebakwuo anya n’ihe nwere ike ime ka mmadụ chewe echiche igbu onwe ya.
Ihe Mere Ha Ji Achọ Igbu Onwe Ha
Gịnị mere mmadụ ga-eji chetụwa echiche igbu onwe ya? E nwere ọtụtụ ihe nwere ike ịkpata ya. Otu n’ime ha bụ na anyị bi ‘n’oge dị oké egwu, nke tara akpụ,’ ihe isi ike ndị a na-enwe ná ndụ na-akpakwa ndị na-eto eto aka ọjọọ. (2 Timoti ) Ọzọkwa, ezughị okè nwere ike ime ka ụfọdụ mmadụ buru ihe ndị na-adịghị mma n’obi banyere onwe ha na ihe ndị na-eme ná ndụ ha. ( 3:1Ndị Rom 7:22-24) Mgbe ụfọdụ, ọ na-abụ n’ihi mmeso ọjọọ e mesoro ha. Mgbe ụfọdụkwa, ọrịa nwere ike ịkpata ya. E kwesịkwara icheta na nnyocha e mere n’otu mba na-egosi na ihe dị ka mmadụ itoolu n’ime mmadụ iri ọ bụla gburu onwe ha nwere isi mgbaka. *
N’eziokwu, o nweghị onye nsogbu na-anaghị abịara. Baịbụl kwudịrị na “ihe niile e kere eke na-asụkọ ude ma na-anọkọ n’ihe mgbu ruo ugbu a.” (Ndị Rom 8:22) Ndị na-eto eto sokwa na ya. Nke bụ́ eziokwu bụ na nsogbu ndị dị ka ndị e depụtara n’okpuru ebe a, na-akasị emetụta ndị ntorobịa:
▪ Ọnwụ nke onye ikwu, enyi, ma ọ bụ anụ e ji mere enyi
▪ Esemokwu ezinụlọ
▪ Ịda ule n’ụlọ akwụkwọ
▪ Mgbe onye mmadụ hụrụ n’anya tiwara ya obi
▪ Mmeso ọjọọ (nke gụnyere itikasị mmadụ ahụ́ ma ọ bụ idina mmadụ n’ike)
Nke bụ́ eziokwu bụ na otu n’ime nsogbu ndị a e depụtara n’elu, ma ọ bụ karịa, na-emecha adabara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị ntorobịa niile. Gịnị mere o ji adịrị ụfọdụ ndị mfe idi nsogbu ndị a karịa ndị ọzọ? Ndị ọkachamara sịrị na ndị na-eto eto na-anaghị edili nsogbu ndị ahụ bụ ndị na-enweghị olileanya na a ga-emekwatali nsogbu ha. Otú ọzọ e nwere ike isi kwuo ya bụ na ndị na-eto eto dị otú ahụ chere na o nweghị ihe ha ga-emeli ka nsogbu ha belata, ha echeghịkwa na nsogbu ha ga-emecha kwụsị. Dr. Kathleen McCoy gwara Teta!, sị: Ihe mere ndị ntorobịa a ji achọkarị igbu onwe ha abụghị na ọnwụ na-agụ ha. Ọ bụ naanị na ha chọrọ ka nsogbu ha kwụsị.”
Ò Nweghị Ngwọta?
O nwere ike ịbụ na ị maara onye ‘chọrọ ka nsogbu ya kwụsị’—nke na o kwudịrị na ya chọrọ igbu onwe ya. Ọ bụrụ na o nwere onye ị maara, gịnị ka ị ga-eme?
Ọ bụrụ na o nwere ihe na-enye enyi gị nsogbu n’obi nke na ọ chọrọ igbu onwe ya, mee ka ọ mara na enyemaka dị ya mkpa. Ma ò kweere ihe ị gwara ya ma ọ bụ na o kweghị, kọọrọ ya onye toro eto maara nke a na-akọ. Ụjọ atụla gị na gị na ya agaghịzi adị ná mma. Ọ bụrụ na ị kọọrọ ya onye ọzọ, i gosila na ị bụ “ezi enyi,” nke “a mụrụ maka oge nsogbu.” (Ilu 17:17) I nwere ike isi otú ahụ zọọ ndụ onye ahụ!
Ọ̀ bụrụkwanụ na ọ bụ gịnwa na-eche echiche igbu onwe gị? Dr. McCoy na-agba gị ume, sị, “Chọọ enyemaka. Kọọrọ onye ọzọ ihe dị gị n’obi—mama gị ma ọ bụ papa gị, onye ikwu gị ọzọ, enyi gị, onye nkụzi gị, onye okenye chọọchị unu—onye hụrụ gị n’anya, bụ́ onye ga-eji ihe ị gwara ya kpọrọ ihe, gee gị ntị, ma nyere ndị ọzọ na-echere gị echiche ọma aka ịnụ ihe i nwere ikwu.”
