Ihe Ị Ga-eme Ka Ịmụ Baịbụl Na-abakwuru Gị Uru ma Na-atọkwu Gị Ụtọ
JỌSHỤA ga-eduru ndị Izrel baa n’Ala Nkwa ahụ. Ọ ga-esiri ya ezigbo ike. Ma, Jehova mesiri ya obi ike ma gwa ya, sị: ‘Nwee obi ike, dịkwa ike. Na-erube isi n’Iwu m. Na-agụ ya ehihie na abalị, ka i wee lezie anya mee ihe niile e dere na ya. Mgbe ahụ, ị ga-eme ka ụzọ gị gaa nke ọma, ị ga-ejikwa amamihe mee ihe.’—Jọsh. 1:7, 8.
Ihe nwekwara ike isiri anyị ike ‘n’oge a dị oké egwu, nke tara akpụ.’ (2 Tim. 3:1) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ụzọ anyị na-aga nke ọma otú ahụ o si gaara Jọshụa, anyị kwesịrị ịna-eme ihe Jehova gwara ya. Anyị kwesịrị ịna-agụ Baịbụl kwa ụbọchị, ma jiri ihe ndị anyị mụtara na-eme mkpebi dị mma.
Ma, ụfọdụ n’ime anyị nwere ike anyị amaghị otú e si amụ ihe, ma ọ bụkwanụ na ịmụ ihe anaghị atọ anyị ụtọ. Ma, ịmụ Baịbụl dị ezigbo mkpa. Ka ị na-agụ igbe isiokwu ya bụ “ Gbalịa Mee Ihe Ndị A,” ị ga-ahụ ihe ndị ga-enyere gị aka ka ịmụ ihe bakwuoro gị uru ma na-atọkwu gị ụtọ.
Otu ọbụ abụ kwuru, sị: “Mee ka m jee ije n’ụzọ nke ihe i nyere n’iwu, n’ihi na ọ na-atọ m ụtọ.” (Ọma 119:35) Ịmụ Okwu Chineke nwekwara ike ịna-atọ gị ezigbo ụtọ. Ị ga-achọpụta ihe ndị magburu onwe ha ka ị na-amụ ya.
Ọ bụ eziokwu na o nweghị mba ị ga-edu otú ahụ Jọshụa mere, ma e nwekwara nsogbu ndị gị na ha na-alụ. N’ihi ya, na-amụ Okwu Chineke ma na-eme ihe o kwuru otú ahụ Jọshụa mere. I mee otú ahụ, ụzọ gị ga-aga nke ọma, ị ga-ejikwa amamihe na-eme ihe.