Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-enwere “Ụdị Mmadụ Niile” Ọmịiko

Na-enwere “Ụdị Mmadụ Niile” Ọmịiko

MGBE Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya otú e si ezi ozi ọma, ọ gwara ha na ọ bụghị mgbe niile ka ndị mmadụ ga-ege ha ntị. (Luk 10:3, 5, 6) Anyị gaa ozi ọma, anyị nwere ike ịhụ ndị ga-akparị anyị ma ọ bụdị chọọ ịkụ anyị ihe. O doro anya na ihe ndị a ha na-eme nwere ike ime ka o siere anyị ike inwere ha ọmịiko.

Onye na-enwere ndị ọzọ ọmịiko na-ahụ nsogbu ha nọ na ya, metere ha ebere, ma chọọ inyere ha aka. Ọ bụrụ na anyị anaghị enwere ndị anyị na-ezi ozi ọma ọmịiko, ọ ga-eme ka anyị ghara ịna-anụ ọkụ n’obi, meekwa ka anyị ghara ịna-ezi ha ozi ọma nke ọma. Ma, ọ bụrụ na anyị ana-enwere ha ọmịiko, ọ ga-eme ka anyị na-anụkwu ọkụ n’obi n’ozi ọma. Ọ dị ka ebe anyị na-etinye nkụ n’ọkụ ka ọ na-enwusi ike.—1 Tesa. 5:19.

Olee otú anyị ga-esi na-enwere ndị mmadụ ọmịiko, ọ bụrụgodị na ọ na-esiri anyị ike ime otú ahụ? Ka anyị tụlee banyere ndị anyị nwere ike iṅomi. Ha bụ Jehova, Jizọs, na Pọl onyeozi.

NA-EṄOMI ỌMỊIKO JEHOVA

Kemgbe ọtụtụ puku afọ, ndị mmadụ na-emebi aha Jehova. Ma, ọ ka na-enwe “obiọma n’ebe ndị na-enweghị ekele na ndị ọjọọ nọ.” (Luk 6:35) Otú o si egosi obiọma ya bụ ịna-enwere mmadụ niile ndidi. Jehova chọrọ ka a zọpụta “ụdị mmadụ niile.” (1 Tim. 2:3, 4) Ọ bụ eziokwu na Chineke kpọrọ ihe ọjọọ asị, o ji ndị mmadụ kpọrọ ihe, ọ chọghịkwa ka onye ọ bụla nwụọ.—2 Pita 3:9.

Jehova ma na Setan bụ aka ochie n’ime ka ndị mmadụ kwere ihe na-abụghị eziokwu. (2 Kọr. 4:3, 4) A kụzierela ọtụtụ ndị ihe ndị na-abụghị eziokwu banyere Chineke kemgbe ha dị obere. Ọ bụ ya mere o ji esiri ha ike ikweta ihe bụ́ eziokwu. Ma, Jehova dị njikere inyere ha aka. Olee otú anyị si mara?

Chegodị otú obi dị Jehova banyere ndị Ninive. N’agbanyeghị na ha na-eme ihe ike, Jehova gwara Jona, sị: “Ọ̀ bụ na mụ onwe m ekwesịghị imere Ninive bụ́ obodo ukwu ebere, bụ́ ebe e nwere ihe karịrị otu narị puku mmadụ na puku iri abụọ, bụ́ ndị na-amaghị ma ọlị ihe dị iche n’aka nri ha na aka ekpe ha.” (Jona 4:11) Jehova lere ndị Ninive anya ka ndị na-amaghị ya. N’ihi ya, o meteere ha ebere ma ziga Jona ka ọ gaa dọọ ha aka ná ntị.

Anyị ji ndị mmadụ kpọrọ ihe otú ahụ Jehova ji ha kpọrọ. Anyị nwere ike iṅomi Jehova. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịdị njikere inyere onye ọ bụla chọrọ ige anyị ntị aka, ọ bụrụgodị na o yie ka ha agaghị anabata eziokwu.

NA-EṄOMI ỌMỊIKO JIZỌS

Jizọs ṅomiri Nna ya. O nweere ndị na-amaghị Jehova ọmịiko. Baịbụl kwuru, sị: “Mgbe ọ hụrụ ìgwè mmadụ ahụ, o nwere ọmịiko n’ebe ha nọ, n’ihi na a gbara ha akpụkpọ, na-achụsakwa ha, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.” (Mat. 9:36) Jizọs ghọtara nsogbu ha. Ọ ghọtakwara na ndị ndú okpukpe akụzierela ndị bịara ige ya ntị ihe ndị na-abụghị eziokwu, ma na-emekpọ ha ọnụ. Ọ bụ eziokwu na Jizọs ma na ọtụtụ n’ime ha agaghị abụ ndị na-eso ụzọ ya n’ihi otu ihe ma ọ bụ ihe ọzọ, ma ọ kụziiri ha “ọtụtụ ihe.”—Mak 4:1-9.

