IHE NKE 5
Uru Onye Toro Eto Ịkụziri Nwatakịrị Ihe Bara
OLEE NDỊ TOROLA ETO GA-AKỤZIRI NWATAKỊRỊ IHE?
Ụmụaka kwesịrị inwe ndị toro eto ga na-akụziri ha ihe ma na-eduzi ha. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, ọ bụ gịnwa ga-akacha arụ ọrụ a nke ọma. N’eziokwu, ọ bụ ọrụ dịịrị gị. Ma, ndị ọzọ torola eto nwekwara ike inye aka kụziere ụmụaka gị ihe.
GỊNỊ MERE ONYE TOROLA ETO ỊKỤZIRI NWATAKỊRỊ IHE JI DỊ MKPA?
N’ọtụtụ obodo, ụmụaka na ndị torola eto anaghị emekọcha ihe. Dị ka ihe atụ:
-
Ụmụaka na-anọ ọtụtụ awa n’ụlọ akwụkwọ bụ́ ebe ndị nkụzi na ndị ọzọ torola eto dị ole na ole.
-
Ụfọdụ ụmụaka lọta akwụkwọ, o nweghị onye ha na-ahụ n’ụlọ n’ihi na nne ha na nna ha agaala ọrụ.
-
Otu nchọpụta e mere gosiri na n’Amerịka, ụmụaka ndị nọ n’agbata afọ asatọ na afọ iri na abụọ na-eji ihe dị ka awa isii ele tiivi, ege egwú ma ọ bụ egwu egwuregwu vidio kwa ụbọchị. *
Otu akwụkwọ aha ya bụ Hold On to Your Kids kwuru, sị: “Ụmụaka na-ahapụ ndị nne na nna ha, ndị nkụzi ha na ndị ọzọ torola eto na-agakwuru ndị ọgbọ ha ka ha nye ha ndụmọdụ, kụziere ha ihe ma duzie ha.”
OTÚ Ị GA-ESI KỤZIERE ỤMỤ GỊ IHE
Gị na ụmụ gị na-anọrị.
IHE BAỊBỤL KWURU: “Zụlite nwata dị ka ụzọ kwesịrị ya si dị; ọbụna mgbe o mere okenye, ọ gaghị ahapụ ya.”—Ilu 22:6.
Ụmụaka na-achọkarị ka ndị mụrụ ha na-eduzi ha. Ụfọdụ ndị ọkachamara kwụdịrị na ụmụaka ndị rurula afọ iri na atọ na-achọkarị ige ndị mụrụ ha ntị karịa ndị ọgbọ ha. Otu nwoke aha ya bụ Dr. Laurence Steinberg kwuru n’akwụkwọ bụ́ You and Your Adolescent, sị: “Ọ bụ ihe ndị nne na nna na-eme ka ụmụ ha na-akacha eṅomi mgbe ha dị afọ iri na ụma na mgbe ha ruwere afọ iri abụọ.” O kwukwara, sị: “Ndị na-eto eto na-achọkarị ịma ihe ndị nne na nna ha na-eche, ha na-egekwa ihe ha na-ekwu, ọ bụ eziokwu na ha anaghị ekwetacha ihe niile a na-agwa ha.”
Ebe ọ bụ na ụmụ gị ga-enwe mmasị ka ị na-eduzi ha, gbalịa na-eduzi ha. Gị na ha na-anọ, na-akọrọ ha otú i si ele ihe anya, ihe ndị na-amasị gị, na ihe ndị merela ná ndụ gị.
Mee ka ha nwee onye ha ga na-eṅomi.
IHE BAỊBỤL KWURU: “Onye ya na ndị maara ihe na-eje ije ga-ama ihe.”—Ilu 13:20.
Ò nwere onye torola eto ị maara ị ga-achọ ka nwa gị na-eṅomi? Lee ma ị̀ ga-agwa onye ahụ ka ọ bịa na-enyere nwa gị aka. Ma, ọ pụtaghị na ị ga-ahapụrụ ya nwa gị ka ọ na-azụ. Ndụmọdụ onye torola eto ị tụkwasịrị obi na-enye nwa gị na nke gịnwa na-enye ya nwere ike inyere ya aka ịna-emekwu nke ọma. Baịbụl kwuru na Timoti na Pọl onyeozi bụ enyi, ọbụbụenyi ha baara Timoti ọtụtụ uru, n’agbanyeghị na ọ ghọọla dimkpa. Ọ bakwaara Pọl uru.—Ndị Filipaị 2:20, 22.
N’ime otu narị afọ gara aga, ọtụtụ ezinụlọ ebikọghịzi ọnụ n’ihi na ndị ikwu ha bicha ná mba ọzọ. Ọ bụrụ na ọ bụ otú ahụ ka ọ dị gịnwa, mee ka ụmụ gị nwee onye torola eto na-akpa ụdị àgwà ndị ị ga-achọ ka ha na-akpa ka ha nwee ike ịmụta àgwà ndị ahụ.
^ par. 9 Nchọpụta ahụ e mere gosikwara na ụmụaka ndị nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu na-eji ihe dị ka awa itoolu ele tiivi, ege egwú ma ọ bụ egwu egwuregwu vidio kwa ụbọchị. Oge ha na ụmụaka ndị nke ọzọ ji aga n’Ịntanet mgbe ha nọ n’ụlọ akwụkwọ na oge ha nọ ebe ahụ na-eme ihe omume esoghị n’awa ndị a e kwuru.