Olee Otú M Ga-esi Na-elekwu Onwe M Anya Ka Onye Bara Uru?
Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
Olee Otú M Ga-esi Na-elekwu Onwe M Anya Ka Onye Bara Uru?
EE EE E
I lee onwe gị n’enyo, otú ị dị ◯ ◯
ọ̀ na-amasị gị?
Ọ̀ dị gị ka e nwere ihe ndị ◯ ◯
ị ma eme nke ọma?
Ị̀ ga-agwali ndị ọgbọ gị na ị gaghị eme ihe ◯ ◯
na-adịghị mma ha chọrọ ka i mee?
A baara gị mba maka ihe ◯ ◯
ị na-emetaghị, ị̀ na-edili ya?
Ndị ọzọ kwuo okwu ọjọọ banyere gị, ị̀ na-edili ya? ◯ ◯
Ì chere na ndị mmadụ hụrụ gị n’anya? ◯ ◯
Ị̀ na-elebara onwe gị anya? ◯ ◯
Obi ọ̀ na-adị gị ụtọ ma ndị ọzọ mee nke ọma? ◯ ◯
Ọ̀ dị gị ka ị na-eme nke ọma n’ihe ndị ị na-eme? ◯ ◯
Ọ bụrụ na ị zara ee e n’ọtụtụ n’ime ajụjụ ndị a, o nwere ike ịbụ na ị naghị ekweta na ọ dị ihe ị ma eme n’ihi na ọ na-adị gị ka ị baghị uru. Isiokwu a ga-enyere gị aka ịchọpụta na o nwere ihe ị dị mma ya!
ỌTỤTỤ ndị na-eto eto na-echegbukarị onwe ha n’ihi na ọ na-adị ha ka hà jọrọ njọ, na o nweghị ihe ha ma eme, nakwa na o nweghị ebe ha ruru eru ma e jiri ha tụnyere ndị ọgbọ ha. Ọ̀ na-adị gị otú ahụ? Ọ bụrụ na ọ na-adị gị otú ahụ, e nwere ọtụtụ ndị ọ dị ka ọ dị gị!
● “Ihe ndị m na-anaghị emete na-eme ka obi na-ajọ m njọ. Ọ bụ m na-akacha akatọ onwe m.”—Leticia. *
● “Otú ọ sọkwara gị maruo ná mma, ị ga na-ahụ ndị makara gị ná mma.”—Haley.
● “Ahụ́ anaghị eru m ala ma mụ na ndị mmadụ nọrọ. Ọ na-adị m ka ndị ọzọ hà ga-elewe m anya ka onye na-amaghị ihe.”—Rachel.
Ọ bụrụ na ọ na-adị gị otú ahụ ọ dị Haley na Rachel, echela na olileanya adịghị. E nwere ihe ga-enyere gị aka. Lee ihe atọ ga-enyere gị aka ịna-elekwu onwe gị anya ka onye bara uru.
1. Mete Ndị Enyi
Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka. “Ezi enyi nwere ịhụnanya mgbe niile, ọ bụkwa nwanne a mụrụ maka oge nsogbu.”—Ilu 17:17.
Ihe ọ pụtara. Ezi enyi nwere ike inyere gị ezigbo aka mgbe ị nọ ná nsogbu. (1 Samuel 18:1; 19:2) Ichetadị na e nwere onye ga-enyere gị aka nwere ike ime ka obi dị gị mma. (1 Ndị Kọrịnt 16:17, 18) N’ihi ya, gị na ndị ga-eme ka obi na-adị gị mma na-akpa.
“Ezigbo ndị enyi agaghị ekwe ka obi na-ajọ gị njọ.”—Donnell.
“Mgbe ụfọdụ, ihe na-akacha mkpa bụ icheta na o nwere onye ihe gbasara gị na-emetụ n’obi. Nke ahụ nwere ike ime ka ị mara na ị bara uru.”—Heather.
Ebe ị ga-akpachara anya: Hụ na ndị enyi gị bụ ndị ga-eme ka ị na-akpa àgwà otú i si akpa, ọ bụghị ndị ị ga-ahụ gị agbanwee otú i si akpa àgwà n’ihi na ị chọrọ ka ị dị ka ha. (Ilu 13:20; 18:24; 1 Ndị Kọrịnt 15:33) Ịkpa àgwà ndị na-adịghị mma naanị ka i mee ndị ọzọ obi ụtọ ga-eme ka obi jọwakwuo gị njọ.—Ndị Rom 6:21.