O nweghị ihe ga-efunahụ gị—ọ ga-abakwara gị ezigbo uru—ma ị gwa mmadụ banyere nsogbu gị. Tụlee otu ihe atụ dị na Baịbụl. N’otu oge ná ndụ Job, bụ́ nwoke kwesịrị ntụkwasị obi, o kwuru, sị: “Mkpụrụ obi m akpọwo ndụ m asị.” Ma o kwuziri, sị: “M ga-ekwupụta nchegbu m na-enwe banyere onwe m. M ga-ekwu okwu dị ka o si ewute mkpụrụ obi m!” (Job 10:1) Obi adịghị Job mma, ọ chọkwara ikwu otú ọ dị ya n’obi. Obi nwere ike ịdajụtụ gị ma ị kọọrọ otu enyi gị toro eto otú ọ dị gị n’obi.
Ndị Kraịst, bụ́ ndị nwere nsogbu, nwere ndị ọzọ ha nwere ike ịkọrọ ya—ndị okenye ọgbakọ. (Jems 5:14, 15) Ọ bụ eziokwu na ịkọrọ mmadụ banyere nsogbu gị agaghị eme ka nsogbu ahụ kwụsị ozugbo, ma, o nwere ike inyere gị aka ile ya anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị, aka onye ahụ ị kọọrọ ya ga-enyere gị nwekwara ike ịbụ nnọọ ụzọ kasị mma isi gwọta nsogbu ahụ.
Ọnọdụ Na-agbanwe Agbanwe
Mgbe ihe na-esiri gị ike, cheta na n’agbanyeghị otú ihe siruuru gị ike, ka oge na-aga, ọnọdụ Abụ Ọma 6:6) N’abụ ọzọ o dere, ọ sịrị: “Ị gbanwewo iru uju m ka ọ bụrụ ịgba egwú.”—Abụ Ọma 30:11.
ga-agbanwe. Ọbụ abụ bụ́ Devid, bụ́ onye nwerela nsogbu ọtụtụ ugboro, kwuru n’ekpere, sị: “Ude m na-asụ emewo ka ike gwụ m; n’ogologo abalị dum, m na-eme ka ihe ndina m dee mmiri; m na-eme ka ihe ndina m jupụta n’anya mmiri m.” (Site n’ihe mere ná ndụ Devid, ọ maara na nsogbu ndị a na-enwe ná ndụ na-abụ ha bịa, ha alaa. N’eziokwu, ụfọdụ n’ime ha nwere ike iyi ka hà enweghị ngwọta ugbu a. Ma, nwee ndidi. Ọnọdụ na-agbanwe, ihe na-emesịkwa ka mma. Mgbe ụfọdụ, nsogbu nwere ike ibelata otú ị na-atụghị anya ya. Ọ na-adabakwa mgbe ụfọdụ na i nwere ike icheta otú ọzọ na-abatatụbeghị gị n’uche i nwere ike isi die nsogbu gị. Ihe a na-ekwu bụ na nsogbu ndị tara akpụ agaghị anọgide na-ata akpụ ruo mgbe ebighị ebi.—2 Ndị Kọrịnt 4:17.
Uru Ekpere Bara
Ụzọ kasị mkpa i nwere ike isi kọọ banyere nsogbu gị bụ site n’ikpe ekpere. I nwere ike ikpe ekpere dị ka Devid, bụ́ onye kpere, si: “Chineke, biko, nyochaa m, marakwa obi m. Nyochaa m, marakwa nchegbu m, lee ma m̀ na-eje ije n’ụzọ ọ bụla nke na-eweta ihe mgbu, na-edukwa m n’ụzọ nke mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 139:23, 24.
Ekpere abụghị ihe nkịtị e ji eme ka nsogbu laa. Ọ bụ ezigbo nkwurịta okwu nke gị na Nna gị nke eluigwe, bụ́ onye chọrọ ka ị ‘wụpụ obi gị’ n’ihu ya. (Abụ Ọma 62:8) Tụlee eziokwu ndị gbara ọkpụrụkpụ banyere Chineke:
▪ Ọ maara ihe ndị so eme ka obi jọọ gị njọ.—Abụ Ọma 103:14.
▪ Ọ maara gị karịa ka ị maara onwe gị.—1 Jọn 3:20.
▪ ‘Ihe banyere gị na-emetụ ya n’obi.’—1 Pita 5:7.
▪ N’ime ụwa ọhụrụ, Chineke ‘ga-ehichapụ anya mmiri niile’ dị gị n’anya.—Mkpughe 21:4.