Iwe ewela gị ma onye ị chọrọ izi ozi ọma na nke mbụ ya achọghị ige gị ntị

Ọnọdụ mmadụ na-agbanwe, otú ahụ ka mmadụ nwekwara ike ịgbanwe obi ya gee ntị n’ozi ọma

Ọ bụrụ na ndị mmadụ egeghị anyị ntị mgbe anyị chọrọ izi ha ozi ọma, anyị kwesịrị ịgba mbọ ghọta ihe kpatara ya. O nwere ike ịbụ na e nweghị ihe ha ji Baịbụl na Ndị Kraịst kpọrọ n’ihi àgwà ndị sịrị na ha bụ Ndị Kraịst na-akpa. O nwekwara ike ịbụ na ndị ọzọ nụrụ na anyị anaghị akụzi eziokwu. E nwekwara ndị nke ụjọ na-atụ ige anyị ntị n’ihi na ndị obodo ha ma ọ bụ ndị ezinụlọ ha ga na-achị ha ọchị.

Ụfọdụ ndị anyị na-ahụ n’ozi ọma nwere ike ha agaghị ege anyị ntị n’ihi ihe ndị merela ha ná ndụ, bụ́ ndị merela ka obi na-ajọ ha njọ. Otu onye ozi ala ọzọ aha ya bụ Kim kwuru, sị: “N’otu n’ime ebe ndị anyị na-ezi ozi ọma, agha kpara ndị mmadụ aka ọjọọ, ya emee ka ihe niile ha nwere funahụ ha. Ha enweghị olileanya na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu. Ike ụwa gwụrụ ha, e nweghịkwa onye ha tụkwasịrị obi. N’ebe a, anyị na-ahụkarị ndị na-achọghị iji anya ahụ Ndịàmà Jehova. E nwere otu ụbọchị onye m chọrọ izi ozi ọma kụrụ m ihe ma chọọ iji mma gbuo m.”

Olee otú Kim si nọgide na-enwere ndị mmadụ ọmịiko, n’agbanyeghị otú a ha si na-emeso ya? O kwuru, sị: “Ndị mmadụ kparịa m, m na-echeta ihe Ilu 19:11 kwuru. Ọ sịrị: ‘Nghọta mmadụ nwere na-eme ka ọ ghara iwe iwe ọsọ ọsọ.’ M cheta ihe ndị merela ndị bi n’ebe anyị na-ezi ozi ọma, ọ na-enyere m aka ịna-enwere ha ọmịiko. Ọ bụkwanụghị mmadụ niile na-akpaso anyị àgwà ọjọọ. E nwekwara ndị ezigbo mmadụ anyị na-agara nletaghachi.”

Anyị nwere ike jụọ onwe anyị , sị: ‘A sị na m nọ n’ọnọdụ ndị a anyị na-ezi ozi ọma nọ na ya, olee ihe m gaara eme ma Ndịàmà Jehova bịa izi m ozi ọma?’ Dị ka ihe atụ, ọ bụrụkwanụ na a gwara anyị ihe na-abụghị eziokwu banyere Ndịàmà Jehova ugboro ugboro? O nwekwara ike anyị ga-akparị ha ma bụrụ ndị e kwesịrị inwere ọmịiko. Ọ bụrụ na anyị echeta ihe Jizọs kwuru ka anyị na-emeso ndị ọzọ ihe otú anyị chọrọ ka e si na-emeso anyị ihe, ọ ga-eme ka anyị na-enwere ndị mmadụ ọmịiko, ọ bụrụgodị na ọ na-esiri anyị ike ime otú ahụ.—Mat. 7:12.

NA-EṄOMI ỌMỊIKO PỌL

Pọl onyeozi nweere ndị mmadụ ọmịiko, ma ndị na-emegide ya n’ihi ozi ọma. Gịnị mere o ji mee otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na o chetara ihe ndị o mere n’oge gara aga. O kwuru, sị: “N’oge gara aga, abụ m onye nkwulu na onye mkpagbu na onye na-akparị mmadụ. Otú ọ dị, e meere m ebere, n’ihi na amaghị m ihe mgbe ahụ, emekwara m ya n’ihi enweghị okwukwe.” (1 Tim. 1:13) Ọ ma na Jehova na Jizọs meere ya ezigbo ebere. O nwere ike ịbụ na ọ ghọtara otú ọ dị ndị ahụ na-emegide ya n’ihi na o nwere mgbe o mere ka ha.