Ihe ị ga-eme. N’okpuru ebe a, dee aha otu enyi gị ị maara na o nwere ike inyere gị aka ka ị na-elekwu onwe gị anya ka onye bara uru.
․․․․․
Í cheghị na ọ ga-adị mma ma i wepụta oge ka gị na onye ahụ i dere aha ya nọrịa? Buru ihe a n’obi: Ọ bụghị iwu na onye ahụ ga-abụ ọgbọ gị.
2. Na-enyere Ndị Ọzọ Aka
Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka. “A na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.”—Ọrụ 20:35.
Ihe ọ pụtara. Mgbe ị na-enyere ndị ọzọ aka, ị na-enyere onwe gị aka. Olee otú nke a si bụrụ eziokwu? Otu ilu Baịbụl, sịrị: “Mkpụrụ obi nke na-emesapụ aka ka a ga-eme ka ọ maa abụba, onye na-emekwa ka ndị ọzọ ṅụjuo mmiri afọ ka a ga-emekwa ka ọ ṅụjuo mmiri afọ.” (Ilu 11:25) N’eziokwu, ị ga-enwe obi ụtọ ma i nyere ndị ọzọ aka! *
“Ana m eche otú m ga-esi enyere ndị ọzọ aka, m na-agbalịkwa inyere onye ọgbakọ anyị nwere mkpa aka. Imere ndị ọzọ ihe na ịnọnyere ha na-enye m obi ụtọ.”—Breanna.
“Ihe mere ịga ozi ọma ji magbuo onwe ya bụ na ọ na-eme ka mmadụ kwụsị iche maka onwe ya, chewezie maka ndị ọzọ.”—Javon.
Ebe ị ga-akpachara anya: Enyerela ndị ọzọ aka naanị n’ihi na o nwere ihe ị ga-erite n’aka ha. (Matiu 6:2-4) Inyere ndị ọzọ aka n’ihi na ị chọrọ irite ihe n’aka ha agaghị abara gị uru. Ndị mmadụ na-achọpụtakarị na onye na-eme otú ahụ bụ onye ihu abụọ!—1 Ndị Tesalonaịka 2:5, 6.
Ihe ị ga-eme. Gbalịa cheta otu onye i nyetụụrụla aka. Ònye ka ọ bụ, gịnịkwa ka i meere ya?
․․․․․
Olee otú obi dị gị mgbe i mechaara ya ihe ahụ?
․․․․․
Gbalịa cheta onye ọzọ i nwere ike inyere aka ma dee ihe i nwere ike imere onye ahụ.
․․․․․
3. Ekwela Ka Ihe Ndị Ị Na-emetaghị Kụda Gị Mmụọ
Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka. “Mmadụ niile emehiewo, ha adịghịkwa eru ebube Chineke.”—Ndị Rom 3:23.
Ihe ọ pụtara. Nke bụ́ eziokwu bụ na ị bụ onye na-ezughị okè. Nke a pụtara na o nwere oge ị ga-ekwu ihe ị na-ekwesịghị ikwu ma ọ bụdị mee ihe ị na-ekwesịghị ime. (Ndị Rom 7:21-23; Jems 3:2) Ọ bụ eziokwu na ị gaghị agbanahụ imejọ ihe ụfọdụ, ma o nwere ihe i nwere ike ime ka ihe i mejọrọ ghara iwutebiga gị ókè. Baịbụl sịrị: “Onye ezi omume nwere ike ịda ọbụna ugboro asaa, ma ọ ga-ebilicha.”—Ilu 24:16.
“Mgbe ụfọdụ, ihe na-eme ka mmadụ chewe na o nweghị uru ya bara bụ mgbe o ji ebe ndị ọ na-adịghị eme nke ọma na-atụnyere ebe onye ọzọ na-eme nke ọma.”—Kevin.
“Onye ọ bụla nwere ebe ọ na-eme nke ọma na ebe ọ na-adịghị eme nke ọma. Anyị kwesịrị inwe obi ụtọ n’ebe anyị na-eme nke ọma ma gbalịa na-emezi ebe anyị na-anaghị eme nke ọma.”—Lauren.
