IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | DI NA NWUNYE
Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịna-ege Ntị nke Ọma
IHE MERE O JI ARA AHỤ́
Nwaanyị nwere ike ịsị di * ya: “Ntị gị adịghị n’ihe m na-ekwu.” Di ya asị ya na ya na-anụ. Ma, ihe ọ nụrụ abụghị ihe o kwuru. Ihe a nwere ike isewere ha okwu.
O nwere ihe ị ga-eme ka ụdị ihe a ghara ịna-eme. Ka anyị kwugodị ihe nwere ike ime ka ị ghara ịnụ ihe nwunye gị kwuru n’agbanyeghị na i chere na ntị gị dị n’ihe ọ na-ekwu.
IHE NWERE IKE ỊKPATA YA
Ọ bụrụ na ị na-eche ihe ọzọ ma ọ bụ na ike gwụchara gị. Were ya na ụmụaka na-eme ụzụ, tiivi ana-ekwu, ị nọkwa na-eche banyere otú gị na ihe si gaa n’ụlọ ọrụ. Nwunye gị abịa na-agwa gị banyere onye ga-abịa ileta unu n’abalị ahụ. Ya ekwuchaa, gị ekwee n’isi. Ma, o nwere ike ịbụ na ị nụghị ihe o kwuru.
Ya kwuo ihe ọzọ, uche gị agbaga ebe ọzọ. Onye na-eme ụdị ihe a na-eme nwunye ya gwa ya ihe, uche ya agbaga ebe ọzọ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na nwunye gị asị: “Ị naghị alọtazi ọrụ n’oge kemgbe izu a.” I nwere ike iche na ọ na-agwa gị okwu ọjọọ. Gị asị ya: “Ihe mere anaghị m alọtazi n’oge bụ ka m nwetakwuo ego ị ga-eji na-azụ nta na imoroko a ị na-azụ.” O nwere ike iji iwe gwa gị na ọ bụghị okwu ọjọọ ka ya na-agwa gị kama na ya chọrọ ka gị na ya nọrịa na Satọdee nakwa na Sọnde.
Ọ bụrụ na ebe obi gị na-adị bụ n’ihe a ga-eme. Otu nwaanyị kwuru na ọ na-abụ ya na-agwa di ya ihe na-enye ya nsogbu, obi ya adịrị n’ihe a ga-eme ka ihe dị mma. Ọ naghị ebu ụzọ ege ntị ka ọ mara ihe bụ́ nsogbu ya. O kwukwara, sị: “Ihe bụ mkpa m abụghị ihe a ga-eme ka ihe dị mma, kama ọ bụ ka o burugodị ụzọ nụkwanụ ihe na-enye m nsogbu.” Gịnị mere ntị di nwaanyị a anaghị adị n’ihe nwunye ya na-ekwu? Ọ na-abụ nwunye ya na-agwa ya okwu ya anọrọ na-eche ihe ọ ga-eme, n’ebughị ụzọ nụ ihe ọ chọrọ ịgwa ya.
Gịnị ga-enyere gị aka ịna-ege nwunye gị ntị nke ọma ma ọ na-agwa gị okwu?
IHE I NWERE IKE IME
Na-ege ntị nke ọma. Ọ bụrụ na o nwere ihe dị mkpa nwunye gị chọrọ ịgwa gị ya abụrụ na o nwere ebe obi gị dị, emela ka ị̀ na-ege ntị. Ọ ga-aka mma ma ị hapụgodị ihe ahụ gewe ntị n’ihe ọ na-ekwu ma ọ bụkwanụ gị agwa ya na ị ka ji ihe n’aka ka o chere ka i mechaa.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Jems 1:19.
Anapụla ya okwu n’ọnụ. Mgbe nwunye gị na-ekwu okwu, gee ya ntị nke ọma. Ya kwuchaa, gị ekwuwezie ihe ị chọrọ ikwu.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 18:13.
Jụọ ya ajụjụ. Ọ bụrụ na ihe nwunye gị na-agwa gị edoghị gị anya, jụọ ya ajụjụ ka i wee ghọta ihe ọ na-ekwu. Nwaanyị ahụ anyị kwuru okwu ya na mbụ kwuru na obi na-adị ya mma ma di ya na-ajụ ya ajụjụ mgbe ọ na-agwa ya ihe. O kwuru na ime otú ahụ na-egosi na ọ chọrọ ịghọta ihe ọ na-ekwu.
Chọpụta ihe ihe o kwuru pụtara. Cheta na otú mmadụ si emegharị ahụ́ mgbe ọ na-ekwu okwu, otú ihu ya dị na otú olu ya si ada na-egosi otú ihe ọ na-ekwu si dị ya n’obi. Otú mmadụ si kwuo “Ọ dị mma” nwere ike igosi na ihe ọ na-ekwu bụ “Ọ dịghị mma.” Ọ bụrụ na nwunye gị asị gị “Ị naghị enyere m aka,” o nwere ike ịbụ na ihe ọ na-ekwu bụ na ọ dịghị ihe i ji ya kpọrọ. Gbalịa chọpụta ihe ọ chọrọ ikwu. Ọ bụrụ na ị chọpụtaghị ihe ọ chọrọ ikwu, ihe i chere na o kwuru nwere ike isere unu okwu.
Gee ntị n’ihe ọ bụla ọ na-ekwu. Ọ bụrụgodị na ihe nwunye gị na-agwa gị adịghị gị mma, ahapụla ya pụwa. Dị ka ihe atụ, gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na nwunye gị na-akatọ ihe i mere? Otu nwoke lụrụla nwaanyị ihe karịrị iri afọ isii kwuru, sị “Na-ege ya ntị. Chebara ihe ọ na-ekwu echiche. Ọ naghị adị mfe, ma ọ ga-abara gị uru ma i gee ya ntị nke ọma.”—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 18:15.
Nwee mmasị n’ihe ọ na-ekwu. Ọ bụrụ na ị na-ege ntị mgbe nwunye gị na-agwa gị okwu, ọ ga-egosi na ị hụrụ ya n’anya. Ọ bụrụkwa na ọ na-amasị gị ịnụ ihe nwunye gị na-ekwu, ọ ga-adịrị gị mfe ige ya ntị mgbe ọ bụla ọ chọrọ ịgwa gị ihe. Ọ bụrụ na ị na-eme otú a, ọ ga-egosi na ị na-eme ihe dị ná Ndị Filipaị 2:4. Ebe ahụ sị: “Na-elekwasị anya, ọ bụghị naanị n’ọdịmma onwe unu, kamakwa n’ọdịmma nke ndị ọzọ.”
^ para. 4 Ihe e kwuru n’isiokwu a gbasakwara ụmụ nwaanyị ndị nọ na di.