Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE NDỊ NA-EME N’ỤWA

Akụkọ Gbasara Ala, Mmiri, na Ikuku

Akụkọ Gbasara Ala, Mmiri, na Ikuku

Ụwa na-emepụta nri ndị na-edozi ahụ́, ezigbo mmiri dịkwa na ya. Ikuku ndụ jukwara eju n’ụwa. Ma, ụmụ mmadụ na-emebisi ihe ndị a niile. Ndị ọkà mmụta sayensị na-agbakwa mbọ ka ha hụ ma è nwere ihe a ga-eme ka ụwa dị otú o kwesịrị ịdị.

Ọstrelia

Ndị ọkachamara kwuru na e gwuo ala ala oké osimiri, e nwere ike inweta mmiri na-enweghị oké nnu. Ihe otu ọkà mmụta aha ya bụ Vincent Post kwuru ga-enyere anyị aka ịghọta ihe a ndị ọkachamara kwuru. O kwuru na oké osimiri anaghị etoru otú ọ na-etoru taa ná mbụ, nke gosiri na ụfọdụ ala ndị dị n’ime oké osimiri ugbu a bụbu ala nkịtị. O kwukwara na n’oge ahụ, mmiri na-ezo, ala ana-amịkọrọ ya. Mgbe mmiri mechara too, ala ndị ahụ ghọziri ala oké osimiri, ma mmiri ozuzo ndị ahụ ha mịkọọrọ ka dị n’ime ha. Ndị ọkà mmụta sayensị kwuru na ha na-atụ anya na ụfọdụ n’ime ihe karịrị narị nde mmadụ asaa na-enweghị ezigbo mmiri ọṅụṅụ nwere ike isi n’ala ndị ahụ nọzi n’oké osimiri nweta ezigbo mmiri.

Ọzara Sahara

E kee nnukwu ụmụ anụmanụ ndị nọ n’ọzara Sahara ụzọ abụọ, otu ụzọ n’ime ha adịghịzi. Ọ bụrụgodị na e nwere ndị nke ka dị, ha dịzi ole na ole. Agha na nta ndị mmadụ na-achụ so n’ihe na-eme ka ha na-agwụ n’ike n’ike. N’agbanyeghị na ụdị osisi na ụmụ anụmanụ dị iche iche dị n’ọzara otú ọ dịkwa n’oké ọhịa, ndị na-eme nchọpụta kwuru na ihe mere na a naghị elebachara ha anya bụ na a naghị ewepụta ego a ga-eji na-elekọta ha. N’ihi ya, ọ na-esiri ndị ọkà mmụta ike ịhụ na e gbukpọghị ụmụ anụmanụ na osisi ndị dị n’ọzara.

Ụwa

Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike kwuru na n’ime mmadụ asatọ ọ bụla nwụrụ n’afọ 2012, ihe gburu otu n’ime ha bụ ikuku ọjọọ o kuuru. Ha kwukwara na ọ bụ mmetọ a na-emetọ ikuku bụ ihe kacha egbu ndị mmadụ taa.