Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU TETA! A | NDỤ GỊ Ọ̀ DỊ OTÚ Ị CHỌRỌ KA Ọ DỊRỊ?

Ị̀ Ga-emeli Ka Ndụ Gị Na-aga Otú Ị Chọrọ?

Ị̀ Ga-emeli Ka Ndụ Gị Na-aga Otú Ị Chọrọ?

O nweghị onye ụwa zuuru. Ihe na-eme ka ndụ na-atọ ụtọ abụghị ihe ole mmadụ nwere, kama ọ bụ mmadụ itinyere ụwa ya obiọma. Ihe na-enyerekarị mmadụ aka ka nsogbu ndị o nwere ghara ịnyịgbu ya bụ iwere ụwa ya otú o si hụ ya ma gbalịa hụ na ọ na-eme otú ike kwere ya. Ọ bụrụ na ọnọdụ gị agbanwetụ n’agbanyeghị ụdị nsogbu gị na ya na-alụ, ọ dị mma. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụ n’ọdịnihu ka ihe ga-akacha adị mma.

Chineke kwere anyị nkwa na oge na-abịa mgbe ndụ ụmụ mmadụ ga na-atọ ha ụtọ n’ihi otú ihe ga-esi na-aga nke ọma. Ha ga-enwe ike ịdị ndụ ebighị ebi n’enweghị nsogbu ọ bụla, ha agaghịkwa na-adọlị ndọlị. Obi agaghịkwa na-ajọ ha njọ. (Aịzaya 65:21, 22) Baịbụl kwuru na ọ bụ ụdị ndụ a bụ “ndụ n’ezie.”—1 Timoti 6:19.

“Ha ga-ewu ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akọkwa ubi vaịn, rie mkpụrụ ha. Ha agaghị ewu ụlọ, onye ọzọ ebichie ya; ha agaghị akụ mkpụrụ, onye ọzọ erie ya. N’ihi na dị ka osisi si anọ ogologo ndụ, otú ahụ ka ndị m ga-anọ ogologo ndụ; ndị m họọrọ ga-eji ihe aka ha rụpụtara mee ihe n’uju.”—Aịzaya 65:21, 22.