Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU TETA! A

Ndụ Gị Ọ̀ Dị Otú Ị Chọrọ Ka Ọ Dịrị?

Ndụ Gị Ọ̀ Dị Otú Ị Chọrọ Ka Ọ Dịrị?

MGBE ị ka dị obere, olee ihe ndị i kwuru na ị ga-eme ma i too? O nwere ike ịbụ na i kpebiri na ị ga-alụ di ma ọ bụ na ị ga-alụ nwaanyị, na ị ga-amụ aka ọrụ, ma ọ bụkwanụ na ị ga-aga mahadum. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na ihe anaghị agacha otú e si chee ya. Ụfọdụ ihe ndị a na-atụghị anya ha nwere ike ime ka ndụ mmadụ gbanwee. Ọ bụ ụdị ihe ndị ahụ mere Anja, Delina, na Gregory.

  • Anja bụ onye Jamanị. Mgbe ọ dị iri afọ abụọ na otu, a chọpụtara na o bu kansa. Ọrịa a emeekwala ka ọ na-esiri ya ike ịpụta apụta.

  • Otu onye Amerịka aha ya bụ Delina na-arịa ọrịa na-eme ka ahụ́ na-akụjisi ya. Ọ nọkwa n’elu ya na-elekọta ụmụnne ya atọ na-arịa ọrịa.

  • Gregory bụ onye Kanada. Ihe bụ́ nsogbu ya bụ na obi na-ekoro ya n’elu mgbe niile.

N’agbanyeghị otú ihe si dịrị Anja, Delina, na Gregory, e nwere ihe ụfọdụ na-enyere ha aka. Gịnị bụ ihe ndị ahụ?

Baịbụl kwuru, sị: “Ì nwewo obi ịda mbà n’ụbọchị ahụhụ? Ike gị ga-adị ntakịrị.” (Ilu 24:10) Otu eziokwu doro anya bụ na otú mmadụ si were ụwa ya nwere ike ime ka ihe dịtụrụ ya mfe. Ọ bụrụ na mmadụ ekwe ka obi na-ajọ ya njọ, ọ gaghị edili nsogbu bịaara ya. Ma, ọ bụrụ na mmadụ etinyere ụwa ya obiọma, nsogbu ya agaghị anyịgbu ya.

Ka anyị hụ otú ihe si na-agara Anja, Delina, na Gregory n’agbanyeghị nsogbu ndị ha nwere.