Mgbe ụfọdụ, Pọl hụrụ ndị kwenyesiri ike n’ozizi ụgha. Olee ihe o mere? Ọrụ Ndịozi 17:16 kwuru na mgbe ọ nọ n’Atens, na “o wutere ya na mmụọ ya mgbe ọ hụrụ na obodo ahụ jupụtara n’arụsị.” Ma, o ji ihe ahụ wutere ya zie ndị obodo ahụ ozi ọma. (Ọrụ 17:22, 23) Mgbe ọ hụrụ ụdị mmadụ dị iche iche, ọ gbanwere otú o si ezi ozi ọma ‘ka o wee si n’ụzọ ọ bụla zọpụta ụfọdụ ndị.’—1 Kọr. 9:20-23.

Ọ bụrụ na anyị ezie ndị na-anaghị eji anya ahụ anyị ma ọ bụ ndị kweere n’ozizi ụgha ozi ọma, anyị nwere ike mee ihe Pọl mere. Anyị nwere ike iji ihe anyị ma gbasara ha mee ka ha mata “ozi ọma nke ihe ka mma.” (Aịza. 52:7) Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Dorothy kwuru, sị: “N’ebe anyị na-ezi ozi ọma, a kụzierela ọtụtụ ndị na Chineke bụ onye obi ọjọọ, na onye na-akatọ ndị mmadụ. Ana m aja ụdị ndị ahụ mma maka otú ha si kwenyesie ike na Chineke. M na-agwazi ha ihe Baịbụl kwuru banyere otú Jehova si hụ anyị n’anya na ihe ndị ọ ga-emere anyị n’ọdịnihu.”

“JIRI IHE ỌMA NA-EMERI IHE ỌJỌỌ”

Ka ‘oge ikpeazụ’ a na-eru ọgwụgwụ, anyị na-atụ anya na àgwà ụfọdụ ndị anyị na-ezi ozi ọma na-akpa “ga na-ajọwanye njọ.” (2 Tim. 3:1, 13) Ma, anyị ekwesịghị ikwe ka o mee ka anyị ghara ịna-enwere ha ọmịiko ma ọ bụ mee ka anyị kwụsị ịna-enwe ọṅụ. Jehova ga-enye anyị ike anyị ga-eji “jiri ihe ọma na-emeri ihe ọjọọ.” (Rom 12:21) Otu nwanna nwaanyị bụ́ ọsụ ụzọ aha ya bụ Jessica kwuru, sị: “M na-ahụkarị ndị dị mpako, na ndị na-enweghị ihe ha ji anyị na ozi ọma anyị na-ezi kpọrọ. Ụdị ihe a nwere ike iwe mmadụ iwe. Ọ bụrụ na m na-ezi mmadụ ozi ọma ya enwee ihe o kwuru, m na-ekpe ekpere n’obi m ma rịọ Jehova ka o mee ka m lee onye ahụ anya otú o si ele ya anya. Nke a na-eme ka m chee otú m ga-esi nyere onye ahụ aka kama ịna-ewe iwe.”

Anyị ga na-achọ ndị niile chọrọ ịmụta eziokwu ka ha dịrị ndụ ebighị ebi

Ụfọdụ ga-emecha gee anyị ntị ma anyị nọgide na-achọ inyere ha aka ka ha mụta eziokwu

Anyị kwesịkwara ịgba mbọ na-agba ụmụnna anyị na ha na-arụ n’ozi ọma ume. Jessica kwuru, sị: “Ọ bụrụ na a kparịa onye mụ na ya na-arụ n’ozi ọma, m na-agba mbọ ka m ghara ikwu gbasara ya. Kama, m na-ekwu ihe ọzọ, dị ka uru ozi anyị na-aba n’agbanyeghị na ụfọdụ na-akparị anyị.”

Jehova ma nsogbu ndị anyị na-enwe n’ozi ọma. Ma, obi na-atọ ya ụtọ ma anyị na-emetere ndị ọzọ ebere ka ya. (Luk 6:36) Ma nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova agaghị emegide ebere ruo mgbe ebighị ebi. Obi siri anyị ike na ọ ma oge kwesịrị ekwesị ọ ga-ebibi ụwa ọjọọ a. Tupu mgbe ahụ, ka anyị jiri ozi ọma kpọrọkwuo ihe n’ihi na oge agwụla agwụ. (2 Tim. 4:2) N’ihi ya, ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ezi “ụdị mmadụ niile” ozi ọma ma na-enwere ha ọmịiko.