Ọ Bụrụ Na Nsogbu Gị Bụ Ọrịa
Dị ka e kwuru n’elu, ihe na-emekarị ka ndị mmadụ chewe igbu onwe ha bụ n’ihi ụdị ọrịa ụfọdụ ha na-arịa. Ya bụrụ otú ahụ ka ọ dị gị, emela ihere ịchọ enyemaka. Jizọs kwuru na ndị ọrịa chọrọ enyemaka ndị ọgwọ ọrịa. (Matiu 9:12) Ihe ọma merenụ bụ na ọtụtụ ọrịa nwere ọgwụgwọ. A gwọọ nke gị, ahụ́ erukwuo gị nnọọ ala!
Baịbụl na-ekwe nkwa na n’ime ụwa ọhụrụ Chineke, “ọ dịghị onye bi na ya nke ga-asị: ‘ana m arịa ọrịa.’” (Aịzaya 33:24) Ka ọ dịgodị, gbalịsie ike idi nsogbu ndị ị na-enwe ná ndụ. Ọ bụ otú ahụ ka Heidi, onye bi na Germany, mere. O kwuru, sị: “O nwere oge obi na-ajọ m njọ nke ukwuu nke na ọ na-adị m ka m nwụọ, ma ugbu a, obi adịla m mma n’ihi na o nweghị mgbe m kwụsịrị ikpe ekpere na ịga anara ọgwụ.” O nwekwara ike ịdị gị otú ahụ! *
Isiokwu na-esonụ ga-ekwu otú i nwere ike isi die ọnwụ nke nwanne gị gburu onwe ya
Ị gaa n’Intanet, ị ga-enweta ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị” n’adres bụ́ www.watchtower.org/ype
[Ihe odide ala ala peeji]
^ par. 4 Rebeka, Mozis, Ịlaịja, na Job kwuchara okwu yiri nke ahụ.—Jenesis 25:22; 27:46; Ọnụ Ọgụgụ 11:15; 1 Ndị Eze 19:4; Job 3:21; 14:13.
^ par. 5 A gbanweela aha ndị dị n’isiokwu a.
^ par. 7 Ma, e kwesịrị iburu n’obi na ihe ka ọtụtụ n’ime ndị ntorobịa nwere isi mgbaka anaghị egbu onwe ha.
^ par. 33 Iji matakwuo otú i nwere ike isi die nsogbu, lee usoro isiokwu bụ́ “Enyemaka Maka Ndị Nọ n’Afọ Iri na Ụma Dara Mbà n’Obi,” bụ́ ndị gbara na Teta! September 8, 2001, nakwa usoro isiokwu bụ́ “Ịghọta Nsogbu Mgbanwe Mberede n’Ọnọdụ Uche,” bụ́ ndị gbara na Teta! January 8, 2004.
IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE
▪ Mmadụ igbu onwe ya anaghị akwụsị nsogbu ya; naanị ihe ọ na-eme bụ ibufere ya ndị ọzọ. Olee otú o si bụrụ eziokwu?
▪ O nwee ihe na-echegbu gị, ònye ka ị ga-akọrọ?
[Igbe/Foto dị na peeji nke 19]
IHE NDỊ MỤRỤ ỤMỤ KWESỊRỊ IBURU N’UCHE
N’ebe ụfọdụ n’ụwa, otú ndị na-eto eto si egbu onwe ha abụghị ihe e ji ọnụ ekwu. Dị ihe atụ, na United States, ihe nke atọ kasị kpata ọnwụ nke ndị na-eto eto dị n’agbata afọ iri na ise na iri abụọ na ise bụ na ha gburu onwe ha, ọzọkwa, n’ime afọ iri abụọ gara aga, ọnụ ọgụgụ nke ndị dị n’agbata afọ iri na afọ iri na-anọ, bụ́ ndị na-egbu onwe ha, arịakwala elu okpukpu abụọ. Ndị kasị egbu onwe ha bụ́ ndị ntorobịa ihe na-emetụ n’isi, ndị si n’ezinụlọ na-egbukarị onwe ha, na ndị nwatụrụla igbu onwe ha. Ihe ndị na-esonụ bụ ihe ndị e ji amara na onye ntorobịa achọwala igbu onwe ya:
▪ Ya kwụsị iso ndị ezinụlọ ya na ndị enyi ya na-emekọ ihe
▪ Ya gbanwee otú o sibu eri nri na otú o sibu ehi ụra
▪ Ya kwụsị inwe mmasị ime ihe ndị na-atọbu ya ụtọ
▪ Omume ya gbanwee
▪ Ya malite ịṅụ ọgwụ ike na ịṅụbiga mmanya na-aba n’anya ókè
▪ Ya malite inye ndị mmadụ ezigbo ihe ndị o nwere
▪ Ya malite ikwu banyere ọnwụ na okwu ndị metụtara ya
Dr. Kathleen McCoy gwara Teta! na ndị mụrụ ụmụ nwaa anwaa leghara ihe mgbaàmà ndị a anya, ha emebiela ihe. O kwuru, sị: “O nweghị onye chọrọ ịchetụwa n’echiche na o nwere ihe nwere ike ime nwa ya, ọ bụ ya mere na ụfọdụ ndị mụrụ ụmụ anaghị ekweta na agwọ nọ n’akịrịka. Ihe ha na-agwa onwe ha bụ, ‘O nweghị ihe na-eme ya’ ma ọ bụ ‘Ọ ga-emecha kwụsị’ ma ọ bụ ‘Ọ bụ otú o si emekarị.’ I were ya otú ahụ, i gbuola nwa ahụ. O nwetụghị ihe mgbaàmà ọ bụla e kwesịrị ileghara anya.”
