Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Mere M Ji Hapụ Ọrụ Na-enye M Ezigbo Ego

Ihe Mere M Ji Hapụ Ọrụ Na-enye M Ezigbo Ego

Ihe Mere M Ji Hapụ Ọrụ Na-enye M Ezigbo Ego

Dị ka Martha Teresa Márquez si kọọ

ỊGỤ egwú na-atọkarị m ụtọ, agụdịrị m egwú na redio mgbe m bụ nwata. Naanị ụlọ akwụkwọ ọta akara ka m gara, ma emechara m gaa mụọ otú m ga-esi mee ka olu m kakwuo mma ma m na-agụ egwú. Amụrụ m ya n’aka onyeisi ndị na-akụzi egwú n’obodo Meksiko Siti.

N’afọ 1969, mgbe m dị afọ iri abụọ na anọ, otu enyi m bụ́ onye na-agba egwú kpọrọ m ka m bịa gụọ egwú n’otu họtel na-ewu ewu n’oge ahụ, a na-akpọ La Rampa Azul, bụ́ ebe a nọ na-ahọrọ ndị ga-agụ egwú. Agụrụ m egwú na-ewu ewu a na-akpọ Cucurrucucú Paloma, nke Tomás Méndez, onye Meksiko na-ede egwú, dere. Egwú ahụ m gụrụ tọkwara ndị niile gere ya ụtọ. Otú ahụ ka ịgụ egwú si ghọọ aka ọrụ m. Amalitere m ịgụ egwú otu onye naanị na-agụ, aha ejikwa mara m bụ Romelia Romel.

Mụ na Tomás Méndez rụkọrọ ọrụ. Mụ na ndị Meksiko ndị ọzọ a ma ama na-ede egwú na ndị na-agụ agụ, ndị dị ka Cuco Sánchez na Juan Gabriel, rụkọkwara ọrụ. Obi na-atọ m ụtọ ma m hụ ebe aha m gbara n’akwụkwọ akụkọ, na magazin nakwa n’ebe ndị ọzọ. Agụrụ m egwú n’ebe a na-eme oriri na nkwari n’abalị, gụọ egwú na redio, nakwa n’ebe dị iche iche n’obodo Meksiko na Beliiz. Mụ na Leonorilda Ochoa, onye Meksiko a ma ama ọrụ ya bụ ịkpa ndị mmadụ ọchị, rụkọkwara ọrụ mgbe ọ ka malitere ime ihe ngosi ya na tiivi n’obodo Meksiko.

Ka oge na-aga, aha m bịara na-ede ude, mụ ana-enwetakwa ezigbo ego. Nke a mere ka m nwee ike ịzụtali ihe ndị dị ka ihe olu na mgbaaka dara oké ọnụ, uwe ndị dara oké ọnụ, nweekwa ike ibi n’ụlọ m na-akwụ ezigbo ego maka ya bụ́ nke dị n’elu elu otu nnukwu ụlọ elu. O yiri ka ụwa ò zuuru m, ma enweghị m obi ụtọ. Ndụ ejughị m afọ. N’agbanyeghị na a mụrụ m na chọọchị Roman Katọlik, ihere anaghị ekwe m gaa chọọchị. Onwe m na-asọ m oyi n’ihi ndụ ọjọọ m na-ebi.

Otú M Si Malite Ịhụ Jehova n’Anya

Otu ụbọchị, mgbe m na-amụ egwú m mbụ e tinyere na teepụ, akọọrọ m Lorena Wong, bụ́ otu enyi m nwaanyị na-agụ egwú a na-akpọ ranchera, otú obi dị m. Agwara m ya na m chọrọ ịbụ onye nọn, ka m nwee ike nyere ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha aka. Ihe ọ jụziri m bụ, “Ị̀ sị na ị chọrọ ịbụ onye nọn? Isi adịghị gị mma.”

Ọ jụkwara m, sị: “Ị̀ ma aha Chineke?”

Ihe m zara ya bụ, “Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.”

Ya asị m, “Mba, aha ya bụ Jehova, Jizọs bụ Ọkpara ya.”

Mụ asị ya, “Ị̀ sị Jehova?” Anụbeghị m aha ahụ mbụ. Lorena nyere m otu Baịbụl ma kwe m nkwa na ya ga-agwa Onyeàmà Jehova na-amụrụ ya Baịbụl ka ọ bịa na nke m. *

Mgbe ọ bụla m hụrụ Lorena, ihe m na-ajụ ya bụ, “Oleekwanụ mgbe onye na-amụrụ gị Baịbụl ga-abịa?” N’eziokwu, ọ na-agụsi m agụụ ike ịmata onye Chineke bụ.

Tupu onye ahụ na-amụrụ enyi m Baịbụl abịa, amalitere m ịgụ Baịbụl n’onwe m ma chọpụta n’eziokwu na aha Chineke bụ Jehova. (Abụ Ọma 83:18) O juru m anya. Agụtakwara m ebe e dere Iwu Iri ahụ, o jukwara m anya ịhụ na otu n’ime ya sị: “Akwala iko.” (Ọpụpụ 20:14) N’oge ahụ, mụ na nwoke lụrụla nwaanyị bi, ọ bụkwa ya bụ nna nwa m nwoke dị ọnwa asatọ. Nwa ahụ bụ nwa m nke abụọ. Enwere m nwa nwoke ọzọ m tụtara ime ya n’aka nwoke ọzọ mụ na ya na-alụghị alụ.

