Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ Dị Mma Nwoke na Nwaanyị Ibu Ụzọ Biri Tupu Ha Alụọ?

Ọ̀ Dị Mma Nwoke na Nwaanyị Ibu Ụzọ Biri Tupu Ha Alụọ?

Echiche Baịbụl

Ọ̀ Dị Mma Nwoke na Nwaanyị Ibu Ụzọ Biri Tupu Ha Alụọ?

Ì NWERE ike ịga zụrụ uwe n’ahịa n’ebughị ụzọ yitụ ya mara ma ọ̀ ga-adịkwa gị mma n’ahụ́? Ọtụtụ ndị agaghị eme ụdị ihe ahụ. A sị ka e kwuwe, ọ bụrụ na i mechaa chọpụta na uwe ahụ abaghị gị ma ọ bụ na ọ karịrị gị, ọ pụtara na ma ego gị ma oge gị alaala n’iyi.

Otú ahụ ka ọtụtụ ndị si ele alụmdi na nwunye anya. Ha weere na ọ ka mma ka nwoke na nwaanyị biri tupu ha alụọ. Ihe ha na-eche bụ, ‘Ọ bụrụ na ọ dabaraghị ha, onye ọ bụla agawara onwe ya n’agaghị kwuwe okwu ịgba alụkwaghịm, bụ́ okwu ga-ewe oge na ego tupu e kwuchaa ya.’

O nwere ike, ụfọdụ ndị na-eche ụdị ihe a ahụla ka otu enyi ha lụrụ di ma ọ bụ nwunye si na-ata ahụhụ n’aka nwunye ya ma ọ bụ di ya. Ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ha ahụla nsogbu na-adị n’ezinụlọ ebe di na nwunye na-ahụghị ibe ha n’anya. N’ihi ihe ndị a, ha na-ewere na nwoke na nwaanyị ibu ụzọ biri tupu ha alụọ ga-eme ka ha gbaara nsogbu ọsọ.

Gịnị ka Baịbụl nwere ikwu n’okwu a? Tupu anyị azawa ajụjụ a, ọ dị mkpa ịtụle ihe Okwu Chineke kwuru banyere alụmdi na nwunye.

“Otu Anụ Ahụ́”

Baịbụl gosiri na alụmdi na nwunye abụghị ihe a ga-eji na-egwuri egwu. Nke a ekwesịghịkwa iju anyị anya n’ihi na ọ bụ Jehova Chineke n’onwe ya bidoro ma kwadoo ka anyị na-alụ di ma ọ bụ nwunye. (Jenesis 2:21-24) Ná mmalite mgbe Jehova mere ndokwa a, o zubere na nwoke na nwaanyị ga-abụ “otu anụ ahụ́” ma ha lụọ. (Jenesis 2:24) Mgbe Jizọs kwuru ihe a e kwuru na Jenesis, o kwukwara, sị: “Ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.”—Matiu 19:6.

N’eziokwu, ụfọdụ ndị na-emecha gbaa alụkwaghịm. * Ma, ọ bụrụ na nke a emee, ọ bụghị n’ihi na o nwere ihe Chineke, onye bidoro alụmdi na nwunye, na-emetaghị; kama, ọ bụ n’ihi na otu onye n’ime ha ma ọ bụ ha abụọ anaghị eme ihe ha kwere ibe ha ná nkwa n’ụbọchị ha gbara akwụkwọ.

Iji maa atụ: Were ya na otu nwoke na otu nwaanyị nwere otu ụgbọala, ma ha abụọ anaghị elekọta ya otú ndị rụrụ ụgbọala ahụ si kwuo ka e si na-elekọta ya. Ọ bụrụ na ụgbọala ahụ enwee nsogbu n’ihi na a naghị elekọta ya anya, ònye ka a ga-ata ụta? Ọ̀ bụ ndị rụrụ ya, ka ọ̀ bụ ndị nwe ụgbọala ahụ, bụ́ ndị na-ekweghị elekọta ya otú e kwesịrị isi na-elekọta ya?

Otú ahụ ka ọ dịkwa n’alụmdi na nwunye. Ọ bụrụ na di na nwunye na-agbalịsi ike ibi n’udo ma kpebie ịna-eme ihe Baịbụl kwuru ma ha nwee nsogbu, ọ ga-esi ike ha agbaa alụkwaghịm. Obi na-esi ha ike na ọ dịghị onye ga-ahapụ ibe ya, n’ihi na ha ekwela ibe ha nkwa na obi ha ga-adị n’alụmdi na nwunye ha. Mgbe obi ha dịgidere n’alụmdi na nwunye ha ka ha ga-anọgide na-ahụ ibe ha n’anya.

“Zere Ịkwa Iko”

Ma, ụfọdụ ka nwere ike iche, sị: ‘Ọ́ gaghị aka mma ma ha buru ụzọ biri? Ibu ụzọ biri tupu ha alụọ ọ́ bụghị ya ga-egosi na ha ghọtara na alụmdi na nwunye bụ ihe dị nsọ?’

Ihe Baịbụl zara doro anya. Pọl dere, sị: “Zere ịkwa iko.” (1 Ndị Tesalonaịka 4:3) E ji okwu ahụ bụ́ “ịkwa iko” akọwa ụdị mmekọahụ ọ bụla na-abụghị n’etiti di na nwunye. Nke a pụtara na ọ bụrụ na nwoke na nwaanyị n’alụbeghị alụ ebiri na-enwe mmekọahụ, ha na-akwa iko, ọ sọgodị ya ya bụrụ na ha bu n’obi ịlụ. N’ihi ya, Baịbụl kwuru na ọ dị njọ ma nwoke na nwaanyị biri n’alụghị alụ—ọ sọgodị ya ya bụrụ na ha bu n’obi imecha lụọ.

