Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE BAỊBỤL KWURU

Ụmụ Anụmanụ

Ụmụ Anụmanụ

O nweghị onye nọ n’ụwa ga-asị na ụmụ anụmanụ abaraghị ya uru. Ànyị ga-aza Chineke ajụjụ gbasara otú anyị si na-emeso ụmụ anụmanụ?

Olee otú ụmụ mmadụ kwesịrị isi na-emeso ụmụ anụmanụ?

IHE NDỊ MMADỤ NA-EKWU

Ụfọdụ ndị na-ekwu na anyị nwere ike ime ụmụ anụmanụ ihe ọ bụla anyị chọrọ. Ndị ọzọ ana-ekwu na anyị kwesịrị ịna-emeso ụmụ anụmanụ otú anyị si emeso mmadụ ibe anyị.

  • Otu nwoke na-ahụ na a naghị arụsa ụmụ anụmanụ arụrụala kwuru na e kwesịghị ịna-eji ha akpa ego ma ọ bụkwanụ na-eme ha ihe ọ bụla masịrị anyị.

  • E nwere otu nwaanyị aha ya bụ Leona Helmsley. Nwaanyị a nwere ezigbo ego. Mgbe ọ na-ede otú a ga-esi kee akụnụba ya ma ọ nwụọ, o kwuru ka e jiri ihe karịrị ijeri naịra abụọ na-elekọta nkịta ya, kwuokwa ka e lie nkịta ahụ n’akụkụ ili ya ma ọ nwụọ.

Ihe ị ga-echebara echiche: Olee otú i chere anyị kwesịrị isi na-emeso ụmụ anụmanụ?

IHE BAỊBỤL KWURU

Jehova Chineke bụ́ Onye kere ihe niile kwuru na azụ̀ ndị dị n’oké osimiri, anụ ufe nke eluigwe na ihe ọ bụla e kere eke dị ndụ nke na-agagharị n’elu ala ga-anọ n’okpuru ụmụ mmadụ. (Jenesis 1:28) N’ihi ya, o doro anya na Chineke kere ụmụ anụmanụ ka ha nọrọ n’okpuru ụmụ mmadụ.

Ihe Baịbụl kwuru tupu ya ekwuo ihe ahụ dị na Jenesis 1:28 gosikwara na ụmụ anụmanụ ga-anọ n’okpuru ụmụ mmadụ. Baịbụl kwuru, sị: “Chineke wee kee mmadụ n’onyinyo ya, ọ bụ n’onyinyo Chineke ka o kere ya; nwoke na nwaanyị ka o kere ha.”—Jenesis 1:27.

Otú Chineke si kee anyị pụrụ iche n’ihi na o kere anyị “n’onyinyo ya.” Ihe ọ pụtara bụ na o kere anyị ka anyị nwee amamihe, hụ ndị ọzọ n’anya ma na-ekpe ikpe ziri ezi ka yanwa. O kekwara anyị otú ọ ga na-agụ anyị agụụ ife ya, nweekwa ike ịmata ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi. Ụmụ anụmanụ agaghị emeli ihe ndị a n’ihi na Chineke ekeghị ha “n’onyinyo ya.” E kere ha ka ha nọrọ n’okpuru ụmụ mmadụ, ọ bụghị ka a na-emeso ha otú e si emeso ụmụ mmadụ.

Ọ̀ pụtaranụ na ụmụ mmadụ ga na-arụsa ụmụ anụmanụ arụrụala? Mba.

  • N’Iwu Chineke nyere ụmụ Izrel, o kwuru ka a na-enye ụmụ anụmanụ nri nakwa na o nwere mgbe a ga-ahapụ ndị nke e ji arụ ọrụ ka ha zuo ike. O kwukwara ka e nyere ha aka ma ha baa ná nsogbu nakwa ka a ghara ikwe ka ha merụọ ahụ́.—Ọpụpụ 23:4, 5; Diuterọnọmi 22:10; 25:4.