Otu ụbọchị, mgbe m na-amụgharị egwú ọhụrụ m chọrọ ịgụ, mmadụ kụrụ aka n’ọnụ ụzọ m. Ọ bụ Mauricio Linares, onye na-amụrụ Lorena Baịbụl, ya na nwunye ya so bịa. Ha gwara m ihe bụ́ nzube Chineke maka ụmụ mmadụ ma nye m akwụkwọ bụ́ Ezi-Okwu Ahu Nke Nedubà ná Ndu Ebigh-Ebi. * Agụchara m akwụkwọ ahụ n’otu abalị n’agbanyeghị na e nwere okwu ndị siiri m ike nghọta. Ọ bụ mgbe ahụ ka m malitere ịhụ Jehova n’anya.

Amalitere M Ịgbanwe Ndụ M

Ka Ndịàmà Jehova na-enyere m aka ịmụ Baịbụl na ịmụtakwu otú e si agụ ihe, achọpụtara m na ọ dị mkpa ka m gbanwee ndụ m iji mee Jehova obi ụtọ. Amalitere m ịtụfusị ihe ndị a kpụrụ akpụ na ihe ndị e sere ese m ji efe ofufe, nakwa ọtụmọkpọ ndị m weere na ha na-eme ka ihe ọma na-abịara m n’agbanyeghị na e ji ọlaedo mee ha.

O siiri m ezigbo ike ịkwụsị ịṅụ sịga na ịṅụ oké mmanya. M gafewe ebe a na-ere mmanya, mmanya agụwa m. Akwụsịrị m iso ndị enyi m niile na-akpa n’ihi na ha na-enye m mmanya, na-akpọkwa m ka m soro ha gaa n’ụlọ oriri na ọṅụṅụ ndị mara mma. Ama m na m soro ha gaa ebe ndị a, o nweghị ihe ga-eme ka m ghara ịṅụbiga mmanya ókè.

O sikwaara m ike ịkwụsị ịga oriri na ọṅụṅụ ndị oké ozu. Mgbe otu onye Kuba a ma ama na-eti ọkpọ kpọrọ m ka m bịa ememme ụbọchị ọmụmụ ya, agwara m Jehova n’ekpere, sị: “Jehova, biko nke a bụ nke ikpeazụ m ga-aga. M gachaa nke a, agaghị m aga ụdị ememme a ọzọ ma ọ bụkwanụ mee ihe ọ bụla ọzọ na-adịghị gị mma.” Agaghịkwa m ụdị ihe ahụ ọzọ.

Ahapụrụ m nna nwa m nke abụọ, n’agbanyeghị ego niile o nwere nakwa ihe niile o kwere nkwa imere m ma ọ bụrụ na ahapụghị m ya. O siiri m ezigbo ike ịhapụ ya n’ihi na m hụrụ ya n’anya, yanwa makwa na m hụrụ ya n’anya. O tuuru m ọnụ, sị: “Abụ m Chineke gị! Abụ m Kraịst gị!”

Agwara m ya sị, “Ya bụrụgodị na o nwere otú i si bụrụ Chineke m, ugbu a, Jehova bụ Chineke m.” Ọ gwara m na ya ga-akpọrọ nwa m nwoke ahụ m mụụrụ ya, nakwa na ya ga-emerụ m ahụ́.

N’oge ahụ, ụfọdụ ndị gwara m na m ka nwere ike na-agụ egwú, bụrụkwa Onyeàmà Jehova, n’ihi na ịgụ egwú dị ka ọrụ ndị ọzọ ndị mmadụ na-arụ. Ma, ndị ọzọ gwara m, sị, “Ị nọgide na-agụ egwú, o nweghị ihe ga-egbochi gị ịṅụ sịga, ịṅụ mmanya, ma ọ bụ gbochie ụmụ nwoke inyewe gị nsogbu.” Emechara m chọpụta na ndị kwuru nke ikpeazụ a kwuru eziokwu.

Mgbe ahụ m bụ onye a ma ama na-agụ egwú, ndị mmadụ na-enye m ezigbo ego ka m ree ùgwù m. Ekpebisiri m ike na agaghị m etinye onwe m n’ụdị ọnwụnwa ahụ ọzọ. N’ihi ya, n’afọ 1975, agwara m ndị goro m ọrụ ka m gaa gụọ egwú ná mba Chaịna na agaghị m agazi. Mgbe ọnwa isii gachara, aghọrọ m Onyeàmà Jehova e mere baptizim.

