Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ihe Ị Ga-aza?

Olee Ihe Ị Ga-aza?

Olee Ihe Ị Ga-aza?

Olee Ihe Na-adịghị n’Ihe Osise A?

Gụọ Ọrụ 5:1-5. Lezie anya n’ihe osise ahụ. Olee ihe ndị na-adịghị na ya? Dee ihe ị chọpụtara n’okpuru ebe a, senyezie ihe ndị na-adịghị na ya, ma tee ha kreyọn.

1. ․․․․․

2. ․․․․․

IHE A GA-EKWURỊTA:

Gịnị ka i chere mere Ananayas ji ghaa ụgha? Olee ihe ị mụtara n’akụkọ a?

Site na Magazin A

Zaa ajụjụ ndị a, ma denye amaokwu Baịbụl ndị na-adịghị na ha.

PEEJI NKE 27 Gịnị na-eme mkpụrụ obi nke na-emehie? Ezikiel 18:․․․

PEEJI NKE 27 Gịnị ka ndị nwụrụ anwụ na-amaghị? Ekliziastis 9:․․․

PEEJI NKE 19 Gịnị ka anyị niile na-eme ọtụtụ ugboro? Jems 3:․․․

PEEJI NKE 19 Gịnị ka i kwesịrị iwepụ n’obi gị? Ndị Efesọs 4:․․․

Olee Ihe Ị Maara Banyere Onyeikpe Berak?

Gụọ Ndị Ikpe 4:1-24. Zazie ajụjụ ndị a.

3. ․․․․․

Olee onye amụma nwaanyị nke nyeere ya aka?

4. ․․․․․

Olee eze ndị Kenan ọ napụtara Izrel n’aka ya?

5. ․․․․․

Eziokwu ka ọ̀ bụ ụgha? Onyeikpe Berak dịrị ndụ mgbe Jọshụa nwụrụla.

IHE A GA-EKWURỊTA:

Olee otú ụmụ nwaanyị si nye aka ná mmeri ndị Izrel meriri ndị Kenan? Olee ọrụ dị mkpa ụmụ nwaanyị na-arụ taa n’ozi Chineke?

AZỊZA

1. Ananayas ejighị akpa ego n’aka ya.

2. Pita onyeozi anọghị na ya.

3. Debora.—Ndị Ikpe 4:4-9.

4. Jebin.—Ndị Ikpe 4:2.

5. Eziokwu.