“Ụbọchị isii ka ị ga-arụ ọrụ gị; ma n’ụbọchị nke asaa, arụla ọrụ, ka ehi gị na ịnyịnya ibu gị wee zuo ike, ka nwa ohu gị nwaanyị na onye mbịarambịa wee nweta ume.”Ọpụpụ 23:12.

Igbu ụmụ anụmanụ ọ̀ bụ ihe ọjọọ?

IHE NDỊ MMADỤ NA-EKWU

Ụfọdụ ndị na-agba nta na ndị na-akụ azụ̀ na-ama ụma gbuo anụmanụ ma ọ bụ azụ̀ ha na-achọghị iji mee ihe ọ bụla. Ịchụgharị ha na igbu ha na-atọ ha ụtọ. Ndị ọzọ kwetara ihe otu nwoke Rọshịa na-ede akwụkwọ kwuru. Aha nwoke ahụ bụ Leo Tolstoy. O kwuru na igbu ụmụ anụmanụ na iri ha bụ ihe ọjọọ.

IHE BAỊBỤL KWURU

Chineke kwuru na ụmụ mmadụ nwere ike igbu anụmanụ ma ọ bụrụ na ọ ga-emerụ ha ahụ́. E nwekwara ike igbu ha ma ọ bụrụ na a chọrọ iji ha nweta ihe a na-eyi eyi. (Ọpụpụ 21:28; Mak 1:6) Baịbụl kwukwara na anyị nwere ike igbu ụmụ anụmanụ rie. Jenesis 9:3 kwuru, sị: “Anụ ọ bụla na-agagharị agagharị nke dị ndụ pụrụ ịbụrụ unu ihe oriri.” Ihe ọzọ bụ na Jizọs nyeere ndị na-eso ụzọ ya aka, ha egbute azụ̀ ha riri.—Jọn 21:4-13.

Ma, Baịbụl kwuru na Chineke “kpọrọ onye ọ bụla nke hụrụ ime ihe ike n’anya asị.” (Abụ Ọma 11:5) N’ihi ya, o doro anya na Chineke achọghị ka anyị merụọ ụmụ anụmanụ ahụ́ ma ọ bụkwanụ mara ụma gbuo ha n’enweghị ihe anyị ji ha eme.

Ihe Baịbụl kwuru na-egosi na Chineke ejighị ndụ ụmụ anụmanụ egwu egwu.

  • Baịbụl kwuru na mgbe Chineke na-eke ihe, o mere “anụ ọhịa nke ụwa n’ụdị ya dị iche iche nakwa anụ ụlọ n’ụdị ya dị iche iche nakwa anụ ọ bụla ọzọ na-agagharị agagharị nke ala n’ụdị ya dị iche iche. Chineke wee hụ na ọ dị mma.”Jenesis 1:25.

  • Baịbụl kwuru gbasara Jehova, sị: “Ọ na-enye anụmanụ ihe oriri ha.” (Abụ Ọma 147:9) Chineke kere ụwa otú ọ ga-eme ka ụmụ anụmanụ na-enweta nri ga-ezuru ha, hụkwa ebe ha ga-ebi.

  • Mgbe Eze Devid na-ekpe ekpere, ọ sịrị: “Jehova, ị na-azọpụta mmadụ na anụmanụ.” (Abụ Ọma 36:6) Dị ka ihe atụ, mgbe Jehova ji Iju Mmiri zuru ụwa ọnụ bibie ndị ajọ omume, o chebere mmadụ asatọ na ụdị anụmanụ dị iche iche.—Jenesis 6:19.

O doro anya na Jehova anaghị eji ụmụ anụmanụ egwu egwu. Ọ chọghịkwa ka ụmụ mmadụ na-arụsa ha arụrụala.

“Onye ezi omume na-elekọta mkpụrụ obi anụ ụlọ ya.”Ilu 12:10.