Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | ỊZỤ ỤMỤ

Ihe I Nwere Ike Ime ma Nwa Gị Bido Ime Isi Ike Ụmụaka

Ihe I Nwere Ike Ime ma Nwa Gị Bido Ime Isi Ike Ụmụaka

IHE MERE NA Ọ DỊGHỊ MMA

Ọ bụrụ na nwa gị eruo afọ abụọ, o nwere ike malite mewe isi ike ụmụaka. Ahụ́ gbakasịwa ya, o nwere ike tiwe mkpu ákwá ma ọ bụ mebisiwe ihe ọ bụla ruru ya aka. O nwedịrị ike tiwe onye nọ ya nso ihe ma ọ bụdị tawa ya arụ. O mewe ihe a niile, i nwere ike iche na o nwere ihe na-enye ya nsogbu, ma ọ bụkwanụ na ị na-emegbu ya emegbu. I nwedịrị ike ichewe ma ọ̀ ga-akwụsịkwa àgwà ọjọọ a.

Ma, i nwere ike inyere nwa gị aka ka ọ kwụsị ịkpa àgwà a. Ka anyị buru ụzọ tụlee ihe ndị nwere ike ime ka nwa gị na-eme isi ike ụmụaka.

IHE MERE ỤMỤAKA JI EME ISI IKE

Ụmụaka anaghị ejideli onwe ha ma iwe bịa ha. Ọ bụ ya mere ha ji eme isi ike oge ụfọdụ. Ma, e nwere ihe ndị ọzọ mere ha ji eme isi ike ụmụaka.

Ọ bụrụ na nwata eruo afọ abụọ, ọtụtụ ihe na-agbanwe ná ndụ ya. Mgbe a mụrụ ya ọhụrụ, nne na nna ya na-apa ya apa, na-emere ya ihe ọ bụla ọ chọrọ. Dị ka ihe atụ, o behaala ákwá, ha agbara bịa gụgụwa ya. Ha ga-achọ ịma ma ọ̀ bụ ahụ́ adịghị ya ka ọ̀ bụ agụụ na-agụ ya ka ọ̀ bụ na ọ nyụọla mamịrị na napkịn. Ha na-emere ya ihe ọ bụla ga-eme ka obi dị ya mma. Nke bụ́ eziokwu bụ na e kwesịrị imere nwatakịrị ihe ndị a n’ihi na o nweghị ihe ọ ga-emeliri onwe ya.

Ma, mgbe nwatakịrị ruru ihe dị ka afọ abụọ, ọ na-achọpụta na nne na nna ya anaghịzi emere ya ihe niile otú ha si emebu. Ha na-achọzi ka ọ na-eme ihe ọ bụla ha gwara ya kama hanwa ime ihe ọ bụla ọ chọrọ. Egwú adagharịala. Ma, otú a ihe si na-agbanwe agaghị adị nwatakịrị ahụ mma, o nwere ike malite ime isi ike.

Ka oge na-aga, nwata ahụ ga-amata na nne na nna ya abụghị naanị ndị na-elekọta ya kama na ha kwesịrị ịna-agwa ya ihe ọ ga na-eme. Ọ ga-aghọtakwa na ya kwesịrị ịna-erubere ha isi. (Ndị Kọlọsi 3:20) Ma, tupu ọ malite irubere ha isi, ọ ga-emetụ isi ike.

IHE Ị GA-EME

Ghọta ihe mere o ji eme otú ahụ. Nwa gị enwebeghị ihe ọ ma. O nwere ike ịna-emebisi ihe ma iwe wewe ya n’ihi na ọ nweghị ike ijideli onwe ya. Ọ bụrụ na ị ghọta ihe mere o ji eme otú ahụ, ị ga-enwe ike inyere ya aka.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: 1 Ndị Kọrịnt 13:11.

Ejila iwe eme ihe ọ bụla. Ọ baghị uru ka i wewe iwe ma nwa gị malite ime isi ike. Gbalịa lefuru ihe ọ na-eme anya ma mee ihe i kwesịrị ime. Ọ bụrụ na i cheta ihe mere nwa gị ji akpa àgwà a, ọ ga-eme ka ị ghara iji iwe mebie ihe.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 19:11.

Kwụsie ike n’ihe i kwuru. Ọ bụrụ na ị na-eme ihe ọ bụla nwa gị chọrọ ka i mee, ọ ga-emere gị isi ike mgbe ọ bụla ị na-emeghị ihe ọ chọrọ. Mee ka ọ ghọta na ọ bụ ihe i kwuru ka ị ga-eme.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Matiu 5:37.

Ọ bụrụ na i cheta ihe mere nwa gị ji akpa àgwà a, ọ ga-eme ka ị ghara iji iwe mebie ihe

Nwee ndidi. Echela na nwa gị ga-akwụsị ime isi ike n’otu ntabi anya, nke ka nke ma ọ bụrụ na ọ na-abụ o mehaala isi ike i meere ya ihe ọ chọrọ. Ma, ọ bụrụ na ị na-eme ihe i kwesịrị ime, ọ ga-eji nwayọọ nwayọọ kwụsị ime isi ike. Cheta na Baịbụl kwuru na “ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi.”—1 Ndị Kọrịnt 13:4.

I nwekwara ike ime ihe ndị a:

  • Nwa gị malite isi ọnwụ, jide ya aka ka ọ ghara ịna-emebisi ihe, etikwala ya ihe. Ejila oké olu agwa ya okwu. Hapụ ya ka isi jụọ ya oyi. Ọ ga-emecha ghọta na isi ike ahụ ọ na-eme enweghị uru ọ bara.

  • Ọ ga-adị mma ma i nwee ebe ị ga na-akpọga nwa gị ma o mewe isi ike, isi jụọ ya oyi, gị akpọpụta ya.

  • Ọ bụrụ na nwa gị amalite isi ọnwụ n’ebe ndị mmadụ nọ, kpọpụ ya n’akụkụ. Ejila maka na ndị mmadụ nọ ebe ahụ meere ya ihe ọ chọrọ. I meere ya ihe ọ chọrọ, ọ ga-eche na ị ga na-emere ya ihe ọ bụla ọ chọrọ ma o mehaala isi ike.