Ihere emela gị ịchọ otú ị ga-esi nyere nwa gị nwoke ma ọ bụ nwa gị nwaanyị aka ma ọ bụrụ na o nwere ihe na-enye ya ezigbo nsogbu n’obi ma ọ bụ ya abụrụ na ihe na-emetụ ya n’isi. Ya bụrụ na o nwee ka i si chee na nwa gị nọ n’agbata afọ iri na ụma na-achọ igbu onwe ya, jụọ ya banyere ya. Ihe a ndị mmadụ na-ekwukarị, nke bụ́ na ị gaa jụọ mmadụ ma ọ̀ chọrọ igbu onwe ya, onye ahụ agazie gbuo onwe ya, abụghị eziokwu. Obi na-eru ọtụtụ ndị ntorobịa ala ma ndị mụrụ ha kwulite okwu ahụ. Ya mere, ọ bụrụ na nwa gị dị n’agbata afọ iri na ụma ekweta na ya chọrọ igbu onwe ya, chọpụta ma ọ̀ hazichaala otú ọ ga-esi gbuo onwe ya, ọ bụrụ na ọ haziela, chọpụta mgbe ọ chọrọ ime ya. Ọ bụrụ na o kpebiela mgbe ọ ga-eme ya, mara na i kwesịghị igbuwe oge inyere ya aka. *
Echekwala na nsogbu ahụ ga-alara onwe ya. O yiekwa ka ọ̀ laala, echekwala na ọ lachaala. Ụfọdụ ndị ọkachamara na-ekwu na ọ bụdị nke a kacha njọ. Maka gịnị? Dr. McCoy kwuru, sị: “Mgbe ike ụwa gwụnyụrụ onye dị afọ iri na ụma anya, o nwere ike ghara inwe ume igbu onwe ya. Ma, mgbe o nwetatụrụ onwe ya, o nweziri ike igbu onwe ya.”
Ọ bụ nnọọ ihe mwute na ụfọdụ ndị na-eto eto na-eche echiche igbu onwe ha n’ihi na obi adịghị ha mma. Ọ bụrụ na ndị nne na nna na ndị ọzọ toro eto na-eche banyere ndị na-eto eto elezie anya iji hụ ihe mgbaàmà ndị na-egosi na ndị a na-eto eto chọrọ igbu onwe ha ma mee ihe banyere ha, ha nwere ike ‘ịgụgụ mkpụrụ obi dara mbà’ ma bụụrụ ndị na-eto eto ebe mgbaba.—1 Ndị Tesalonaịka 5:14.
[Ihe odide ala ala peeji]
^ par. 55 Ndị ọkachamara na-adọkwa aka ná ntị na ezinụlọ ndị na-aṅụ ọgwụ ndị nwere ike igbu mmadụ ma a ṅụfee ya ókè, ma ọ bụ ndị debere égbè mgbọ dị na ya n’ebe aka onye ọ bụla nwere ike iru, kasị nọrọ n’ihe ize ndụ. Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Igbochi Mmadụ Igbu Onwe Ya n’America kwuru banyere idebe égbè mgbọ dị na ya n’ebe aka onye ọ bụla nwere ike iru, sị: “Ọ bụ eziokwu na a sịrị na ihe ka ọtụtụ ná ndị nwere égbè debere ya n’ụlọ ha iji ‘chebe onwe ha’ ma ọ bụ iji ‘zọọ ndụ ha,’ n’ime mmadụ ise égbè e dotere n’ụlọ ha gburu, ihe dị ka mmadụ anọ ji aka ha gbagbuo onwe ha, ọ naghịkwa abụkarị ha nwe égbè ahụ ha ji gbagbuo onwe ha.”
[Foto dị na peeji nke 18]
Ụzọ kasị mkpa i nwere ike isi kọọ banyere nsogbu gị bụ site n’ikpe ekpere