Ihe a Baịbụl kwuru ọ̀ ghọọla ihe ndị mgbe ochie? Ụfọdụ nwere ike ile ya anya otú ahụ. A sị ka e kwuwe, n’ọtụtụ mba, nwoke na nwaanyị biri n’alụghị alụ, a naghị ele ha anya ọjọọ—ma hà bu n’obi ịlụ ma ha ebughị n’obi ịlụ. Ma chegodị ihe ndị ọ na-akpata. Ndị na-ebu ụzọ ebi tupu ha alụọ, ọ̀ bụ na ha anaghị enwe nsogbu? Hà na-aka ndị nke lụrụ alụ tupu ha ebiwe enwe obi ụtọ? Ọ̀ na-eme ka ha ghara ịgba n’èzí ma ha mechaa lụọ karịa ndị nke bu ụzọ lụọ tupu ha ebiwe? Nchọpụta ndị e mere gosiri na ọ bụ ndị nke bu ụzọ biwe tupu ha alụwa na-aka enwe nsogbu. N’eziokwu, a chọpụtala na ndị bu ụzọ biri tupu ha alụwa na-aka enwe nsogbu ma ha lụchaa, ọ bụkwa ha na-agbakarị alụkwaghịm n’ikpeazụ.

Ụfọdụ ndị ọkachamara ga-asị na ụdị nchọpụta ahụ abụghị eziokwu. Otu ọkà n’akparamàgwà mmadụ, dere, sị: “Otú ndị kpebiri ibu ụzọ [biri] tupu ha alụwa si ele ihe anya dị iche ná ndị nke kpebiri ịlụ n’ebughị ụzọ [biri].” Ihe ọ na-ekwu bụ na ibu ụzọ biri abụghị ya bụ okwu; ihe bụ́ okwu bụ ma hà “ji alụmdi na nwunye ha kpọrọ ihe.”

A sịgodị na ihe ahụ o kwuru bụ eziokwu, ihe ọ na-egosi bụ na ọ dị mkpa ile alụmdi na nwunye anya otú Chineke si ele ya. Baịbụl sịrị: “Ka alụmdi na nwunye bụrụ ihe kwesịrị nsọpụrụ n’etiti mmadụ niile.” (Ndị Hibru 13:4) Mgbe nwoke na nwaanyị kwere onwe ha nkwa na ha ga-abụ otu anụ ahụ́, ma na-akwanyere onye bidoro alụmdi na nwunye ùgwù, ha na-adị ka ụdọ a tụkọtara ọnụ, bụ́ nke a na-apụghị ịdọbi ngwa ngwa.—Ekliziastis 4:12.

Ka anyị laghachigodị n’ihe atụ ahụ anyị ji bido. Ọ dị mma ibu ụzọ yitụ uwe ị chọrọ ịzụ tupu ị zụrụ ya. Ma iji ya tụnyere ibu ụzọ biri tupu a lụwa adabaghị adaba. Kama ihe e nwere ike iji tụnyere ya bụ iwepụta ezigbo oge mata onye ị chọrọ ịlụ nke ọma. Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị anaghị eme ihe a dị ezigbo mkpa, ma ọ bụ otu n’ime ihe ndị na-eme ka ezinụlọ na-enwe obi ụtọ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Baịbụl kwuru na ihe nwere ike ime ka di ma ọ bụ nwunye gbaa ibe ya alụkwaghịm ma lụọ onye ọzọ bụ ma otu onye n’ime ha kwaa iko.—Matiu 19:9.

Ì CHETỤLA NKE A NECHICHE?

▪ Gịnị mere Baịbụl ji kwuo na ọ bụ naanị ndị bụ́ di na nwunye kwesịrị inwe mmekọahụ?—Abụ Ọma 84:11; 1 Ndị Kọrịnt 6:18.

▪ Olee àgwà ndị i kwesịrị ịchọ n’onye ị ga-alụ?—Rut 1:16, 17; Ilu 31:10-31.

[Igbe dị na peeji nke 23]

‘Ọ NA-EMEHIE MEGIDE AHỤ́ NKE YA’

Baịbụl kwuru, sị: “Onye na-akwa iko na-emehie megide ahụ́ nke ya.” (1 Ndị Kọrịnt 6:18) Ọ dịbeghị anya o dokwuru anya na ihe a Baịbụl kwuru bụ eziokwu, n’ihi na enweela ọtụtụ nde mmadụ ndị ọrịa o biri n’ájá ọcha na ọrịa ndị ọzọ a na-ebute ná mmekọahụ gburu. Ma ọ bụghị ebe ahụ ka okwu biri. Nchọpụta ndị e mere na-egosi na ndị na-eto eto ndị maliterela inwe mmekọahụ na-aka ada mbà n’obi ma na-achọkarịkwa igbu onwe ha karịa ndị nke na-anaghị enwe mmekọahụ. Ọtụtụ n’ime ndị a na-enwe mmekọahụ na-atụtakwa ime ọkwà. Ụfọdụ n’ime ha na-etekwa ime ahụ. N’ihi ihe ndị a niile, anyị ga-ahụ na ihe Baịbụl kwuru banyere inwe mmekọahụ abụghị ihe ndị mgbe ochie.