Ebe ị ga-akpachara anya: Agbakwasịkwala ụkwụ n’ezughị okè na-eme mmehie. (Ndị Galeshia 5:13) Ịkpachara anya na-eme mmehie ga-emebi adịm ná mma gị na Jehova Chineke, bụ́kwanụ onye adịm ná mma gị na ya kacha dịrị mkpa!—Ndị Rom 1:24, 28.
Ihe ị ga-eme. N’okpuru ebe a, dee otu àgwà ị na-anaghị eme nke ọma na ya, nke ị ga-achọkwa ime ka ọ ka mma.
․․․․․
N’akụkụ ebe i dere àgwà ahụ, dee ụbọchị i dere ya. Mee nchọnchọ iji chọpụta otú ị ga-esi mee ka àgwà ahụ ka mma. Otu ọnwa gaa, tụlee otú ị gbalịruru.
Ị Ka Bara Uru
Baịbụl kwuru na “Chineke karịrị obi anyị.” (1 Jọn 3:20) Nke a pụtara na Chineke na-ahụ uru ị bara karịa ka gịnwa si ahụ ya. Ma ebe ndị ị na-emejọ n’ihi na i zughị okè ọ̀ ga-eme ka Chineke were na ị baghịzi uru? Weregodị ya na i nwere otu puku naịra bụ́ otu akwụkwọ ego, ma o nwere ebe ọ dọkara adọka. Ị̀ ga-etufu ya ma ọ bụ were na ọ baghịzi uru n’ihi na o nwere ebe dọkara adọka na ya? Mbanụ! Ọ ka bụkwa otu puku naịra—ma ò nwere ebe dọkara adọka ma ọ bụ na o nweghị.
Otú ahụ ka Chineke si were gị. Ọ na-ahụ mbọ ndị ị na-agba iji hụ na ị na-eme ihe na-atọ ya ụtọ, o jikwa ha kpọrọ ihe, ọ sọkwa ya ya bụrụ na o nweghị ka ha hà aha n’anya gị! N’eziokwu, Baịbụl na-eme ka obi sie anyị ike na “Chineke abụghị onye ajọ omume ichefu ọrụ [anyị] na ịhụnanya [anyị] gosiri maka aha ya.”—Ndị Hibru 6:10.
Ị gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.watchtower.org/ype ị ga-ahụ ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu a bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị”
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 15 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.
^ par. 30 Ọ bụrụ na ị bụ Onyeàmà Jehova, otu ụzọ ị ga-esi enweta ezigbo obi ụtọ bụ ikwusara ndị ọzọ ozi ọma Alaeze ahụ.—Aịzaya 52:7.
IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE
Gịnị ka ị ga-eme ma obi jọwa gị njọ n’ihi na
● Ndị ọgbọ gị na-akatọ gị?
● Ọ dị gị ka ndị ọzọ ka gị mma?
● O yiri ka naanị ihe ị na-ahụ bụ ebe ndị ị na-emejọ?
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 27]
“Mmadụ nwere ike ịma ezigbo mma ma ya ana-adị ya ka ọ̀ jọrọ njọ. Ma ọ bụkwanụ onye na-amachaghị mma nwere ike iwere na ya kacha mma n’ụwa. Ihe niile a si n’otú mmadụ si ele ihe anya.” —Alyssa
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 27]
IHE NDỊ NA-ETO ETO IBE GỊ KWURU
“Ọtụtụ mgbe, ihe na-agba m ume bụ okwu ọma enyi m gwara m ma ọ bụdị ọnụ ọchị mmadụ mụmụụrụ m ma ọ bụ otú mmadụ si makụọ m.”
“Kama iwewe iwe n’ihi àgwà ọma ndị ọzọ nwere, anyị kwesịrị ịgbalị ka anyị si n’aka ha mụta ihe, dịkwa ka hanwa nwere ike isi n’aka anyị mụta.”
[Foto]
Aubrey
Lauren
[Foto dị na peeji nke 28]
Otu puku naịra bụ́ otu akwụkwọ ego ka ga-azụtali ihe otu puku naịra ga-azụta, ọ sọgodị ya ya bụrụ na o nwere ebe dọkara adọka. N’otu aka ahụkwa, Chineke adịghị ewere na ị baghịzi uru n’ihi na i zughị okè