Ihe Isi Ike na Ọṅụ Ndị M Nwetara

Olee otú m ga-esi elekọta onwe m na ezinụlọ m? Agaghị m akwụkwọ, o nweghịkwanụ ihe ọzọ m maara eme ma ọ́ bụghị ịgụ egwú. Ọ bụ m na-elekọta Irma, bụ́ nwanne m nwaanyị tọrọ m, na ụmụ ya atọ, nakwa ụmụ m abụọ. Anyị si n’ụlọ ndị oké ozu ahụ anyị bi kwapụ, kwagazie n’obere ọnụ ụlọ abụọ. Ọ dịghịrị anyị mfe irigide na tebụl riwezie n’ala. O nwere oge nwanne m nwaanyị na ụmụaka anyị wesara m iwe, na-agwa m ka m bidokwa gụwa egwú, ma ekpebisiri m ike na m ga-eme ihe ọ bụla m kwesịrị ime iji mee Jehova obi ụtọ.

Ebidoro m rewe ihe ndị dara oké ọnụ m nwere, ma ihe olu na mgbaaka, ma uwe ndị oké ozu, ma ụgbọala m, ka anyị nwee ike hụ ihe anyị ga-eri. Ọ dịghị anya, ego niile ahụ agwụ. Ka nna nwa m nwoke nke abụọ ahụ ghara inye m nsogbu, n’afọ 1981, anyị kwagara n’obodo ukwu ọzọ dị ná mba ahụ ebe ọ na-agaghị achọta anyị.

N’ebe ahụ anyị kwagara, Ndịàmà Jehova kụziiri m otú e si esi otu nri e ji ọka eme a na-akpọ tamale, otú e si eme doonọt na nri ahịa ndị ọzọ, ka m nwee ike na-ere ha. Emechara m nweta ọrụ n’otu ụlọ ọrụ ma na-arụ naanị ọrụ abalị. Ma ọrụ ahụ anaghị ekwe m gachie ọmụmụ ihe na ozi ọma anya. N’ihi ya, emechara m kwụsị ọrụ ahụ ma nọrọ n’ụlọ m na-esi tamale. M sichaa ya, mụ etinye ya na nkata, na-ere ya n’okporo ụzọ. Ọ bụ ihe a m na-ere ka m ji na-enyere onwe m aka ma na-arụ ọrụ ọsụ ụzọ oge niile.

Anaghị M Akwa Mmakwaara ná Mkpebi M Mere

Mgbe ọ bụla ndị mmadụ jụrụ m otú obi dị m kemgbe m kwụsịrị ịgụ egwú, bụ́ ọrụ naara enye m ezigbo ego, ana m agwa ha na o nweghị ihe m ga-eji tụnyere ịmata Jehova na ịghọta ihe ndị o zubere imere ụmụ mmadụ. Enwere m obi ụtọ na ụmụ m abụọ ahụ ji ofufe Chineke kpọrọ ihe ma raara ndụ ha nye Jehova. Ha mechara lụọkwa ndị ji ofufe Chineke kpọrọ ihe. Ụmụ m abụọ ahụ na ndị nwunye ha na-azụkwa ụmụ ha ka ha na-efe Chineke anyị bụ́ Jehova.

Abụ m onye ọsụ ụzọ oge niile, bụ́ ihe Ndịàmà Jehova na-akpọ ndị na-aga ozi ọma oge niile, arụọkwala m ya ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ afọ iri atọ. Site n’enyemaka Chineke, enyerela m ọtụtụ ndị aka ịmụta eziokwu ndị dị na Baịbụl, ha ararakwa onwe ha nye Chineke. Irma nwanne m nwaanyị na nwa ya nwaanyị so ná ndị m nyeere aka. M na-enwe obi ụtọ mgbe ọ bụla m hụrụ ndị ahụ m kụziiri Baịbụl ma hụ na ha na-eje ije n’eziokwu ahụ. Ọtụtụ n’ime ha bụdị ndị ọsụ ụzọ oge niile. (3 Jọn 4) Adị m afọ iri isii na anọ ugbu a, enwekwara m mmadụ iri na asatọ m na-akụziri Baịbụl.

Mgbe m ka na-agụ egwú, ọ na-agụ m agụụ ịma onye Chineke bụ na inyere ndị ọzọ aka. Ma obi dị m ụtọ ugbu a n’ihi na amatala m onye Chineke bụ ma na-erube isi n’iwu ahụ Jizọs nyere, nke bụ́ ‘gaanụ mee ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ m.’ (Matiu 28:19, 20) Obi dị m nnọọ ụtọ na Jehova nọnyeere m n’afọ ndị a niile ma ka na-anọnyere m! N’eziokwu, ‘edetụla m Jehova ire ma hụ na ọ dị mma.’—Abụ Ọma 34:8.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 12 Lorena Wong mechara ghọọ Onyeàmà Jehova.

^ par. 15 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya ma a naghịzi ebipụta ya.

[Foto dị na peeji nke 17]

Mụ na ụmụ m, ndị nwunye ha, na nwanne m nwaanyị, onye mụ na ya ka na-arụ ọrụ ọsụ ụzọ

[Foto dị na peeji nke 18]

M ka na-esi “tamale” na-ere n’okporo ụzọ iji na-enyere onwe m aka n’ọrụ ọsụ ụzọ oge niile m na-arụ